Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ihe Ga-enyere Mmadụ Aka Ka Ahụ́ Na-adị Ya Mma

Ihe Ga-enyere Mmadụ Aka Ka Ahụ́ Na-adị Ya Mma

Ihe Ga-enyere Mmadụ Aka Ka Ahụ́ Na-adị Ya Mma

“Obi dị jụụ bụ ndụ anụ ahụ́, ma ekworo bụ ure ọkpụkpụ.”​—ILU 14:30.

“Obi nke na-aṅụrị ọṅụ bara uru dị ka ihe na-agwọ ọrịa.”​—ILU 17:22.

● Ọ bụ Eze Sọlọmọn, onye chịrị mba Izrel n’oge ochie, kwuru ihe ndị ahụ. Ha dị mfe nghọta, gbaakwa ọkpụrụkpụ. O ruokwala ihe dị ka puku afọ atọ o kwuru ha. * Ma, ihe ndị ahụ o kwuru hà bụ eziokwu? Gịnị ka ndị dọkịta chọpụtarala n’oge anyị a?

E nwere otu akwụkwọ kwuru gbasara ndị obi na-adị jụụ na ndị na-ewekarị iwe. Akwụkwọ ahụ kwuru, sị: “Ndị ọkachamara achọpụtala na iwe oké iwe na isekarị okwu so n’ihe na-akpata ọrịa obi. Otú mmadụ ga-esi ezere ọrịa a, ma ọ bụkwanụ gwọọ ya agwọ, abụghị . . . naanị ịna-emega ahụ́ na ịna-aṅụ ọgwụ, onye ahụ kwesịkwara ịkwụsi iwe oké iwe na isekarị okwu.” Ihe akwụkwọ a na-ekwu bụ na ọ bụrụ na iwe anaghị eju anyị obi, ahụ́ ga na-adị anyị mma. Ihe a o kwuru ka Baịbụl kwuru.

Ụdị ihe a na-emekwa ma ọ bụrụ na obi na-adịkarị anyị ụtọ. Na chanel tiivi a na-akpọ BBC, otu onye Skọtland bụ́ dọkịta, aha ya bụ Dr. Derek Cox, kwuru, sị: “Ọ bụrụ na obi na-adịkarị gị ụtọ, o yiri ka n’ọdịnihu, ị gaghị na-arịa ọrịa otú ndị na-anaghị enwe obi ụtọ na-arịa.” O kwukwara, sị: “Ndị na-enwe obi ụtọ anaghị arịakarị ọrịa ndị dị ka ọrịa obi na ọrịa strok.”

Gịnị mere ọ ka ji bụrụ ugbu a ka ndị mmadụ malitere matawa ihe a Sọlọmọn na ndị ọzọ so dee Baịbụl matara kemgbe ụwa? Azịza ya araghị ahụ́. Baịbụl kwuru, sị: “Chineke wee na-enye Sọlọmọn amamihe na nghọta n’ebe ọ dị ukwuu.” (1 Ndị Eze 4:29) Ihe ọzọkwa bụ na ihe ndị ahụ Sọlọmọn na ndị ọzọ dere esighị ike nghọta, ha bakwaara onye ukwu na onye nta uru. O nweghị ụgwọ mmadụ ga-akwụ iji ghọta ha.

Í cheghị na ọ ga-adị mma ma ị na-agụchi Baịbụl anya? Ọtụtụ nde ụmụ mmadụ na-enwe ezigbote ọṅụ maka na ha achọpụtala na ‘mgbe amamihe banyere n’obi ha, ihe ọmụma abụrụkwa ihe na-atọ mkpụrụ obi ha ụtọ, ikike iche echiche na-echekwa ha nche, nghọta na-echebekwa ha.’ (Ilu 2:10, 11) Ị́ hụghị na Baịbụl bara ezigbo uru?

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 4 Ọtụtụ mgbe, Baịbụl kwuo okwu gbasara “obi,” ihe ọ na-ekwu bụ ụdị onye mmadụ bụ nakwa otú obi na-adị ya.