Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Echefula Ịsị “I Meela”

Echefula Ịsị “I Meela”

Echefula Ịsị “I Meela”

OLEE mgbe ikpeazụ mmadụ detaara gị akwụkwọ ozi kelee gị maka ihe ọma i meere ya? Olee mgbe ikpeazụ gịnwa degaara mmadụ akwụkwọ ozi kelee ya maka ihe o meere gị?

Taa, kọmputa na ekwentị juru ebe niile. Nke a emeela ka ọ na-esiri ndị mmadụ ike ide akwụkwọ ozi iji kelee onye meere ha ihe ọma. Ma, idegara mmadụ akwụkwọ ozi sị ya, “i meela” bụ ụzọ magburu onwe ya mmadụ nwere ike isi gosi na obi dị ya mma maka ihe ọma e meere ya. Lee otú i nwere ike isi dee ya.

1. Ejila kọmputa ede ya, jiri aka gị dee ya.

2. Dee aha onye ahụ n’akwụkwọ ozi ahụ.

3. Ọ bụrụ na ọ bụ ihe ka o nyere gị, kpọọ ihe ahụ aha, kwuokwa ihe ị ga-eji ya mee.

4. Kelee onye ahụ ọzọ mgbe ị na-emechi akwụkwọ ozi ahụ.

Ọ bụrụ na mmadụ emeere gị ihe ọma, obi ga-adị ya ụtọ ma i dee akwụkwọ ozi kelee ya.

N’ihi ya, mgbe ọzọ mmadụ meere gị ihe ọma ma ọ bụ nye gị ihe, gosi ya na obi dị gị ụtọ maka ihe ahụ. Echefula ịsị ya, “i meela.”

[Igbe/Foto ndị dị na peeji nke 23]

Ezigbo Daada M, #2

I meela maka klọọkụ ahụ na-akụ mgbịrịgba #3 i nyere m. M na-ehi oké ụra, ma ọ na-enyeziri m aka iteta mgbe ọ bụla m chọrọ. Obi dị m ụtọ mgbe m hụrụ gị n’izu gara aga. Ọ̀ kwa ị laruru n’udo? Ama m na anyị ga-ahụ ọzọ n’oge na-adịghị anya.

I meela maka klọọkụ ahụ i nyere m. #4

Abụ m,

John

[Foto]

#1

[Igbe dị na peeji nke 23]

IHE Ị GA-EME

● Ọ bụrụ na ọ bụ ego ka e nyere gị, akpọla ya aha. Dị ka ihe atụ, kama ikwu ego ole e nyere gị, i nwere ike ịsị: “I meela maka ihe ahụ i nyere m. M ga-eji ya zụọ . . .”

● Gwa ya naanị gbasara ihe ahụ o nyere gị na otú obi dị gị. Ọ bụghị mgbe ahụ ka ị ga-abịa gwawa ya otú ị ga-esi aga ezumike ma ọ bụkwanụ otú i si gaa ụlọ ọgwụ n’oge na-adịbeghị anya.

● Ọ bụrụ na o nweghị ihe ị ga-eji ihe ahụ o nyere gị mee, agwala ya gbasara ya. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na ọ chịnyere gị uwe, ọ gaghị adị mma ma ị sị ya, “I meela maka uwe ahụ ị chịnyere m, ma, ọ dị m owoghoro.”

[Igbe dị na peeji nke 23]

Baịbụl kwuru na anyị kwesịrị ikele mmadụ ma o meere anyị ihe ọma. (Luk 17:11-19) Ọ gwara anyị ka anyị ‘na-ekpe ekpere n’akwụsịghị akwụsị,’ gwakwa anyị ka anyị ‘na-ekele Chineke banyere ihe ọ bụla.’—1 Ndị Tesalonaịka 5:17, 18.