Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Chineke Ọ̀ Nọ Ebe Niile?

Chineke Ọ̀ Nọ Ebe Niile?

Echiche Baịbụl

Chineke Ọ̀ Nọ Ebe Niile?

ỌTỤTỤ ndị na-asị na Chineke nọ ebe niile. Sọlọmọn, bụ́ Eze ma ihe, kpekuru Jehova ekpere, sị: “Gị onwe gị nọrọ n’eluigwe, bụ́ ebe obibi gị guzosiri ike, nụrụ.” (1 Ndị Eze 8:30, 39) Ihe a e dere na Baịbụl gosiri na e nwere ebe Jehova Chineke bi. Sọlọmọn sị na ebe ahụ bụ ‘eluigwe.’ Ma, gịnị ka ihe a Sọlọmọn kwuru pụtara?

Mgbe ụfọdụ, e kwuo banyere ‘eluigwe’ na Baịbụl, ebe a na-ekwu bụ mbara igwe. (Jenesis 2:1, 4) Ma, ebe ọ bụ Chineke kere ihe niile, ọ ga-abụrịrị na e nwere ebe o bi tupu ya ekewe mbara igwe anyị na-ahụ anya. N’ihi ya, ebe Chineke bi agaghị abụ ebe anya anyị na-ahụ. Ya mere, mgbe ọ bụla Baịbụl kwuru na Jehova Chineke bi n’eluigwe, ihe ọ na-ekwu bụ ebe ndị mmadụ na-anaghị ahụ, ọ bụghị mbara igwe nkịtị.

Ọhụụ nke Gbara Jọn Gharịị

N’ọhụụ Jehova gosiri Jọn onyeozi, e mere ka anyị ghọtatụ otú ebe Jehova bi dị. N’ọhụụ ahụ, Jọn hụrụ ọnụ ụzọ mepere emepe n’eluigwe, ọ nụkwara olu gwara ya, sị: “Gbagote n’ebe a.”—Mkpughe 4:1.

Ihe ọzọ Jọn hụrụ n’ọhụụ ahụ gbara ya gharịị. Na nke ugbu a, ọ hụrụ Jehova Chineke. Legodị ụfọdụ ihe Jọn hụrụ: “Otu ocheeze dị n’eluigwe . . . Onye ahụ nke nọ ọdụ na-egbuke dị ka nkume jaspa na nkume dị oké ọnụ ahịa nke na-acha ọbara ọbara, eke na egwurugwu nke na-egbuke dị ka emerad gbakwara ocheeze ahụ gburugburu. . . . Àmụ̀mà na olu na égbè eluigwe si n’ocheeze ahụ na-apụta . . . E nwekwara ihe a pụrụ ịkpọ oké osimiri nke yiri enyo, nke dị ka kristal, n’ihu ocheeze ahụ.”—Mkpughe 4:2-6.

Amaokwu ndị a gosiri na Jehova dị ebube, gosikwa na ihe ndị gbara ocheeze ya gburugburu mara mma dị egwu. Eke na egwurugwu Jọn hụrụ n’ọhụụ na-egosi na ebe ahụ dị nnọọ jụụ. Àmụ̀mà, olu na égbè eluigwe ahụ na-egosikwa na Chineke nwere ike dị egwu. Oké osimiri ahụ nke yiri enyo na-egosi na ndị niile ha na Chineke bi n’ebe ahụ bụ ndị ezi omume.

Ọ bụ eziokwu na ihe ndị e kwuru ná Mkpughe 4:2-6 nwechara ihe ha pụtara, ha mere ka anyị ghọta otú ebe Chineke bi dị. Jehova na-eme ka ihe niile na-aga n’usoro n’eluigwe, e nweghịkwa ọgba aghara dị ebe ahụ.

Ọ̀ Bụ Eziokwu na Chineke Nọ Ebe Niile?

Ebe ọ bụ na e nwere ebe Jehova bi, ọ pụtara na ọ nọghị ebe niile. Ma, olee otú o si ama ihe na-eme ebe niile? (2 Ihe E Mere 6:39) Otu n’ime ihe ndị o ji ama ihe na-eme ebe niile bụ mmụọ nsọ ya, ma ọ bụ ike ya nke nọ n’ọrụ. Otu ọbụ abụ dere, sị: “Olee ebe m pụrụ ịga wee gbanahụ mmụọ gị, oleekwa ebe m pụrụ ịgbaga wee pụọ n’ihu gị? Ọ bụrụ na mụ agbagoo n’eluigwe, ị ga-anọ n’ebe ahụ; ọ bụrụkwa na mụ agbasaa ihe ndina m na Shiol, lee! ị ga-anọ n’ebe ahụ.”—Abụ Ọma 139:7-10.

Were ụdị ike anyanwụ na-akpa mara otú mmụọ nsọ Chineke si akpa ike. Anyanwụ kwụ otu ebe, ma, ọ na-enye ọtụtụ ebe n’ụwa ìhè. N’otu aka ahụ, Jehova Chineke bi otu ebe, ma, ọ na-emeli ihe ọ bụla ọ chọrọ ime, ebe ọ sọkwara ya bụrụ. Ihe ọzọ bụ na Jehova nwere ike iji mmụọ nsọ ya mara ihe na-eme ebe ọ bụla, n’agbanyeghị oge ọ na-eme. Ọ bụ ya mere 2 Ihe E Mere 16:9 ji kwuo, sị: “Anya Jehova na-ahụzu ụwa dum iji gosi ike ya maka ndị obi ha zuru ezu n’ebe ọ nọ.”

Ndị mmụọ ozi nọkwa n’okpuru Chineke. Baịbụl gosiri na e nwere ọtụtụ narị nde ndị mmụọ ozi. Ha nwedịrị ike iru ọtụtụ ijeri ma ọ bụ karịa. * (Daniel 7:10) E nwere ọtụtụ ebe Baịbụl gosiri na Chineke dunyere ndị mmụọ ozi ya ka ha bịa zie ụmụ mmadụ ozi n’ụwa. Ha gachaa, ha alaghachi gwa Chineke ihe ha gatara. Were ihe mere oge Ebreham nọ ndụ dị ka ihe atụ. Ọ bụ ndị mmụọ ozi ka e dunyere ka ha gaa hụ ákwá mkpesa a na-akwa banyere Sọdọm na Gọmọra. Chineke kpebiri ibibi obodo abụọ ahụ, ikekwe mgbe ndị mmụọ ozi ahụ gwachara ya ihe ha gatara.—Jenesis 18:20, 21, 33; 19:1, 13.

N’ihi ya, ihe Baịbụl na-akụziri anyị bụ na Jehova Chineke anọghị ebe niile. Ọ na-eji mmụọ nsọ ya na ndị mmụọ ozi ya ama ihe na-eme n’ebe niile.

O doro anya na Baịbụl ga-emeli ka anyị mata Onye kere anyị nke ọma. Na Baịbụl, anyị mụtara na Chineke bi n’eluigwe, o bighị na mbara igwe nkịtị. Ya na ọtụtụ iri puku ndị mmụọ ozi dị ike bi n’ebe ahụ. Anyị mụtakwara na ebe ahụ dị jụụ, mụtakwa na Chineke nwere ike dị egwu nakwa na ndị bi n’eluigwe bụ ndị ezi omume. Baịbụl mere ka obi sie anyị ike na mgbe oge Chineke ruru, ụmụ mmadụ bi n’ụwa ga-enwe ụdị udo ahụ e nwere n’eluigwe.—Matiu 6:10.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 13 Mkpughe 5:11 kwuru na “iri puku kwuru iri puku” ndị mmụọ ozi gbara ocheeze Chineke gburugburu. E jiri iri puku mụbaa iri puku, ihe ọ ga-enye bụ otu narị nde. Ma, ebe ọ bụ na ihe amaokwu a kwuru bụ iri puku kwuru iri puku, ọ na-egosi na ọ ga-abụ na e nwere ọtụtụ ijeri ndị mmụọ ozi.

Ì CHETỤLA NKE A N’ECHICHE?

● Chineke ọ̀ nọ ebe niile?—1 Ndị Eze 8:30, 39.

● È nwere ebe mmụọ nsọ Chineke na-anaghị akparu ike? —Abụ Ọma 139:7-10.

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 25]

Anyanwụ kwụ otu ebe, ma, ọ na-enye ọtụtụ ebe n’ụwa ìhè. N’otu aka ahụ, Jehova Chineke bi otu ebe, ma a na-ahụ ike mmụọ nsọ ya na-akpa n’ebe ọ bụla ọ chọrọ iji ya arụ ọrụ