Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndụmọdụ Asaa Ndị Ga-abara Gị Uru

Ndụmọdụ Asaa Ndị Ga-abara Gị Uru

Ndụmọdụ Asaa Ndị Ga-abara Gị Uru

N’ISIOKWU a, e nwere ndụmọdụ asaa e ji mkpụrụ akwụkwọ okpotokpo dee. E si na Baịbụl nweta ha, ha abaakwarala ndị mmadụ uru kemgbe e dere ha. Gụọ ha ka ị hụ otú ha nwere ike isi nyere gị aka iji ego gị na-eme ihe bara uru.

1. “Ọlaọcha agaghị eju onye hụrụ ọlaọcha n’anya afọ, ego agaghịkwa eju onye ọ bụla nke hụrụ akụ̀ n’anya afọ.” (Ekliziastis 5:10) Ọ bụghị ogbenye ọnụ ntụ nke nọ na-enwere ndị ọgaranya anyaụfụ kwuru ihe a, kama, ọ bụ Eze Sọlọmọn, onye chịrị mba Izrel, kwuru ya. Sọlọmọn so ná ndị kacha baa ọgaranya n’ụwa, ọ bụkwa ihe ndị o ji anya ya abụọ hụ nakwa otú ihe si gaara ya ná ndụ mere o ji kwuo ya. Taakwa, ọtụtụ ndị bara ọgaranya ekwuola ihe ndị yiri ihe a o kwuru.

2. “Ebe anyị nwere ihe oriri na uwe, anyị ga-enwe afọ ojuju n’ihe ndị a. Otú ọ dị, ndị kpebisiri ike ịba ọgaranya na-adaba n’ọnwụnwa.” (1 Timoti 6:8, 9) Ọ bụ Pọl onyeozi kwuru ihe a. Pọl hapụrụ ọrụ gaara enye ya ezigbo ego ma ghọọ onye na-eso ụzọ Jizọs Kraịst. O meghị ka ụfọdụ ndị ndú okpukpe e nwere taa, ndị na-echere ka ndị ha na-akụziri Baịbụl ma ọ bụ ndị enyi ha na-eweta ka ha na-eri. Kama, o ji obi ọcha ya kwuo, sị: “Ọ dịghị onye m nwere anyaukwu n’ebe ọlaọcha ya ma ọ bụ ọlaedo ya ma ọ bụ uwe ya dị. Unu onwe unu maara na aka m ndị a gbooro m mkpa m nakwa nke ndị mụ na ha nọ.”—Ọrụ 20:33, 34.

3. “Ọ̀ dị onye n’ime unu nke chọrọ iwu ụlọ elu, nke na-agaghị ebu ụzọ nọdụ ala gbakọọ ihe ọ ga-efu, ka o wee hụ ma ò nwere ihe ga-ezu iji wuchaa ya?” (Luk 14:28) Ihe a Jizọs kwuru nwere ike inyere gị aka mgbe ị chọrọ ikpebi ihe ị ga-eme. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na ị chọrọ ịzụ ihe, ị̀ ga-ewere ego banye n’ahịa zụrụ ihe ọ bụla ị hụrụ ka ị̀ ga-ewetu obi ala gbakọọ ego ole ihe ị chọrọ ịzụ ga-ewe gị? Ị ga-ajụkwa onwe gị ma ihe ahụ ọ̀ dị gị ezigbo mkpa nakwa ma ego i ji ọ̀ ga-ezuru gị ịzụ ya.

4. “Onye gbaziiri ihe [bụ] ohu onye gbazinyere ya ihe.” (Ilu 22:7) Ihe isi ike ahụ kpara ụwa niile aka ọjọọ n’oge na-adịbeghị anya mere ka o doo anya na ịzụrụ ihe n’aka na oké ịgbaziri ego abaghị uru. N’akwụkwọ ahụ Michael Wagner bipụtara n’afọ 2009, o kwuru na ụfọdụ ndị na-azụkarị ihe n’aka ma ọ bụkwanụ na-agbazikarị ego. Nke a emeekwala ka ha jiri ọtụtụ ndị ezigbo ụgwọ ha na-amaghị otú ha ga-esi akwụ ya.

5. “Onye ajọ omume na-agbaziri ihe ma ọ dịghị akwụghachi ya, ma onye ezi omume na-eme amara, na-enyekwa onyinye.” (Abụ Ọma 37:21) Ụfọdụ ụlọ ọrụ na-eme ha jiri ọtụtụ ndị ụgwọ, ha agwa ụwa niile na ha adaala. Ihe mere ha ji eme ya bụ ka ha gbara isi onwe ha ma ghara ịkwụ ụgwọ ndị ha ji. Ma, ndị chọrọ ka ha na Chineke nọgide na-adị ná mma anaghị eji ụgwọ ha ji ndị ọzọ egwu egwu. Ha na-ejikwa ihe ha nwere enyere ndị ọzọ aka.

6. “Ọ dị mgbe m bụ nwata, emewokwa m agadi, ma ahụbeghị m ka a hapụrụ onye ọ bụla bụ́ onye ezi omume kpamkpam, ahụbeghịkwa m ụmụ ya ka ha na-arịọ nri.” (Abụ Ọma 37:25) Ọ bụ Devid, onye ndị mmadụ chiri ọnụ n’ala kwuru ihe a. Ọ gbara ọsọ ndụ ọtụtụ afọ nke na mgbe ụfọdụ, ọ na-aga ebi n’ọgba ma ọ bụkwanụ ná mba ọzọ. Devid mechara bụrụ eze chịrị Izrel n’oge ochie. Ihe ndị mere ná ndụ ya gosiri na ihe a o kwuru bụ eziokwu.

7. “A na-enweta obi ụtọ ka ukwuu n’inye ihe karịa ka a na-enweta n’ịnara ihe.” (Ọrụ 20:35) Ọ bụ Jizọs, bụ́ nwoke kacha ndị niile birila n’ụwa, kwuru ihe a. Mgbe ọ bịara n’ụwa, o ji ndụ ya jeere ndị mmadụ ozi “n’ihi ọṅụ e debere n’ihu ya.” Ugbu a, ọ bụ mmụọ na-anaghị anwụ anwụ, ọ nọkwa n’aka nri Jehova, onye Baịbụl kwuru na ọ bụ ‘Chineke onye obi ụtọ.’—Ndị Hibru 12:2; 1 Timoti 1:11.

O nweghị ihe ọzọ anyị ga-eji ndụ anyị mee nke karịrị ime ụdị ihe ahụ Jizọs mere, ya bụ, ime ihe niile anyị nwere ike ime iji hụ na anyị nyeere ndị ọzọ aka. O doro anya na ị matala ugbu a na ọ ka mma ka mmadụ bụrụ onye na-echekwa ego ya nke ọma, ka o nwee ike ịna-enyere ndị ọzọ aka, kama ịbụ ọkpata orichaa naanị ya.