Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ịgbazi nwatakịrị na-eme ka ọ ghara itinye isi ebe a na-achọghị ka ọ gaa otú ahụ ụmara si eduzi ụgbọ epeepe

MAKA NDỊ NNE NA NNA

6: Na-agbazi Ụmụ Gị

6: Na-agbazi Ụmụ Gị

IHE Ọ PỤTARA

Ịgbazi ụmụaka nwere ike ịpụta iduzi ma ọ bụ ịkụziri ha ihe. Mgbe ụfọdụ, o nwekwara ike ịpụta ịta nwatakịrị ahụhụ maka ihe ọjọọ o mere. Ma ọtụtụ mgbe, ọ na-apụta ịkụziri nwatakịrị ihe ga-enyere ya aka ime mkpebi ndị dị mma.

IHE MERE O JI DỊ MKPA

Na nso nso a, ụfọdụ ndị mụrụ ụmụ anaghịzi agbazi ụmụ ha n’ihi na ha chere na ọ ga-eme ka ụmụaka chee na o nweghị uru ha bara. Ma, ndị nne na nna ma ihe na-agwa ụmụ ha ihe ha ga-eme na ihe ha na-agaghị eme. Ha na-akụzikwara ha otú ha ga-esi erubere ha isi.

Otu nwaanyị aha ya bụ Pamela kwuru, sị: “E kwesịrị ịna-agwa ụmụaka ihe ha ga-eme na ihe ha na-agaghị eme n’ihi na ọ ga-enyere ha aka ịna-akpa ezigbo àgwà ma ha too. Ọ bụrụ na agbazighị ụmụaka mgbe ha na-eto, ha ga-adị ka ụgbọ epeepe na-enweghị ụmara e ji akwọ ya, ọ ga-etinye isi ebe a na-achọghị ka ọ gaa ma ọ bụdị kpuo.

IHE I NWERE IKE IME

Na-eme ihe i kwuru. Ọ bụrụ na nwa gị emeghị ihe ị gwara ya mee, taa ya ahụhụ i kwuru na ị ga-ata ya. Mgbe ọ bụla o mekwaranụ ihe ị gwara ya mee, jaa ya mma.

Otu nwaanyị aha ya bụ Christine kwuru, sị: “M na-ajakarị ụmụ m mma maka otú ha si erube isi n’ụwa a ọtụtụ ndị na-anaghị erube isi. Ọ na-enyere ha aka ige ntị ma a dọọ ha aka ná ntị.”

IHE BAỊBỤL KWURU: “Mkpụrụ ọ bụla mmadụ na-agha ka ọ ga-aghọrọ.”—Ndị Galeshia 6:7.

Taa ya ahụhụ kwesịrị ya. Enyela nwa gị ntaramahụhụ karịrị ya ma ọ bụ nke karịrị ihe o mejọrọ. Ọ na-akacha mma iji ihe gbasara ihe nwa gị mejọrọ taa ya ahụhụ. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na nwa gị dara iwu i nyere ya gbasara ekwentị, i nwere ike ịnapụ ya ekwentị ahụ ruo oge ụfọdụ ma ọ bụ machie ya iji ya eme ihe ụfọdụ. Ma, ekwela ka obere ihe ọ bụla nwa gị mere ghọọrọ gị okwu naanị n’ihi na i nweghị mmasị n’ihe ahụ.

Otu nwoke aha ya bụ Wendell kwuru, sị: “M na-agbalị ịchọpụta ma nwa m ọ̀ ma ụma chọọ inupụrụ m isi ka ọ̀ bụ na ọ maghị ụma. E nwere ihe dị iche na àgwà ọjọọ riri nwatakịrị ahụ́ e kwesịrị ịgbazi na obere ihe ọ na-amaghị ụma mee e kwesịrị ịgwa ya na ọ dịghị mma.”

IHE BAỊBỤL KWURU: “Unu adịla na-akpasu ụmụ unu iwe, ka ha wee ghara ịda mbà n’obi.”—Ndị Kọlọsi 3:21.

Jiri obi gị niile hụ ha n’anya. Ụmụaka mata na ihe mere ndị mụrụ ha ji dọọ ha aka ná ntị bụ na ha hụrụ ha n’anya, ọ na-adịrị ha mfe ige ntị.

Otu nwoke aha ya bụ Daniel kwuru, sị: “Nwa anyị nwoke mejọọ ihe, anyị na-agwa ya na obi dị anyị ụtọ maka ihe ndị dị mma o mere n’oge ndị gara aga. Anyị na-eme ka ọ mara na ọ bụrụ na o mee mgbanwe ndị o kwesịrị ime, ihe o mejọrọ agaghị eme ka ọ bụrụ onye ọjọọ, nakwa na anyị dị njikere inyere ya aka.”

IHE BAỊBỤL KWURU: “Ịhụnanya na-enwe ndidi, dịrịkwa obiọma.”—1 Ndị Kọrịnt 13:4.