Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

5 Ò Nwere Mgbe Ahụhụ Ga-akwụsị?

5 Ò Nwere Mgbe Ahụhụ Ga-akwụsị?

Ihe Mere O Ji Dị Mkpa Ịmata Azịza Ya

Ọ bụrụ na o nwere ihe gosiri na ahụhụ ga-emecha kwụsị, o nwere ike ime ka otú anyị si ele ihe anya kakwuo mma, anyị agaghịkwa na-ata Chineke ụta.

Ihe Ị Ga-echebara Echiche

Ọtụtụ ndị ga-achọ ime ka ahụhụ ụwa a bie, mana ha agaghị emeli ya. Chegodị banyere ihe ndị a:

N’agbanyeghị ọganihu ụmụ mmadụ nwerela n’ihe gbasara ọgwụ . . .

  • Ọrịa obi ka bụ ihe kacha akpata ọnwụ ụmụ mmadụ.

  • Ọrịa kansa na-egbu ọtụtụ nde mmadụ kwa afọ.

  • N’akwụkwọ bụ́ Frontiers in Immunology, otu nwoke aha ya bụ Dr. David Bloom kwuru, sị: “Ọrịa ndị dị kemgbe ụwa, ndị nke ọhụrụ, na ndị nke na-eme ha nọtụ ha alọghachi, ka na eyi ụmụ mmadụ egwu.”

N’agbanyeghị na mba ụfọdụ bara ezigbo ọgaranya . . .

  • Kwa afọ, ọtụtụ nde ụmụaka na-anwụ, karịchaa, ụmụaka ndị bi ná mba ndị dara ogbenye.

  • Ọtụtụ ijeri mmadụ enweghị ebe dị mma a na-aga mposi ma ọ bụ ebe a na-ekpofu unyi.

  • Ọtụtụ narị nde mmadụ enweghị ebe ha ga-enweta ezigbo mmiri dị ọcha.

N’agbanyeghị na ọtụtụ ndị amatala gbasara ihe ndị ruuru mmadụ . . .

  • Otu akụkọ sị n’aka Òtù Mba Ụwa kwuru na a ka na-atụ mgbere mmadụ n’ọtụtụ obodo. Ọ ga-abụ na mba ndị hapụrụ ndị na-akpa arụ a amaghị na ụdị ihe ahụ na-eme n’obodo ha, ma ọ bụkwanụ ya abụrụ na ha enweghị ihe ndị ga-enyere ha aka ịkpara ndị a aka.

    MỤTAKWUO IHE NDỊ ỌZỌ

    Lee vidio bụ́ Gịnị Bụ Alaeze Chineke? Ọ dị na jw.org.

Ihe Baịbụl Kwuru

Ihe banyere anyị na-emetụ Chineke n’obi.

Ahụhụ anyị na-ata na nsogbu anyị nọ na ya na-ewute ya.

‘Chineke adịghị eleda mmekpa ahụ́ nke onye nọ n’ahụhụ anya, ọ dịghịkwa eleghara ya anya; o wepụghịkwa ihu ya n’ebe ọ nọ, mgbe o tikuru ya maka enyemaka, ọ nụrụ.’​ABỤ ỌMA 22:24.

“Na-atụkwasịnụ ya nchegbu unu niile, n’ihi na ihe banyere unu na-emetụ ya n’obi.”​1 PITA 5:7.

Ahụhụ agaghị adịgide ruo ebighị ebi.

Baịbụl kwere anyị nkwa na Chineke ga-emecha mezuo ihe o bu n’obi kee anyị.

“Chineke . . . ga-ehichapụkwa anya mmiri niile n’anya ha, ọnwụ agaghị adị ọzọ, iru uju ma ọ bụ mkpu ákwá ma ọ bụ ihe mgbu agaghịkwa adị ọzọ.”​MKPUGHE 21:​3, 4.

Chineke ga-ewepụ ihe niile na-akpatara ụmụ mmadụ ahụhụ.

Ọ ga-eji Alaeze ya mee ya. Baịbụl gosiri na Alaeze Chineke bụ ọchịchị dị adị.

“Chineke nke eluigwe ga-eme ka otu alaeze nke a na-agaghị ebibi ebibi malite ịchị. A gaghịkwa enyefe ndị ọ bụla ọzọ alaeze ahụ. . . . Ma ya onwe ya ga-adịru mgbe ebighị ebi.”​DANIEL 2:44.