Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

 IHE BAỊBỤL KWURU

Ihe Oyiyi

Ihe Oyiyi

Nde kwuru nde ndị mmadụ na-eji ihe oyiyi efe ofufe. Baịbụl ò kwuru na ọ bụ otú ahụ ka e kwesịrị isi na-efe Chineke? Chineke ọ̀ na-anabata ụdị ofufe ahụ?

Ndị Juu oge ochie hà fere ihe oyiyi ofufe ma ọ bụkwanụ jiri ha fee ofufe?

“Emerela onwe gị ihe oyiyi a pịrị apị ma ọ bụ ọdịdị nke yiri ihe ọ bụla dị n’eluigwe ma ọ bụ nke dị n’elu ụwa ma ọ bụ nke dị na mmiri n’okpuru ụwa. Akpọrọla ha isiala, ekwekwala ka a rata gị ife ha ofufe.”—Ọpụpụ 20:4, 5.

Akwụkwọ Nsọ Hibru nke ọtụtụ ndị na-akpọ Agba Ochie kwuru ugboro ugboro na iji ihe oyiyi efe Chineke adịghị mma

IHE ỌTỤTỤ NDỊ KWEERE

Akwụkwọ a na-akpọ New Catholic Encyclopedia sịrị na e nwere ọtụtụ ihe oyiyi ndị Juu na-akwanyere ùgwù, jirikwa ha na-efe ofufe. Dị ka ihe atụ, akwụkwọ ahụ kwuru na e nwere mkpụrụ osisi, okooko osisi, nakwa ụmụ anụmanụ ndị e ji chọọ ụlọ nsọ dị na Jeruselem mma.—1 Ndị Eze 6:18; 7:36.

IHE I KWESỊRỊ ỊMA

N’agbanyeghị na e ji ihe ndị ahụ chọọ ụlọ nsọ mma, ndị Juu ji ofufe Chineke kpọrọ ihe e nweghị mgbe ha ji ihe ndị ahụ fee ofufe. Nke bụ́ eziokwu bụ na e nweghị ebe Baịbụl kwuru na onye Izrel ji obi ya niile efe Chineke ji ihe oyiyi fee ya ofufe.

IHE BAỊBỤL KWURU

Chineke si n’ọnụ Aịzaya onye amụma kwuo, sị: “Agaghị m enye onye ọzọ nsọpụrụ m, agaghịkwa m enye ihe oyiyi a pịrị apị otuto m.”—Aịzaya 42:8.

 Ndị Kraịst oge ochie hà ji ihe oyiyi fee ofufe?

“Oleekwa nkwekọrịta ụlọ nsọ Chineke na arụsị nwere? Kwụsịkwanụ imetụ ihe na-adịghị ọcha aka.”—2 Ndị Kọrịnt 6:16, 17.

Otu akwụkwọ kwuru banyere Ndị Kraịst oge ochie kwuru na e nweghị mgbe ha ga-ekweta itinye ihe oyiyi n’ụlọ ụka ha nakwa na ha ga-ewere ịkpọrọ ihe oyiyi isiala ma ọ bụ iji ya kpee ekpere ka ikpere arụsị

IHE ỌTỤTỤ NDỊ KWEERE

Akwụkwọ ahụ bụ́ New Catholic Encyclopedia kwukwara na o doro anya na Ndị Kraịst oge ochie ejighị ihe oyiyi fee ofufe. Ihe ọzọ akwụkwọ ahụ kwuru bụ na e ji ihe oyiyi chọọ ebe e liri Ndị Kraịst oge ochie mma nakwa na ha ji ihe oyiyi chọọ ebe ha na-anọ efe ofufe mma. *

IHE I KWESỊRỊ ỊMA

Ihe oyiyi ndị kacha ochie a hụrụ n’ebe e liri ndị oge ochie bụ ndị e tinyere n’ihe dị ka narị afọ abụọ mgbe Kraịst nwụchara. N’ihi ya, ihe ahụ akwụkwọ bụ́ New Catholic Encyclopedia kwuru gbasara Ndị Kraịst oge ochie abụghị eziokwu maka na oge e dere n’ihe ndị ahụ a hụrụ abụghị oge Ndị Kraịst e kwuru okwu ha n’Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst (nke ọtụtụ ndị na-akpọ Agba Ọhụrụ) nọ ndụ. Ihe ihe ndị ahụ a hụrụ n’ili ha na-egosi bụ na ka oge na-aga ụfọdụ ndị sị na ha bụ Ndị Kraịst malitere iji ihe oyiyi efe ofufe otú ahụ ndị na-agọ mmụọ si eme. O yiri ka ihe ha ji mee otú ahụ bụ ka ha wee tọghata ndị ọgọ mmụọ. *

IHE BAỊBỤL KWURU

“Gbaaranụ ikpere arụsị ọsọ.”—1 Ndị Kọrịnt 10:14.

È kwesịrị iji ihe oyiyi na-efe ofufe?

“Kpacharanụ anya ka unu ghara ikpere arụsị.”—1 Jọn 5:21.

Baịbụl akwadoghị ka e jiri ihe oyiyi na-efe Chineke. N’ihi ya, Ndịàmà Jehova anaghị eji ihe oyiyi efe ofufe, ha anaghịkwa etinye ihe oyiyi n’ụdị ya ọ bụla n’ụlọ ha ma ọ bụ n’ebe ha na-anọ efe Chineke

IHE ỌTỤTỤ NDỊ KWEERE

Akwụkwọ ahụ bụ́ New Catholic Encyclopedia kwukwara na ọ bụrụ na mmadụ na-akpọrọ ihe oyiyi isiala na ọ bụ onye ihe ahụ nọchiri anya ya ka ọ na-efe, ọ bụghị ihe oyiyi ahụ.

IHE I KWESỊRỊ ỊMA

Mgbe Jizọs kụziiri ndị na-eso ụzọ ya otú ha ga-esi na-ekpe ekpere, ọ gwaghị ha ka ha jiri ihe oyiyi na-ekpe ekpere. N’Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst (ya bụ, Agba Ọhụrụ), e nweghị ebe e kwuru ihe gosiri na a ga-eji ihe oyiyi na-efe ezi Chineke.

IHE BAỊBỤL KWURU

“Ọ bụ Jehova bụ́ Chineke gị ka ị na-aghaghị ife ofufe, ọ bụkwa naanị ya ka ị na-aghaghị ijere ozi dị nsọ.”—Matiu 4:10.

^ para. 13 Ihe oyiyi e kwuru okwu ya ebe a bụ ma ihe a kpụrụ akpụ ma foto ma ihe ọ bụla ọzọ e ji efe ofufe.

^ para. 14 Ọtụtụ obodo ndị e nwere n’oge ochie na-eji ihe oyiyi efe ofufe, dị ka ndị Ijipt, ndị Gris nakwa ndị India.