Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ihe Mere Ụfọdụ Ndị Ji Eyi Ọha Egwu

Ihe Mere Ụfọdụ Ndị Ji Eyi Ọha Egwu

Ihe Mere Ụfọdụ Ndị Ji Eyi Ọha Egwu

MGBE a jụrụ otu nwoke bi na Spen, aha ya bụ Joseba, ihe mere o ji banye n’òtù na-agba ndị ọchịchị mgba okpuru, o kwuru, sị: “Mmegbu a na-emegbu anyị na otú e si na-ekpe anyị ikpe na-ezighị ezi enweghị atụ. Na Bilbaw ebe anyị bibu, bụ́kwanụ nnukwu obodo, ndị uwe ojii na-abata tie ndị mmadụ ihe ma kpụrụ ha pụọ.”

Joseba kwukwara, sị: “E jidere m n’otu ụtụtụ n’ihi na m kwuru na ihe ndị uwe ojii na-eme ndị mmadụ adịghị mma. Ezigbote iwe were m nke na m chọwara ihe m ga-eme, ọ sọkwa ya ya bụrụ ihe ike, iji kwụsị ihe ahụ ndị uwe ojii na-eme ndị mmadụ.”

Ha Na-abọ Ọbọ n’Ihi Mmegbu A Na-emegbu Ha

N’agbanyeghị na Baịbụl anaghị akwado ime ihe ike, o kwuru na “mmegbu pụrụ ime ka onye maara ihe na-eme ara ara.” (Ekliziastis 7:7) Iwe na-eju ọtụtụ ndị obi ma ọ bụrụ na a na-echi ha ọnụ n’ala n’ihi agbụrụ ha si, okpukpe ha na-ekpe, ma ọ bụkwanụ mba ha si.

Dị ka ihe atụ, Hafeni, bụ́ onye anyị kwuru okwu ya n’isiokwu bu nke a ụzọ, kwuru, sị: “Ndị ọcha naara anyị ala anyị n’ike. Ebe ọ bụ na ụmụ anụmanụ na-alụso ibe ha ọgụ ma ibe ha kparute ebe ha ji mere ebe ha, anyị weere ya na ọ bụrụ na anyị alụọ ọgụ maka ala anyị nakwa maka mmegbu a na-emegbu anyị, anyị mere ihe anyị kwesịrị ime.” Otu onye nke na-agba ọchịchị mgba okpuru, bụ́ onye ji bọmbụ gbuo ma onwe ya ma ndị ọzọ, kwuru mgbe ọ dị ndụ, sị: “Ọgụ a agaghị ebi ruo mgbe unu kwụsịrị ịtụ ndị ala anyị bọmbụ, ịgba ha gas, ịtụ ha mkpọrọ, na ịta ha ahụhụ.”

Ha Na-eme Ya n’Ihi Okpukpe Ha

Ọ bụ eziokwu na ihe na-eme ndị mmadụ ji agba ọchịchị mgba okpuru bụ otú ihe si na-aga n’obodo, ma ọtụtụ mgbe taa, ha na-eme ya n’ihi okpukpe ha. E nwere ozi ọnụ na-ekwuchitere otu òtù na-agba ọchịchị mgba okpuru zigaara otu onye ọchịchị. N’ozi ahụ, o dere, sị: “Ihe mere anyị ji na-eme ihe anyị na-eme abụghị na isi adịghị anyị mma, ọ bụghịkwa na anyị chọrọ ịnaghara ọchịchị. Kama anyị na-eme ya n’ihi na anyị na-ejere Chineke ozi.”

E nwere akwụkwọ Daniel Benjamin na Steven Simon dere gbasara otú okpukpe ndị na-agba ọchịchị mgba okpuru si eme ka ha na-eme ihe ha na-eme. N’akwụkwọ ahụ, ha kwuru, sị: “Ọtụtụ ndị okpukpe, ma ndị nọ n’okpukpe ndị a na-anụ aha ha ma ndị nke ka malitere ọhụrụ, kweere na ime ihe ike bụ otu n’ime ụzọ ha si efe Chineke.” E nwekwara onye ọzọ lebara anya n’otú ndị na-eyi ọha egwu n’ebe dị iche iche n’ụwa si ele ihe ha na-eme anya. Mgbe ọ na-ede ihe ọ chọpụtara, ọ sịrị: “Ndị na-eyi ọha egwu kweere na ọ bụ Chineke dunyere ha ime ihe ha na-eme, nakwa na o nweghị otú ha ga-esi ghara ime ya.”

Ma, ihe ọtụtụ ndị òtù okpukpe ndị a na-agba ọchịchị mgba okpuru na-eme abụghị ihe okpukpe ha na-akụziri ha, ọ bụghịkwa ihe okpukpe ha kweere.

Obi Adịghị Ha Mma

Mgbe ndị uwe ojii jidere Joseba, bụ́ onye anyị kwuru okwu ya na mbụ, ha rụsara ya ajọ arụrụala. Joseba kwuru, sị: “Arụrụala ha rụsara m mere ka m kwetasie ike na asị m kpọrọ ha dị mma. Ọ bụrụgodị na mụ anwụọ ebe m na-agba mbọ ịkwụsị arụrụala a ha na-arụ, nsogbu adịghị ya.”

Ọtụtụ mgbe, ihe ọzọ na-eme ka ndị na-eme ihe ike na-eche ụdị echiche a bụ ihe ndị òtù ha na-akụziri ha. Hafeni kwuru, sị: “Mgbe anyị nọ n’ogige ndị gbara ọsọ ndụ, a na-akpọkọta anyị gwa anyị na ndị ọcha nwere ọtụtụ ụzọ ha na-echepụta ha ga-esi na-emekpọ ndị isi ojii ọnụ.” Gịnị ka ihe ahụ a na-agwa ha kụnyere ha n’obi?

Hafeni kwuru, sị: “M malitere ịkpọkwu ndị ọcha asị. O nweghị onye n’ime ha m tụkwasịrị obi. Ka oge na-aga, ihe ndị a niile ekweghịzi m odidi. Nke a mere ka m bido iche na e nwerịrị ihe ọgbọ anyị kwesịrị ime iji kwụsị arụrụala a.”

O nwere ike ịtụ gị n’anya ma a gwa gị na Joseba na Hafeni mechara kwụsị ịkpọ ndị ọcha asị. Gịnị mere ha ji kwụsị ịkpọ ha asị? Isiokwu na-esonụ ga-aza ajụjụ a.

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 6]

“Arụrụala ha rụsara m mere ka m kwetasie ike na asị m kpọrọ ha dị mma. Ọ bụrụgodị na mụ anwụọ ebe m na-agba mbọ ịkwụsị arụrụala a ha na-arụ, nsogbu adịghị ya.”—Joseba