Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

 ISIOKWU TETA! A | GỊNỊ KA IHE ỊGARA MMADỤ NKE ỌMA PỤTARA?

Ihe Ị Ga-eme Ka Ihe Na-agara Gị Nke Ọma

Ihe Ị Ga-eme Ka Ihe Na-agara Gị Nke Ọma

Ihe Baịbụl kwuru gbasara ihe ịgaziri mmadụ dị iche n’ihe ọtụtụ ndị na-eche na ihe ịgaziri mmadụ pụtara. O kwughị na ọ bụ naanị mmadụ ole na ole ihe dabaara ka ihe ga-agara nke ọma. Ma, ọ naghị akwado ihe ndị mmadụ na-ekwu na onye mee ihe obi ya gwara ya, ihe agaziere ya. Ọtụtụ ndị na-amalite mgbe ụmụ ha ka bụ nwata gwawa ha ihe ahụ. N’eziokwu, mmadụ nwere ike mee ihe obi ya gwara ya, ihe aghara ịgara ya nke ọma.

Nke bụ́ eziokwu bụ na e nweghị onye ihe na-agaghị agaliri nke ọma ma onye ahụ gbaa mbọ. Ka anyị tụlee ihe ụfọdụ Baịbụl kwuru banyere ihe ịgara mmadụ nke ọma.

  • IHE BAỊBỤL KWURU:

    “Ọlaọcha agaghị eju onye hụrụ ọlaọcha n’anya afọ, ego agaghịkwa eju onye ọ bụla nke hụrụ akụ̀ n’anya afọ.”—Ekliziastis 5:10.

    IHE Ọ PỤTARA. Ịchụ akụnụba ọnwụ ọnwụ anaghị eme ka mmadụ nwee afọ ojuju. Kama, ọ na-eme ka ihe ghara ịna-atụ onye ahụ n’anya. Otu ọkachamara aha ya bụ Jean M. Twenge kwuru na obi anaghị eru ndị mkpa ha bụ ịba ọgaranya ala, obi na-adị na-ajọkwa ha njọ. Ma, ndị mkpa ha bụ ka ha na mmadụ ibe ha dị ná mma anaghị echegbu onwe ha, obi na-erukwa ha ala. O kwukwara na nchọpụta niile a na-eme na-egosi na ego anaghị eme ka mmadụ nwee obi ụtọ nakwa na onye kpatahaala ihe ọ ga-eri, ego ndị ọzọ na-abatazi ya n’aka adịchazighị mkpa iji nwee afọ ojuju.

    IHE I NWERE IKE IME. Gbawa mbọ ka ị na-eme ihe ndị ọzọ ga-abara gị uru ná ndụ, ọ bụghị ịchụ ego na akụnụba. Jizọs kwuru, sị: “Lezienụ anya ka unu ghara inwe ụdị anyaukwu ọ bụla, n’ihi na ọbụna mgbe mmadụ nwere ọtụtụ ihe, ihe o nwere adịghị eme ka ọ dị ndụ.”—Luk 12:15.

  •  IHE BAỊBỤL KWURU:

    “Nganga na-abịa tupu nkụpịa, mmụọ mpako na-abịakwa tupu ịsụ ngọngọ.” —Ilu 16:18.

    IHE Ọ PỤTARA. Ọ bụrụ na mmadụ adị mpako ma ọ bụ nwee oké ọchịchọ, ihe agaghị agara ya nke ọma. Otu akwụkwọ kwuru banyere ihe ịga nke ọma kwuru na a bịa n’ụlọ ọrụ ndị na-eme nke ọma, ndị isi ha na-adị umeala n’obi, ha adịghị ebuli onwe ha elu. Ma, e kee ụlọ ọrụ ndị na-anaghị eme nke ọma ụzọ atọ, ndị bụ́ ndị isi n’ụzọ abụọ n’ime ha dị mpako. Ihe anyị mụtara n’ihe akwụkwọ a kwuru bụ na mmadụ ibuli onwe ya elu nwere ike ime ka ihe ghara ịgara ya nke ọma.

    IHE I NWERE IKE IME. Kama ịgbawa mbọ ka ị bụrụ onye a ma ama, gbalịa ka ị dị umeala n’obi. Baịbụl sịrị: “Ọ bụrụ na onye ọ bụla echee na ọ dị ihe ya bụ mgbe ọ na-adịghị ihe ọ bụ, ọ na-aghọgbu obi ya.” Ụdị onye a abụghị onye ihe na-agara nke ọma.—Ndị Galeshia 6:3.

  •  IHE BAỊBỤL KWURU:

    ‘Ọ dịghị ihe dịịrị mmadụ mma karịa ime ka mkpụrụ obi ya hụ ihe ọma n’ihi ịrụsi ọrụ ike ya.’—Ekliziastis 2:24.

    IHE Ọ PỤTARA. Ọ bụrụ na ị na-arụsi ọrụ ike, ọrụ gị ga na-enye gị obi ụtọ. N’akwụkwọ Dr. Madeline Levine dere, ọ sịrị na tupu ihe agaara mmadụ nke ọma n’ihe ọ na-eme, onye ahụ ga-amarịrị ime ihe ahụ nke ọma. Onye ahụ agaghịkwanụ ama ihe ahụ nke ọma ma ọ bụrụ na ọ naghị agbasi mbọ ike. Ụdị onye ahụ ga-amakwa ihe ọ ga-eme ma nsogbu ọ bụla bịara ya.

    IHE I NWERE IKE IME. Gbaa mbọ ka ọrụ gị doo gị anya, adakwala mbà ma nsogbu bịara gị. Ọ bụrụ na ị mụrụ ụmụ, nyere ha aka ka ha mụta ihe ha kwesịrị ime ma nsogbu bịara ha. Ya abụla ha nwehaala nsogbu, ị gbara doziere ha ya. Obi na-adịkwa ụmụaka ụtọ ma ha mụta otú ha ga-esi na-edozi nsogbu ha. Ọ ga-enyekwara ha aka ịna-edozi nsogbu ndị ga-abịara ha ma ha too.

  • IHE BAỊBỤL KWURU:

    “Nkịta dị ndụ ka ọdụm nwụrụ anwụ mma.”—Ekliziastis 9:4.

    IHE Ọ PỤTARA. Ọrụ i ji akpata ego ekwesịghị ịna-ewekọrọ oge gị niile. Ọ bụrụ na mmadụ na-eme nke ọma n’ọrụ ya, ma ọ naghị enwe efe elekọta onwe ya ma ọ bụ ezinụlọ ya, ị̀ ga-asị na ihe na-agara onye ahụ nke ọma? Ndị ihe na-agara nke ọma n’eziokwu anaghị ekwe ka ọrụ ha mee ka ha ghara ịna-elekọta onwe ha na ndị ezinụlọ ha.

    IHE I NWERE IKE IME. Na-elekọta onwe gị anya. Na-ezu ike. A gaghị asị na ihe na-agara gị nke ọma ma ị na-arụsi ọrụ ike ma leghara ma onwe gị ma ndị ezinụlọ gị ma ndị enyi gị anya.

  • IHE BAỊBỤL KWURU:

    “Obi ụtọ na-adịrị ndị maara mkpa ime mmụọ ha.”—Matiu 5:3.

    IHE Ọ PỤTARA. Mmadụ ịmụ Baịbụl na ime ihe ọ mụtara so n’ihe ndị dị mkpa na-eme ka ihe na-agara onye ahụ nke ọma. Nde kwuru nde Ndịàmà Jehova amụtala na ime ihe Baịbụl kwuru na-enyere ha aka ka ha ghara ịna-echegbu onwe ha banyere akụnụba.—Matiu 6:31-33.

    IHE I NWERE IKE IME. Mụta otú Baịbụl ga-esi nyere gị aka ka ihe na-agara gị nke ọma. Ị chọọ ịmatakwu ihe ndị ọzọ Baịbụl kwuru, gwa Ndịàmà Jehova bi gị nso ka ha nyere gị aka ma ọ bụ gị agaa n’ebe anyị na-edebe ihe n’Ịntanet bụ́ www.pr418.com/ig.