Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Olee Ụdị Onye Nne ma Ọ Bụ Nna Ga-achọ Ka Nwa Ya Bụrụ?

Olee Ụdị Onye Nne ma Ọ Bụ Nna Ga-achọ Ka Nwa Ya Bụrụ?

Echiche Baịbụl

Olee Ụdị Onye Nne ma Ọ Bụ Nna Ga-achọ Ka Nwa Ya Bụrụ?

N’IME ụdị mmadụ atọ a e kwuru n’okpuru ebe a, olee nke ị ga-achọ ka nwa gị bụrụ?

A. Onye na-akpa àgwà ka gị.

B. Onye nnupụisi nke na-anaghị akpa àgwà ka gị.

CH. Dimkpa anya ruru ala, nke na-eche echiche eme ihe.

Ndị nne na nna na-ekwu na ha chọrọ ka ụmụ ha ghọọ ndị dimkpa anya ruru ala, ndị na-eche echiche eme ihe. Ma, ụfọdụ n’ime ha na-achọ ka ụmụ ha na-akpa àgwà ka ha. Ha na-agbalị ime ka ụmụ ha lewe ihe anya otú hanwa si ele ihe anya. Dị ka ihe atụ, ha na-agwa ụmụ ha ụdị ọrụ ha chọrọ ka ha rụọ. Ma, gịnị na-emecha mee? Ozugbo ụmụaka ahụ malitere ikpebiri onwe ha ihe, ha emewe ihe na-abụghị ihe nne ha na nna ha chọrọ ka ha na-eme. Ndị nne na nna ahụ, ndị chọrọ ka ụmụ ha na-akpa àgwà ka ha, na-achọpụtazi na ụmụ ha anaghịdị akpa àgwà ha.

Ihe Mere Ọ Dịghị Mma Ịmanye Nwa Gị Ka Ọ Na-eme Otú Ị Chọrọ

Olee ihe i nwere ike ime ka nwa gị nwee ike ịghọ dimkpa anya ruru ala, nke na-eche echiche eme ihe? Otu ihe ị ga-eburu n’obi bụ na i kwesịghị ịmanye ya ka ọ na-eme otú ị chọrọ. Lee ihe abụọ mere i kwesịghị ime otú ahụ.

NKE MBỤ: Akwụkwọ Nsọ akwadoghị ya. Jehova Chineke kere ụmụ mmadụ ka ha na-ekpebiri onwe ha ihe ha chọrọ ime. Ọ na-ahapụ ụmụ mmadụ ka ha họrọ ihe ha chọrọ ime ná ndụ, ma ihe ahụ ọ̀ bụ ihe ọma ma ọ̀ bụ ihe ọjọọ. Dị ka ihe atụ, mgbe Ken buuru Ebel nwanne ya ihe ọjọọ n’obi, Jehova gwara ya, sị: “Ọ bụrụ na ị gbanwee mewe ezi ihe, ọ̀ bụ na a gaghị ebuli gị elu? Ma ọ bụrụ na ị gbanweghị mewe ezi ihe, lee, mmehie makpu n’ọnụ ụzọ, ọ bụkwa gị ka ọ na-achọsi ike inweta; ma gị onwe gị, ị̀ ga-emeri ya?”​—Jenesis 4:7.

Ị̀ chọpụtara na Jehova dụrụ Ken ọdụ n’ezoroghị ya ọnụ? Ma, ọ manyeghị ya ka o mee ihe ọ gwara ya. Ọ bụ Ken ka ọ dị n’aka ikpebi ma ọ̀ ga-anọgide na-eburu nwanne ya ihe ọjọọ n’obi ka ọ̀ ga-akwụsị. Gịnị ka ihe a na-akụziri anyị? Ọ bụrụ na Jehova anaghị amanye ma ndị mmụọ ozi ma ụmụ mmadụ ka ha na-erubere ya isi, i kwesịghịkwa ịmanye nwa gị ka o mewe otú ị chọrọ. *

NKE ABỤỌ: Ụmụaka ndị e mere otú ahụ na-emecha mewe otú dị ha mma. Were ya na onye ị chọrọ izu ihe n’aka ya ji ire ụtọ na-achọ ịmanye gị ka ị zụọ ngwá ahịa ya. Ka ọ na-anwa ime ka ị zụọ ihe ahụ, gị ana-agbụrụ onwe gị. N’agbanyeghị na ihe ahụ dị gị mkpa, i nwere ike jụ ịzụ ya n’ihi otú o si jiri ire ụtọ na-achọ ịmanye gị ka ị zụọ ya.

Ụdị ihe a nwere ike ime ma ọ bụrụ na ị na-amanye nwa gị ka o mewe otú ị chọrọ ma ọ bụ ka o kpewe okpukpe ị na-ekpe. Nke bụ́ eziokwu bụ na mbọ ị na-agba nwere ike ghọ gị ahịa n’ihi na nwa gị nwere ike jụ ime ihe ahụ ị chọrọ. Ndị na-eto eto na-enupụkarịrị ndị nne na nna ha isi ma ha manyewe ha ime otú ha chọrọ. Gịnịzi ka i kwesịrị ime?

Kama ịmanye nwa gị ka ọ na-eme otú ị chọrọ, otú ahụ ị na-eme mgbe ọ bụ nwata, nyere ya aka ka ọ ghọta uru ịkpa àgwà ọma ga-abara ya. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na ị bụ Onye Kraịst, kọwaara ya ka ọ ghọta na ihe ga-agara ya nke ọma ná ndụ ma ọ bụrụ na ọ na-eme ihe Baịbụl kwuru.​—Aịzaya 48:17, 18.

Ka ị na-akọwara ya ihe ndị ahụ, gịnwa kwesịrị ịna-eme ha. Na-akpa ụdị àgwà ị chọrọ ka nwa gị na-akpa. (1 Ndị Kọrịnt 11:1) Emekwala ị na-ekwu ihe ọzọ, ị na-eme ihe ọzọ. (Ilu 4:11) Ọ bụrụ na nwa gị amalite ịhụ Chineke na iwu ya n’anya, ọ ga na-eme ihe ndị dị mma ma mgbe ị nọ ya ma mgbe ị na-anọghị ya.​—Abụ Ọma 119:97; Ndị Filipaị 2:12.

Kụziere Ya Ihe Ndị Ga-abara Ya Uru

Na peeji nke abụọ na magazin a, anyị kwuru na nwa gị ‘ga-ahapụ gị’ mgbe ọ ghọrọ dimkpa n’agbanyeghị na oge ahụ nwere ike ịdị gị ka ọ̀ bịara oké ngwa ngwa. (Jenesis 2:24) Gịnwa bụ́ nne ya ma ọ bụ nna ya kwesịrị ịkụziri ya ihe ndị ga-abara ya uru ma o mechaa gaa biri nke ya. Lee ụfọdụ ihe ndị i kwesịrị ịkụziri ya ugbu a gị na ya ka bi.

Ije Ozi Ụlọ. Nwa gị ọ̀ ma otú e si esi nri? Ò nwere ike iji aka ya saa ákwà ya ma dee ya ayọn? Ọ̀ ma arụzi ụmụ irighiri ihe ụfọdụ n’ụgbọala? Ọ bụrụ na nwa gị amụta ime ihe ndị a, ọ gaghị esiri ya ike ibi nke ya ma o mechaa pụọ. Pọl onyeozi kwuru, sị: “Amụtawo m inwe afọ ojuju n’ọnọdụ ọ bụla m nọ na ya.”​—Ndị Filipaị 4:11.

Ya na Ndị Ọzọ Imekọ Ihe. (Jems 3:17) Nwa gị na ndị ọzọ hà na-emekọ ihe n’enweghị nsogbu? Ya na ndị ọzọ nwee nsogbu, ò nwere ike iji nwayọọ dozie ya? (Ndị Efesọs 4:29, 31, 32) Ị̀ kụzierela ya otú e si edozi esemokwu nakwa ka ọ na-akwanyere ndị ọzọ ùgwù? Baịbụl sịrị: “[Sọpụrụ] ụdị mmadụ niile.”​—1 Pita 2:17.

Ijizi Ego Ejizi. (Luk 14:28) Ì nwere ike inyere nwa gị aka ka o nwee aka ọrụ, ka ọ mụta ikowe akpa ya ebe aka ya ga-eru, nakwa ka ọ ghara ịna-eji ndị mmadụ ụgwọ? Ị̀ kụzierela ya otú ọ ga-esi na-echekwa ego ọ ga-eji azụ ihe dị ya mkpa? Ọ̀ mụtala ịna-ejide onwe ya mgbe ọ gara ịzụ ihe, ghara ịzụ ihe ọ bụla ọ na-ebughị n’obi ịzụ? Ị̀ kụzierela ya ka ọ ghara ịna-azụ ihe na-adịghị ya mkpa naanị na ọ hụrụ na ndị ọzọ zụrụ ya? (Ilu 22:7) Pọl kwuru, sị: “Ebe anyị nwere ihe oriri na uwe, anyị ga-enwe afọ ojuju.”​—1 Timoti 6:8.

Ọ bụrụ na a kụziere nwata ka ọ na-eme ihe dị mma, kụziekwara ya ihe ndị ga-abara ya uru ma o biri nke ya, ọ ga-aghọ dimkpa anya ruru ala. N’eziokwu, ọ bụrụla ihe nne ya na nna ya chọrọ ka ọ bụrụ.​—Ilu 23:24.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 11 Ọ bụrụ na ị chọrọ ịmatakwu ihe a anyị na-ekwu, gụọ Ụlọ Nche Febụwarị 1, 2011, peeji nke 18-19.

Ì CHETỤLA NKE A N’ECHICHE?

● Olee ụdị onye ị ga-achọ ka nwa gị bụrụ?​—Ndị Hibru 5:14.

● Olee ihe nwa gị kwesịrị iji aka ya kpebie ma ọ ghọọ dimkpa?​—Jọshụa 24:15.

[Foto ndị dị na peeji nke 25]

Olee nke ị ga-achọ ka nwa gị bụrụ?

Onye na-akpa àgwà ka gị . . .

Onye nnupụisi . . .

Dimkpa anya ruru ala