Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

IHE GA-ENYERE GỊ AKA IBELATA NCHEGBU

Ị̀ Na-echegbukarị Onwe Gị?

Ị̀ Na-echegbukarị Onwe Gị?

“Onye ọ bụla na-enwetụ nchegbu, ma mụnwa na-echegbukarị onwe m. Ọ bụghị naanị otu ihe na-echegbu m. Ihe na-echegbu m dị ọtụtụ. Ụfọdụ n’ime ha bụ ndọga na ilekọta di m isi na-akpakọchaghịzi ọnụ kemgbe ọtụtụ afọ, ọ nọkwa ná nnukwu ọrịa.”​—Jill. a

“Nwunye m hapụrụ m, naanị m azụwazie ụmụ abụọ anyị mụtara. Otu onye ịzụ ụmụ adịghị mfe. M nọkwa n’elu ya, a chụọ m n’ọrụ, enweghịkwa m ego m ga-eji rụzie ụgbọala m. Amaghị m ihe m ga-eme eme. Ihe a niile bịara ju m isi. Ama m na mmadụ igbu onwe ya adịghị mma, n’ihi ya, m rịọrọ Chineke ka ọ hapụ m ka m nwụọ.”​—Barry.

Ò nwere mgbe nchegbu na-ezu gị ahụ́, ya adị gị otú ahụ ọ dị Jill na Barry? Ọ bụrụ otú ahụ, isiokwu ndị dị na Teta! a ga-akasi gị obi ma nyere gị aka. Ha kwuru ihe ndị na-akpata nchegbu, nsogbu ndị o nwere ike ịkpata, na ihe ndị ga-enyere anyị aka ibelata ya.

a Aha a kpọrọ ụfọdụ ndị n’isiokwu a abụghị ezigbo aha ha.