Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ihe Ndị Na-eme n’Ụwa

Ihe Ndị Na-eme n’Ụwa

Amerịka

E nwere ihe ọgbara ọhụrụ na-enyere ndị uwe ojii aka ịchụ ndị omekome n’emerụghị ndị na-agara onwe ha ahụ́. Ọ na-abụ ndị uwe ojii chụwa ndị omekome, ha agbapụ ihe ahụ, ya amado n’ụgbọala ha. Ndị uwe ojii na-ejizi ihe ahụ mata ebe ndị omekome ahụ nọ, jirizie nwayọọ chọrọ ha gawa.

India

Nchọpụta e mere na-egosi na kwa awa, a na-egbu otu nwaanyị n’India maka ụgwọ isi sịkwa, ụgwọ isi asịghị. N’agbanyeghị na ndị ọchịchị etiela iwu ka ha kwụsị ma ịkwụ ụgwọ isi ma ịnata ụgwọ isi, e gburu ihe karịrị puku ụmụ nwaanyị asatọ na narị abụọ n’afọ 2012. Ihe mekwaranụ e ji gbuo ha bụ na ụmụ nwoke ndị chọrọ ịlụ ha ma ọ bụ ụmụnne ụmụ nwoke ndị ahụ chere na ego a kwụrụ ha ehighị nne.

Swizaland

E nwere ihe ọgbara ọhụrụ dị obere ndị na-amụ gbasara ụmụ nnụnụ na Swizaland tinyere n’ahụ́ elekentịọba atọ iji mata ihe ha na-eme ma ha fere gawa Afrịka. Ihe ahụ gosiri ha na ụmụ nnụnụ ahụ fere ọnwa isii n’akwụsịghị akwụsị. Tupu ha achọpụta ihe a, ha na-echebu na ọ bụ naanị azụ̀ nwere ike ịgate aka otú ahụ n’akwụsịghị akwụsị.

Ebe Ọwụwa Anyanwụ Afrịka

Malite n’Eprel 2005 ruo na Disemba 2012, ndị omekome jidere otu narị ụgbọ mmiri na iri asaa na itoolu. Ụlọ akụ̀ ụwa kwuru na ndị omekome a natara ndị nwe ụgbọ mmiri ndị ahụ ihe karịrị ijeri naịra iri isii na ijeri anọ tupu ha ebunyeghachi ha ụgbọ mmiri ndị ahụ.