Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISIOKWU TETA! A | BAỊBỤL Ọ̀ KA BARA URU?

Agbala n’Èzí

Agbala n’Èzí

AMAOKWU BAỊBỤL GA-ENYERE GỊ AKA: “Ka alụmdi na nwunye bụrụ ihe kwesịrị nsọpụrụ n’etiti mmadụ niile, ka ihe ndina alụmdi na nwunye gharakwa ịbụ ihe e merụrụ emerụ.”Ndị Hibru 13:4.

URU Ọ BARA: Ụfọdụ ndị chere na iwu a bụ iwu e nyere ndị mgbe ochie, na ọ gbasaghị anyị taa. Ma, ọ bụghị eziokwu. N’oge ochie, ọ na-ewute mmadụ ma di ya ma ọ bụ nwunye ya na-agba n’èzí. Ọ bụkwa otú ahụ ka ọ dị taa.—Ilu 6:34, 35.

Otu nwoke aha ya bụ Emeka kwuru, sị: “Mụ na nwunye m dị n’ezigbo mma, na-enwekwa obi ụtọ n’ihi na anyị anaghị agba n’èzí. Di na nwunye kwesịrị ịtụkwasị ibe ha obi. Ha agaghị atụkwasịli ibe ha obi ma ha na-agba n’èzí.” Ịgba n’èzí na-akpakwa ụmụaka aka ọjọọ.

Ọ fọrọ obere ka otu nwaanyị aha ya bụ Uchechi * na di ya tisaa. O kwuru, sị: “Mụ na ndị ọjọọ malitere ịkpa. N’ihi ya, m malitere gbawa n’èzí.” Ihe ndị ọ malitere ime emeghị ka ọ na-enwe obi ụtọ. Kama, o mere ka ya na di ya na-enwe nghọtahie mgbe niile. O kwuru, sị: “Mgbe ọ bụla m chetara otú m si tinye aka n’ihe ọjọọ, ihe na-agbatakarị m n’uche bụ na ihe papa m na mama m na-adị agwa anyị bụ eziokwu. Ha na-ekwukarị na ‘mkpakọrịta ọjọọ na-emebi àgwà ọma.’”—1 Ndị Kọrịnt 15:33.

Uchechi kwukwara, sị: “Tupu ihe emebichaa, ekpebiri m ịkwụsị ịkpa àgwà ọjọọ ma malite ịmụ Baịbụl. Ekpebikwara m ịna-eme ihe m na-amụta na Baịbụl.” Gịnị meziri? Ya na di ya malitere biwe n’udo, di ya ana-akwanyekwara ya ùgwù ma jiri obiọma na-emeso ya omume. Ihe ọzọ Uchechi kwuru bụ na Baịbụl mere ka ndụ ya gbanwee nakwa na ya anaghị akwa mmakwaara maka otú ya si hapụ ma ihe ọjọọ ya na-emebu ma ndị enyi ọjọọ ya na ha na-akpabu.

^ para. 6 Aha a kpọrọ ụfọdụ ndị n’isiokwu a abụghị ezigbo aha ha.