Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Aha Chineke e ji mkpụrụ akwụkwọ Hibru dee juru eju bara abara n’ihe odide oge ochie nke Baịbụl

IHE BAỊBỤL KWURU

Aha Chineke

Aha Chineke

Ọtụtụ nde mmadụ n’ụwa taa na-akpọ Chineke utu aha ndị dị ka, Onyenwe anyị, Eze mgbe ebighị ebi, Allah ma ọ bụ Chineke iji kwanyere ya ùgwù. Ma, Chineke nwere aha. Ì kwesịrị ịna-akpọ ya aha ya?

Gịnị bụ aha Chineke?

IHE ỤFỌDỤ NDỊ KWURU

 

Ọtụtụ ndị weere onwe ha ka Ndị Kraịst kweere na aha Chineke bụ Jizọs. Ndị ọzọ a na-ekwu na ebe ọ bụ na e nwere naanị otu Chineke pụrụ ime ihe niile, ọ baghị uru ịna-akpọ ya ezigbo aha ya. Ndị ọzọ ekwuo na ọ dịghị mma ịna-akpọ Chineke aha ya.

IHE BAỊBỤL KWURU

 

Aha Chineke Pụrụ Ime Ihe Niile abụghị Jizọs n’ihi na Jizọs abụghị Chineke Pụrụ Ime Ihe Niile. N’eziokwu Jizọs kụziiri ndị na-eso ụzọ ya ikpe ekpere, sị: “Nna, ka e doo aha gị nsọ.” (Luk 11:2) Jizọs n’onwe ya kpedịrị ekpere, sị: “Nna, mee ka aha gị dị ebube.”—Jọn 12:28.

Na Baịbụl, Chineke kwuru, sị: “Abụ m Jehova. Ọ bụ ya bụ aha m; agaghị m enye onye ọzọ nsọpụrụ m.” (Aịzaya 42:8) Ihe a sụgharịrị mkpụrụ okwu Hibru anọ ahụ bụ́ YHWH bụ́ aha Chineke n’Igbo bụ “Jehova.” Aha ahụ pụtara ihe dị ka ugboro puku asaa n’Akwụkwọ nsọ Hibru. * Ọ pụtara ọtụtụ ugboro karịa utu aha ndị dị ka “Chineke,” “Onye Pụrụ Ime Ihe Niile” ma ọ bụ “Onyenwe anyị.” Ọ pụtakwara ọtụtụ ugboro karịa aha ndị dị ka, Ebreham, Mozis na Devid.

E nweghị ebe Jehova kwuru na Baịbụl na ya achọghị ka a kpọọ ya aha ya. Kama nke ahụ, Akwụkwọ Nso kwuru na ndị ohu Chineke kpọrọ Chineke aha ya. Aha Chineke dịkwa n’aha ndị ha gụrụ ụmụ ha, dị ka n’Ịlaịja, nke pụtara “Chineke m bụ Jehova,” nakwa na Zekaraya nke pụtara “Jehova Chetara m.” Ha na-akpọkwa aha Chineke ma ha na ibe ha na-ekwurịta okwu.—Rut 2:4.

Chineke chọrọ ka anyị na-akpọ ya aha ya. Ọ bụ ya mere anyị ji kwesị ‘ịna-ekele Jehova, ma na-akpọkukwa aha ya.’ (Abụ Ọma 105:1) N’eziokwu, obi na-adị ya ụtọ maka “ndị na-echebara aha ya echiche.”—Malakaị 3:16.

“Ka ndị mmadụ wee mara na gị onwe gị, onye aha gị bụ Jehova, ọ bụ naanị gị bụ Onye Kasị Elu n’ụwa niile.”—Abụ Ọma 83:18.

Gịnị ka aha Chineke pụtara?

Ụfọdụ ndị ọkà mmụta Baịbụl kwuru na ihe aha ahụ bụ́ Jehova pụtara n’asụsụ Hibru bụ “Ọ Na-eme Ka Ọ Ghọọ.” Ọ pụtara na Chineke nwere ike ịghọ ihe ọ bụla ọ chọrọ iji mezuo nzube ya ma ọ bụkwanụ mee ka ihe o kere eke ghọọ ihe ọ bụla ọ chọrọ iji mezuo nzube ya. Ọ bụ naanị Onye Okike Pụrụ Ime Ihe Niile nwere ikike imezu ihe aha ahụ pụtara.

URU Ọ GA-ABARA GỊ

 

Ịmara ezigbo aha Chineke ga-eme ka ị gbanwee ihe ndị i na-eche gbasara ya. Ọ ga-eme ka ọ dịrị gị mfe ịbịaru ya nso. Olee otú ị ga-esi ruo onye ị na-amaghị aha ya nso? E nwere ike ikwu na ihe mere Chineke ji mee ka ị mata aha ya bụ na ọ chọrọ ka ị bịaruo ya nso.—Jems 4:8.

Ka obi sie gị ike na Jehova ga na-emezu ihe aha ya pụtara n’ihi na ọ bụ Chineke na-emezu nkwa ya. Ọ bụ ya mere Baịbụl ji kwuo, sị: “Ndị maara aha gị ga-atụkwasị gị obi.” (Abụ Ọma 9:10) Ị ga-amụta ịtụkwasị Jehova obi ma ị mata na e nwere ihe jikọrọ aha ya na àgwà ya ndị dị ka, ịhụnanya, ebere, ọmịiko na ikpe ziri ezi. (Ọpụpụ 34:5-7) Obi ga-esi gị ezigbo ike ịmata na ọ bụghị naanị na Jehova ga-emezu nkwa ya niile, kama, ọ gaghị eme ihe ndị megidere àgwà ya ndị ahụ.

Obi dị anyị ụtọ na Chineke mere ka anyị mata aha ya. Ịmata aha ya ga-ewetara anyị ngọzi ma ugbu a ma n’ọdịnihu. Chineke kwere anyị nkwa, sị: “M ga-echebe ya n’ihi na ọ matawo aha m.”—Abụ Ọma 91:14.

“Onye ọ bụla nke ga-akpọku aha Jehova ga-alanahụ.”—Joel 2:32.

Aha Chineke n’asụsụ dị iche iche

^ para. 9 Ọtụtụ nsụgharị Baịbụl ejirila utu aha ahụ bụ́ “ONYENWE ANYỊ” dochie aha Chineke, ndị ọzọ e dee aha Chineke n’amaokwu ụfọdụ ma ọ bụkwanụ n’ala ala peeji. Ma, na Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ, e dere aha Chineke n’ebe niile o kwesịrị ịdị.