Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

 ISIOKWU TETA! A | ÀNỌ M NDỤ EME GỊNỊ?

Olileanya Dị

Olileanya Dị

“Ndị dị umeala n’obi ga-enweta ụwa, ha ga-enwekwa obi ụtọ dị ukwuu n’ihi udo nke zuru ebe niile.”ABỤ ỌMA 37:11.

Baịbụl kwuru na ndụ ụmụ mmadụ ‘jupụtara ná nsogbu.’ (Job 14:1) Taa, e nweghị onye nọ n’ụwa ga-asị na ihe niile dịịrị ya mma. Ma, e nwere ndị ike ụwa gwụrụla, ya adị ha ka ha enweghịzi olileanya nakwa na ihe agaghị adịkwara ha mma ọzọ. Ọ bụrụ na ọ dị gị otú ahụ, cheta na Baịbụl kwuru na olileanya dị. O kwuru na ihe ga-adịrị ma gịnwa ma ụmụ mmadụ niile mma. Dị ka ihe atụ:

  • Baịbụl kwuru na Jehova Chineke buuru anyị niile ihe ọma n’obi.—Jenesis 1:28.

  • Jehova kwekwara nkwa na ya ga-eme ka ụwa ghọọ paradaịs.—Aịzaya 65:21-25.

  • Obi sikwara anyị ike na ọ ga-eme ihe ahụ o kwere ná nkwa. Mkpughe 21:3, 4 kwuru, sị:

    “Ụlọikwuu nke Chineke dịnyeere mmadụ, ya na ha ga-ebikwa, ha ga-abụkwa ndị nke ya. Chineke n’onwe ya ga-anọnyekwara ha. Ọ ga-ehichapụkwa anya mmiri niile n’anya ha, ọnwụ agaghị adị ọzọ, iru uju ma ọ bụ mkpu ákwá ma ọ bụ ihe mgbu agaghịkwa adị ọzọ. Ihe mbụ niile agabigawo.”

Ihe a Baịbụl kwuru abụghị nrọ. Jehova Chineke ga-emezurịrị ihe ahụ o kwuru, ọ na-agụsi ya agụụ ike ime ya, o nwekwara ike ọ ga-eji eme ya. Obi kwesịrị isi anyị ike na Chineke ga-eme ihe niile o kwere anyị ná nkwa. Nkwa ahụ mere ka anyị mara na e nwere ihe anyị nọ ndụ eme.

IHE Ị GA-EBURU N’UCHE: Ọ bụrụgodị na nsogbu ụwa a mere ka ike ụwa gwụ gị, nkwa Baịbụl kwere anyị nwere ike inyere gị aka ịna-edi nsogbu ndị ahụ.

IHE I NWERE IKE IME: Chọpụta ihe Baịbụl kwuru na Chineke ga-emere anyị n’ọdịnihu. Ndịàmà Jehova ga-enyere gị aka ịmata ihe ndị ahụ. I nwere ike ịjụ ndị nke nọ n’obodo unu ma ọ bụ gị agaa n’adres Ịntanet bụ́ www.pr418.com/ig. *

^ para. 11 Ihe i nwere ike ime: Gaa n’adres Ịntanet bụ́ www.pr418.com/ig, pịa ebe e dere IHE NDỊ ANYỊ NWERE, pịa Ọ́BÁ AKWỤKWỌ. N’ebe ahụ e dere chọwa, denye “ịda mbà n’obi” ma ọ bụ “mmadụ igbu onwe ya,” ị ga-ahụ ihe ga-enyekwuru gị aka.