Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Anyịrị M Ndị Nazi

Anyịrị M Ndị Nazi

Anyịrị M Ndị Nazi

Dị ka Hermine Liska si kọọ

MGBE m bụ nwata, ana m enwe ezigbo obi ụtọ. Ma, akwụsịrị m inwe obi ụtọ mgbe Adolf Hitler na ndị Nazi malitere ịchị mba anyị, bụ́ Ọstria, n’afọ 1938. Ka a na-eme ka a na-eme, a gwara mụ na ụmụ akwụkwọ anyị ka anyị na-egbuchapụrụ ibe anyị ma na-asị “Heil Hitler” (nke pụtara, Nzọpụta Si n’Aka Hitler), nakwa ka anyị na-ekwe ukwe e ji eto mba. A gwakwara anyị ka anyị banye n’òtù Hitler hiwere. Ọ bụ ndị na-eto eto nọ n’òtù ahụ, Hitler chọkwara ka a na-akụziri ha ihe gbasara ọchịchị Nazi. Ma, o nweghị nke ọ bụla n’ime ihe ndị a ha sị anyị mee m kwere eme. Ka m kọọrọ gị ihe kpatara ya.

Papa m na mama m mụrụ ụmụ ise. Ụmụnne m ndị nwoke anọ tọchara m, mụnwa bụ ọdụdụ nwa. Anyị bi n’otu ubi dị na Senti Valbọgịn, Karịntịa, nke dị n’Ọstria. Aha papa m bụ Johann Obweger, nke mama m abụrụ Elisabeth Obweger. N’afọ 1925, papa m ghọrọ Onyeàmà Jehova. Ihe a na-akpọ Ndịàmà Jehova n’oge ahụ bụ Ndị Mmụta Baịbụl. E mere mama m baptizim n’afọ 1937. Papa m na mama m si na nwata kụziwere m ihe Baịbụl kwuru, ha nyekwaara m aka ịhụ Chineke na ihe ndị o kere eke n’anya. Dị ka ihe atụ, ha ji Baịbụl gosi m na Chineke achọghị ka anyị fee mmadụ ọ bụla. Jizọs Kraịst kwuru, sị: “Ọ bụ Jehova Chineke gị ka ị na-aghaghị ife ofufe, ọ bụkwa naanị ya ka ị na-aghaghị ijere ozi dị nsọ.”—Luk 4:8.

Papa m na mama m na-ele ọbịa nke ọma. Ọtụtụ ndị na-abịa n’ụlọ anyị, anyị na ọtụtụ ndị na-arụrụ anyị ọrụ n’ubi bikwa. Anyị na-abụkarị abụ n’ihi na ọ bụ ihe e ji mara ndị ebe anyị ruokwa taa. Ọtụtụ mgbe, anyị na-ekwurịtakwa ihe gbasara Baịbụl. Obi na-atọ m ụtọ ma m cheta otú anyị si anọ gburugburu tebụl dị na palọ anyị na-amụ Baịbụl n’ụtụtụ Sọnde ọ bụla.

Otú Obi Ụtọ M Na-enwe Si Laa

Mgbe Jamanị malitere ịchị Ọstria, ọ fọrọ obere ka m ruo afọ asatọ. Ha malitere n’oge ahụ manyewe ndị mmadụ ka ha na-eme ihe ndị Nazi chọrọ. Ka oge na-aga, e nyere iwu na onye hụ ibe ya, ya gbuchapụrụ ya, sị ya, “Heil Hitler” (nke pụtara, Nzọpụta Si n’Aka Hitler). Ekweghị m eme ihe ahụ e kwuru n’ihi na ekwetaghị m na nzọpụta si n’aka Hitler. O doro m anya na Jizọs Kraịst bụ Onye Nzọpụta m. (Ọrụ 4:12) Ndị nkụzi anyị na ụmụ akwụkwọ anyị bidoro ime m akaje n’ihi na anaghị m asị “Heil Hitler.” Mgbe m dị afọ iri na otu, hedmasta anyị gwara m, sị: “Hermine, m ga-eweghachi gị na klas mbụ. Achọghị m onye isi ike dị ka gị na klas m!”

O nwere mgbe a kpụpụrụ papa anyị ụlọikpe maka na mụ na ụmụnne m jụwara isi na anyị agaghị na-asị “Heil Hitler.” A gwara ya ka ọ bịanye aka n’akwụkwọ iji gosi na ọ bụghịzi Onyeàmà Jehova. Akwụkwọ ahụ a sị ya bịanye aka kwukwara na ọ ga na-akụziri ụmụ ya ihe ndị ahụ ọchịchị Nazi na-akụziri ụmụaka. Ma, papa anyị ekweghị abịanye aka na ya. N’ihi ya, ha kpọọrọ anyị, gwa papa anyị na mama anyị na ọ bụghịzi ha ga na-azụ anyị. A kpọgara m n’ụlọ akwụkwọ dị ihe dị ka iri kilomita anọ ma e si n’ụlọ anyị gawa ya.

Mgbe m ruru ebe ahụ, ebidoro m ibe sọọsọ ákwá n’ihi na ịla ụlọ anyị nọ na-agụsi m agụụ ike. Ka oge na-aga, nwaanyị na-elekọta ebe ahụ nwara ike ya ịmanye m ka m banye n’òtù ahụ Hitler hiwere, ma ajụwara m isi. N’otu oge a nọ na-egbuchapụrụ ọkọlọtọ ndị Nazi, a gwara ụmụ agbọghọ ndị ọzọ nọ ebe ahụ ka ha welie aka nri m elu, ma, ekweghị m ka ha welie ya. Obi dị m nnọọ otú ahụ ọ dị ndị ohu Chineke n’oge ochie, bụ́ ndị sịrị: “Tụfịakwa! Anyị agaghị ahapụ Jehova gaa fee chi ọzọ.”—Jọshụa 24:16.

E nyere papa m na mama m iwu ka ha ghara ịbịa na-eleta m. Ma, o nweghị onye ma na mụ na ha na-ahụ mgbe ụfọdụ ma m na-aga akwụkwọ. N’agbanyeghị na mụ na ha anaghị anọte aka, anya ahụ mụ na ha na-ahụtụ nyeere m aka ịnọgide na-eme ihe Baịbụl kwuru. N’otu ụbọchị mụ na ha hụrụ, papa m nyere m obere Baịbụl, mụ ezoo ya na beedi m. Ịgụ Baịbụl ahụ na-atọ m ezigbo ụtọ n’agbanyeghị na m na-ezo ezo agụ ya. O nwere otu ụbọchị a gaara ejide m ebe m na-agụ Baịbụl ahụ, mụ ezoo ya n’okpuru ákwà beedi m.

A Kpọgara M n’Ebe Ndị Nọn Bi

Ebe ọ bụ na mbọ niile ha gbara kụrụ afọ n’ala, ha kwuru na ọ ga-abụ papa m na mama m na-agwa m ihe m na-eme. N’ihi ya, n’ọnwa Septemba afọ 1942, ha ji ụgbọ okporo ígwè kpọga m Miunịk dị na Jamanị. N’ebe ahụ, e denyere aha m n’ụlọ akwụkwọ ndị Katọlik a na-akpọ Adelgunden. E jikwa ụlọ akwụkwọ ahụ mere ebe ndị nọn na-ebi. Mgbe a nọ na-akwa ngwongwo m, ndị nọn hụrụ Baịbụl ahụ papa m nyere m, ha ejichie ya.

Ma, ekpebisiri m ike na m ga na-eme ihe ndị ahụ papa m na mama m ji Baịbụl kụziere m, ekweghịkwa m aga chọọchị. Mgbe m gwara otu n’ime ndị nọn ahụ na papa m na mama m na-agụrụ m Baịbụl n’ụbọchị Sọnde ọ bụla, o nyeghachiri m Baịbụl ahụ ha jichiri. Ihe a o mere tụrụ m n’anya. Ọ ga-abụrịrị na ihe ahụ m gwara ya metụrụ ya n’obi. O mechadịrị gwa m ka m na-agụrụ ya Baịbụl.

E nwere mgbe otu onye nkụzi anyị gwara m, sị: “Hermine, i nwere ntutu na-acha anwụ anwụ, mkpụrụ anya gị na-achakwa anụnụ anụnụ. I yiri onye Jamanị, ọ bụghị onye Juu. Jehova bụ Chi ndị Juu.”

Agwara m ya, sị: “Ma, ọ bụnụ Jehova kere ihe niile. Ọ bụ ya kere anyị niile.”

Hedmasta anyị nwakwara ike ya niile ịhụ na m so ha na-eme ihe ndị ha na-eme. Otu ụbọchị, ọ gwara m, sị: “Hermine, gee ntị ka m gwa gị, nwanne gị nwoke abaala amị. I kwesịrị ịna-erube isi ka ya.” Ama m na nwanne m nwoke bara amị, ma achọghị m ime ka ya.

Agwara m hedmasta anyị, sị: “Anaghị m eso ụzọ nwanne m nwoke. Ọ bụ Jizọs Kraịst ka m na-eso ụzọ ya.” Ihe ahụ m kwuru were ya iwe, ya agwa m na ya ga-akpọga m ebe a na-agwọ ndị ara. Ọ gwadịrị otu onye nọn ka o jikere ịkpọga m ebe ahụ. Ma, e mechaghị kpọga m ebe ahụ.

N’oge okpomọkụ n’afọ 1943, a tụrụ bọmbụ na Miunịk, a kpọgazie ụmụ akwụkwọ nọ n’Adelgunden ime ime obodo. Ka ihe ndị a niile na-eme, m na-echeta ihe mama m gwara m. Ọ gwara m, sị: “E nwee otú ihe si mee, nke na mụ na gị ebighịzi, o nweghịkwanụ akwụkwọ ozi ọ bụla m na-ezitere gị, cheta na Jehova na Jizọs nọ gị nso. Ha agaghị ahapụ gị. Gbaa mbọ na-ekpe ekpere mgbe niile.”

A Hapụrụ M Ka M Laa

N’ọnwa Mach 1944, a kpọghachiri m n’ụlọ akwụkwọ ahụ a na-akpọ Adelgunden. Anyị na-anọ n’ogige ndị gbara ọsọ ndụ, ma n’ụtụtụ ma n’abalị, n’ihi na a na-atụ bọmbụ aghara aghara na Miunịk. N’oge ahụ, papa m na mama m na-agakwuru ndị ọchịchị na-arịọ ha ka ha hapụ m ka m lọta. Ha mechara hapụ m, mụ alọta n’ọnwa Eprel afọ 1944.

Mgbe m bịakwutere hedmasta anyị ka m gwa ya na mụ alawala, ya asị m: “Hermine, ị laruo, detara anyị akwụkwọ ozi. Jidekwa ka i ji.” Ị́ hụghị na nwoke a agbanweela? Anụrụ m na mgbe m lara, bọmbụ tụgburu ụmụ akwụkwọ itoolu na ndị nọn atọ n’ụlọ akwụkwọ ahụ. Agha jọgburu onwe ya!

Ma, obi tọrọ m ụtọ mgbe m larutere n’ụlọ anyị. N’ọnwa Mee afọ 1944, n’oge ahụ agha ka kpụ ọkụ n’ọnụ, e mere m baptizim ná nnukwu bezin e ji asa ahụ́, iji gosi na mụ enyefeela Jehova ndụ m niile. Mgbe agha biri n’afọ 1945, amalitere m ikwusara ndị mmadụ ozi ọma oge niile, na-akọrọ ha na ọ bụ Alaeze Chineke ga-eweta udo n’ụwa, obi eruokwa mmadụ niile ala ruo mgbe ebighị ebi.—Matiu 6:9, 10.

N’afọ 1950, mụ na Erich Liska matara. Erich bụ nwa okorobịa onye Viena dị n’Ọstria, ọ na-agakwa eleta ọgbakọ Ndịàmà Jehova. Mụ na ya lụrụ n’afọ 1952, esokwa m ya gaa leta ọgbakọ dị iche iche. Ma, anyị agateghị ya aka.

N’afọ 1953, amụrụ m ada m nwaanyị, emechakwara m mụọ ụmụ abụọ ọzọ. Anyị kwụsịrị ịga na-eleta ọgbakọ dị iche iche, ka anyị nwee ike zụọ ụmụ ndị anyị mụrụ. Ma, achọpụtara m na Chineke anaghị ahapụ ndị tụkwasịrị ya obi. Ọ na-enye ha ike. Jehova ahapụtụbeghị m, nke ka nke, kemgbe di m ọma nwụrụ n’afọ 2002. Ọ na-akasi m obi ma na-enye m ike.

M chee otú mụ na ụwa sirila gaa, obi ana-atọ m ụtọ na ndị mụrụ m si na nwata kụziwere m ịhụ Chineke na Okwu ya n’anya. Ọ bụ naanị Okwu Chineke na-enye ezigbo amamihe. (2 Timoti 3:16, 17) Ana m ekelekwa Jehova maka ike ọ na-enye m iji die nsogbu ndị dị n’ụwa a.

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 23]

“Anaghị m eso ụzọ nwanne m nwoke. Ọ bụ Jizọs Kraịst ka m na-eso ụzọ ya”

[Foto dị na peeji nke 23]

Mụ na ndị ezinụlọ anyị, mgbe anyị nọ n’ubi anyị dị na Senti Valbọgịn

[Foto ndị dị na peeji nke 23]

Papa m na mama m

[Ebe E Si Nweta Foto]

Foto abụọ a: Foto Hammerschlag

[Foto dị na peeji nke 24]

Mụ na di m