Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

IHE GA-ENYERE NDỊ NA-ERU UJU AKA

Ihe Ndị Ị Ga-atụ Anya Ya

Ihe Ndị Ị Ga-atụ Anya Ya

Onye ọ bụla n’ime anyị dị iche, n’ihi ya, mmadụ nwụnahụ anyị, otú onye ọ bụla si eru uju anaghị abụ otu. O nwere ike ịna-ewute ụfọdụ ma ha ana-eme ka ọ naghị ewute ha. Ọ bụ eziokwu na iru uju nwere ike ime ka onye mmadụ nwụnahụrụ nwetatụ onwe ya, anyị kwesịrị ịma na e nweghị otu ụzọ a ga-asị na ọ bụ ya “kacha mma” e si eru uju. Otú mmadụ si eru uju nwere ike ịdabere n’ebe o toro, ụdị onye ọ bụ, ihe ndị merela ná ndụ ya, nakwa otú onye ya si nwụọ.

OLEE OTÚ O NWERE IKE ỊDỊRU NÁ NJỌ?

Ndị mmadụ nwụnahụrụ nwere ike ha agaghị ama ihe ha ga-atụ anya ya. Ma, e nwere otú obi na-adịkarị ndị mmadụ nwụnahụrụ, nweekwa nsogbu ndị ha nwere ike ịtụ anya ha. Ka anyị tụlegodị ụfọdụ n’ime ha:

Obi nwere ike ịna-ajọ ha njọ. Onye mmadụ nwụnahụrụ nwere ike ibe ákwá, na-achọ ka ọ hụ onye ahụ ọzọ. Obi nwekwara ike ịmalite ịjọ ya njọ n’enweghị ihe kpatara ya. Ihe ọzọ nwekwara ike ime ka obi na-ajọ ya njọ bụ ma o cheta ihe ụfọdụ gbasara onye ahụ ma ọ bụ rọta ya ná nrọ. Mgbe mbụ mmadụ nụrụ na onye ya nwụrụ, akpata oyi nwere ike ịwụ ya, ya adị ya ka ọ̀ nọ ná nrọ. Otu nwaanyị aha ya bụ Tiina kwuru ihe merenụ mgbe di ya bụ Timo gbabiiri nwụọ. O kwuru, sị: “O riri m ọnụ ná mmalite, ike ákwá adịdịghị m. Ọ gwụrụ m ike nke na o siiri m ike iku ume. Ọ dị m ka ọ̀ na-eme ná nrọ.”

Ha nwere ike ịna-echegbu onwe ha, na-ewe iwe, obi ana-amakwa ha ikpe. Otu nwoke aha ya bụ Ivan kwuru, sị: “Mgbe Eric nwa anyị dị afọ iri abụọ na anọ nwụrụ, ezigbo iwe nọ na-ewe mụ na Yolanda nwunye m ruo oge ụfọdụ. O juru anyị anya n’ihi na anyị abụghị ndị iwe kemgbe ụwa. Obi anyị nọ na-ama anyị ikpe, anyị ana-echekwa ma ànyị mere ihe niile anyị kwesịrị ime iji nyere nwa anyị nwoke aka.” Obi otu nwoke aha ya bụ Alejandro makwara ya ikpe mgbe nwunye ya rịachara ọrịa ogologo oge nwụọ. Ọ sịrị: “Ná mmalite, m nọ na-eche na m bụ onye ọjọọ, ebe Chineke hapụrụ m ka m taa ụdị ahụhụ a. O mere ka obi m na-ama m ikpe, ya adị m ka m̀ na-ata Chineke ụta maka ihe mere m.” Kostas anyị kwuru gbasara ya ná mmalite kwuru, sị: “O nwedịrị oge ndị m na-ewere Sophia iwe na ọ nwụrụ. M mechaa, ya ewutewa m na m chere otú ahụ. A sị ka e kwuwe, ọ bụghị ya kpatara ọnwụ ya.”

Uche ịna-awagharị. E nwere ike inwe oge uche na-agaghị akpakọ onye mmadụ nwụnahụrụ ọnụ. Dị ka ihe atụ, onye mmadụ nwụnahụrụ nwere ike ịna-eche na o nwere ike ịhụ onye ya nwụrụ anwụ, metụ ya aka, ma ọ bụ nụ ihe ọ na-ekwu. O nwekwara ike isiri ya ike itinye uche ya n’ihe ọ na-eme ma ọ bụ icheta ihe. Tiina kwuru, sị: “Mgbe ụfọdụ, mụ na mmadụ nwere ike ịna-ekwu okwu, mụ achọpụta na obi m adịghị n’ihe anyị na-ekwu. Ọ ga na-awagharị n’ihe niile mere tupu Timo anwụọ na mgbe ọ nwụchara. Uche akpakọghị mmadụ ọnụ bụ nsogbu nke ya.”

Ha nwere ike ịna-achọ ịnọrọ onwe ha. Ịnọ ebe ndị mmadụ nọ mgbe ụfọdụ nwere ike ịna-agbakasị onye mmadụ nwụnahụrụ ahụ́. Kostas kwuru, sị: “Mụ na ndị di na nwunye nọrọ, ahụ́ anaghị eru m ala. Ọ na-adịkwa m otú ahụ ma mụ na ndị na-alụbeghị di ma ọ bụ nwunye nọrọ.” Yolanda, nwunye Ivan kwuru, sị: “Ahụ́ anaghị eru m ala ma ndị mụ na ha nọ na-akọ banyere nsogbu ha nwere, nke m chere na o nweghị ihe ha bụ ma e jiri ya tụnyere nke anyị, ma ọ bụkwanụ ha ana-akọ banyere otú ụmụ ha si na-eme nke ọma. Ọ bụ eziokwu na obi dị m ụtọ maka ihe ọma meere ha, ọ na-esiri m ike ige ihe ha na-ekwu. Mụ na di m ma na anyị kwesịrị iwere ụwa otú anyị si hụ ya, ma ihe ndị ha na-akọ na-agbakasị anyị ahụ́.”

Ọrịa. Afọ nwere ike ịmachi ha, ha atawa ahụ́ ma ọ bụ ghara ịna-ehi ụra nke ọma. Aaron kwuru ihe mere mgbe otu afọ gachara mpa ya nwụchara. O kwuru, sị: “Ụra anaghị ekwe m ohihi. O nwere otu oge ụra na-ejikarị apụ m n’anya n’abalị ọ bụla, mụ echewe gbasara mpa m.”

Alejandro chetara ọrịa ọ na-amaghị isi ya bidoro ịrịa ya. Ọ sịrị: “Dọkịta lere m ahụ́ ọtụtụ ugboro ma gwa m na o nweghị ihe na-eme m. Obi m gwara m na ọ ga-abụ uju m na-eru na-eme ka ọ dị m ka m̀ na-arịa ọrịa.” Ahụ́ ahụ na-enye ya nsogbu mechara kwụsị. Ma ọ dịkwa mma na Alejandro gara hụ dọkịta. Iru uju nwere ike ime ka ihe na-alụso ọrịa ọgụ n’ime ahụ́ anyị ghara ịna-arụ ọrụ nke ọma, mee ka ọrịa anyị na-arịa kakwuo njọ, ma ọ bụdị mee ka anyị rịawa ọrịa ọhụrụ.

O nwere ike ịna-esiri ha ike ime ihe ndị dị mkpa. Ivan kwuru, sị: “Mgbe Eric nwa anyị nwụchara, anyị mere ka ndị enyi anyị na ndị ikwu anyị mara. Ma anyị mekwara ka ọtụtụ ndị ọzọ mara gbasara ya, dị ka, onye ọ na-arụrụ ọrụ na onye nwe ụlọ ebe o bi. E nwekwara ọtụtụ akwụkwọ ikike anyị kwesịrị idejupụta. Anyị mechakwara gaa lee ihe ndị Eric nwere mara ihe ndị a ga-atụfu na ndị a ga-edowe. Ihe ndị a niile chọrọ mkpachara anya. Ma, isi nọ na-agba anyị ghara ghara, ike ana-agwụ anyị, obi anaghịkwa eru anyị ala.”

O nwere ndị nsogbu nke ha na-abịa mgbe ha ga-emecha mewazie ihe onye ahụ nwụrụ anwụ na-emebu. Ọ bụ ihe mere Tiina. O kwuru, sị: “Ọ bụ di m na-ahụ maka ihe niile gbasara ego anyị dị n’ụlọ akụ̀ na azụmahịa anyị. Ma ọ bụzi m na-eme ihe a niile, nke mere ka isi na-agba m ghara ghara karịa. M nọ na-ajụ onwe m ma m̀ ga-emetalikwa ihe a niile.”

Ihe ndị a anyị kọrọ n’elu nwere ike ime ka ị ghọta na ọ naghị adịrị ndị mmadụ nwụnahụrụ mfe. Nke bụ́ eziokwu bụ na ọnwụ na-agbawa obi, ma ịmara ihe ndị a nwere ike inyere ndị mmadụ nwụnahụrụ na nso nso a aka idi ya. Chetakwa na ọ bụghị onye ọ bụla ka ihe niile a a kọrọ na-eme onye na-eru uju na-eme. Ihe ọzọkwa bụ na ndị mmadụ nwụnahụrụ ịma na mmadụ iru uju abụghị ihe ọjọọ, ga-akasi ha obi.

M̀ GA-EMECHA NWEWA OBI ỤTỌ ỌZỌ?

Ihe ndị ị ga-atụ anya ya: Obi mgbawa mmadụ na-enwe ma onye ya nwụọ anaghị adịgide, ọ na-emecha belata. Ọ pụtaghị na “ọ na-apụ onye ahụ n’obi” kpamkpam ma ọ bụ na ọ ga-echefuzi onye ahụ nwụrụ anwụ. Ma, nwayọọ nwayọọ, ọ gaghịzi na-afụ onye ahụ ụfụ n’obi otú o sibu afụ ya. Ma, obi nwekwara ike ịjọwa onye ahụ njọ ma o cheta ihe ụfọdụ gbasara onye ahụ nwụrụ anwụ ma ọ bụkwanụ ma oge ha ji eme ememme ụfọdụ ruo. Ka oge na-aga, ụfọdụ ndị mmadụ nwụnahụrụ na-enweta onwe ha, nweekwa ike ịna-eme ihe ndị dịịrị ha n’ụbọchị. Ọ na-aka adịrị ha mfe idi ya ma ọ bụrụ na ndi enyi na ndị ikwu ha enyere ha aka, hanwa agbalịakwa ịchọ otú ha ga-esi edi ya.

Olee mgbe m ga-ediru ya? Ụfọdụ ndị na-enweta onwe ha ma otu ọnwa ma ọ bụ karịa gachaa. Ma, ọ na-ewe ụfọdụ ndị otu afọ ma ọ bụ abụọ tupu ha enwetawa onwe ha. O nwedịrị ndị nke ha nwere ike ịkarị otú ahụ. a Alejandro kwuru, sị: “Ọnwụ nwunye m gbawagidere m obi ruo ihe dị ka afọ atọ.”

Nweere onwe gị ndidi. Were ya nwayọọ, ejikwala onwe gị na-atụnyere ndị ọzọ. Marakwa na obi mgbawa ahụ agaghị adịgide. Ajụjụ bụzi: “Ò nwere ihe ndị ị ga-eme ka uju ị na-eru ugbu a belata ma ọ bụkwanụ mee ka ị ghara iru uju ruo ogologo oge?”

Mmadụ iru uju abụghị ihe ọjọọ

a E nwere ụfọdụ ndị na-erugide uju ya akpatara ha ọrịa. O nwere ike ịdị mkpa ka ha gaa hụ dọkịta.