Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ihe Ndị Na-eme n’Ụwa

Ihe Ndị Na-eme n’Ụwa

Ụwa niile

Otu ụlọ ọrụ na-ahụ maka ahụ́ ike ụmụaka n’obodo dị iche iche kwuru na kwa afọ, ihe fọrọ obere ka ọ bụrụ nde ụmụaka atọ na-anwụ n’ọnwa a mụrụ ha. Ha kwuru na ọtụtụ n’ime ihe ndị na-akpata ọnwụ ụmụaka ndị a bụ ihe e nwere ike igbochili. Ha kwukwara na e kee ụmụaka ndị ahụ ụzọ atọ, ihe karịrị otu ụzọ n’ime ha na-anwụ n’ụbọchị a mụrụ ha.

Briten

N’afọ 2011, ụlọ ọrụ na-ahụ maka ahụ́ ike n’Ingland kwuru na ihe si n’anwụrụ ụgbọala na-egbu ọtụtụ ndị n’obodo iri na ise dị na Lọndọn. E kwuokwala na gas ka petrol mma n’ihi na ụgbọala anaghị aṅụ ya otú o si aṅụ petrol, ọ naghịkwa emebi ikuku otú petrol si emebi. Ma, ihe kacha emebi ikuku n’obodo ndị ahụ anyị kwuru okwu ha bụ anwụrụ si n’ụgbọala ndị e ji gas anya.

Rọshịa

N’afọ 2013, otu ụlọ ọrụ na Rọshịa gbara ụfọdụ ndị obodo ahụ ajụjụ ọnụ. Ihe karịrị ọkara ná ndị kwuru na ha na-aga Chọọchị Ọtọdọks kwuru na ha agụtụbeghị Baịbụl. Ihe dị ka otu onye n’ime mmadụ anọ kwuru na ọ na-esi ike tupu ha ekpee ekpere.

Afrịka

Ụlọ Akụ̀ Ụwa kwuru na ala ndị mmadụ na-azọ n’Afrịka emeela ka ha na-ada ogbenye, meekwa ka ala e kwesịrị ịna-akọ nri tọgbọrọ nkịtị. E kee ala a na-anaghị akọ ihe ọ bụla na ha n’ụwa niile ụzọ abụọ, otu ụzọ dị n’Afrịka. Ha kwukwara na nri a na-akọpụta n’Afrịka erughị ihe ala dị n’Afrịka kwesịrị ịna-emepụta.

Amerịka

Ụlọ akwụkwọ dị iche iche anaghịzi eresị ụmụ akwụkwọ ha akwụkwọ ọgụgụ. Kama, ha na-etinyezi ihe niile ụmụ akwụkwọ kwesịrị ịgụ n’ime obere kọmputa ha na-eresị ha. Ma, o dochabeghị anya ma kọmputa ndị ahụ hà dị ọnụ ala karịa akwụkwọ ha na-eresịbu ha.