Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

 ISIOKWU TETA! A | GỊNỊ KA IHE ỊGARA MMADỤ NKE ỌMA PỤTARA?

Olee Otú I Si Amata Onye Ihe Na-agara Nke Ọma?

Olee Otú I Si Amata Onye Ihe Na-agara Nke Ọma?

Chebaragodị mmadụ anọ a echiche ka ị mata ụdị ndị ị na-ele anya ka ndị ihe na-agara nke ọma.

Ònye ka ị ga-asị na ihe na-agara nke ọma?

  • AFAM

    Afam na-azụ ahịa. Ọ na-agwa ndị ahịa ya eziokwu, na-akwanyekwara ha ùgwù. Ọ na-agbakwa mbọ. Ahịa ya na-enyekwa ya ezigbo ego, o nweghịkwa ihe na-akọ ya na ezinụlọ ya.

  • CHIMA

    Chima na-azụkwa ụdị ahịa Afam na-azụ. Ego ọ na-akpata karịrị nke Afam na-akpata. Ọ naghị ezu ike maka na ọ na-agba mbọ ka ndị ọzọ ghara ịka ya, n’ihi ya ọ na-arịakarị ọrịa.

  • UJUNWA

    Ujunwa bụ nwata akwụkwọ na-agụsị akwụkwọ ike, na-agbakwa mbọ ịmụta ihe. Ọ naghị ada n’ule.

  • EBELE

    Ebele bụ nwa akwụkwọ ọzọ na-eme nke ọma n’ule karịa Ujunwa, a makwa ya ama n’ụlọ akwụkwọ ha. Ma, ọ na-aghọ aghụghọ n’ule, ọ naghịkwa agụ akwụkwọ.

Ọ bụrụ na ị sị na ihe na-agara Chima na Ebele nke ọma ma ọ bụkwanụ na ihe na-agara ha anọ nke ọma, o nwere ike ịbụ na ihe i ji amata onye ihe na-agara nke ọma bụ ihe mmadụ nwetara n’agbanyeghị otú o si nweta ya.

Ọ bụrụkwanụ na ị sị na ọ bụ Afam na Ujunwa ka ihe na-agara nke ọma, o nwere ike ịbụ na ọ bụ onye na-akpa ezigbo àgwà ka ị na-ele anya ka onye ihe na-agara nke ọma. Iche otú ahụ adịkwaghị njọ. Dị ka ihe atụ, chegodị banyere ihe a:

  • Ọ̀ bụ ịgba onye nke mbụ n’ule ga-abara Ujunwa uru n’ọdịnihu ka ọ̀ bụ ịgba mbọ na-agụsi akwụkwọ ya ike?

  • Olee ihe ga-aka abara ụmụ Afam uru, ọ̀ bụ ịzụrụ ha ihe ọ bụla ha chọrọ ka ọ̀ bụ ha na papa ha ịna-anọrị?

Isi ihe anyị na-ekwu bụ na ọ bụghị ihe mmadụ nwere ma ọ bụ ihe onye ahụ bụ ka e ji amata onye ihe na-agara nke ọma kama ọ bụ àgwà onye ahụ.