Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Mata nke Bụ́ Eziokwu

Mata nke Bụ́ Eziokwu

Nsogbu Amaghị nke Bụ́ Eziokwu Nwere Ike Ịkpata

Ọtụtụ mgbe, ihe na-eme ka mmadụ kpọ onye ọzọ asị bụ ihe na-abụghị eziokwu ọ nụrụ gbasara onye ahụ. Legodị ihe atụ ndị a:

  • Ụfọdụ ndị na-ewe mmadụ n’ọrụ kwetara na ụmụ nwaanyị agaghị arụli ọrụ ndị chọrọ nkà ma ọ bụ ọrụ ndị siri ike.

  • Na Yurop oge ochie, e boro ndị Juu ebubo na ha tinyere nsí n’olulu mmiri dị iche iche nakwa na ha na-ekesa ọrịa. Mgbe ndị Nazi na-achị, e bokwara ha ebubo ọzọ. E kwuru na ọ bụ ha mere ka ihe isi ike dị na Jamanị. Ebubo abụọ a mere ka a kpọ ndị Juu ezigbo asị. Ruokwa taa, a ka nwere ndị kpọrọ ndị Juu asị n’ihi ebubo ndị ahụ.

  • Ọtụtụ ndị kweere na onye ọ bụla nwere nkwarụ bụ onye iwe.

Ndị kweere ụdị ụgha ndị a nwere ike inye ihe atụ ndị nwere ike ime ka o yie ka ihe ha na-ekwu ọ̀ bụ eziokwu. Ha na-echekwa na onye ọ bụla na-ekwetaghị na ha amaghị ihe.

Amaokwu Baịbụl Ga-enyere Gị Aka

Ọ dịghị mma ma ọ bụrụ na mkpụrụ obi enweghị ihe ọmụma.”—ILU 19:2.

Olee ihe amaokwu a na-akụziri anyị? Ọ bụrụ na mmadụ amaghị nke bụ́ eziokwu, o nwere ike ime ka o kweta ihe na-abụghị eziokwu. Anyị kwere ihe na-abụghị eziokwu gbasara ndị mmadụ, anyị ga-ewere ya na ha bụ ndị ajọ mmadụ.

Otú Ịma nke Bụ́ Eziokwu Si Enye Aka

Ọ bụrụ na anyị mata nke bụ́ eziokwu gbasara ndị mmadụ, anyị agaghị ekweta ihe ndị bụ́ ụgha ndị ọzọ nwere ike ịna-ekwu gbasara ha. Ozugbo anyị chọpụtara na ihe anyị nụrụ gbasara otu agbụrụ abụghị eziokwu, o nwere ike ime ka anyị jụọ onwe anyị ma ihe anyị kweere gbasara agbụrụ ndị ọzọ ọ̀ bụ eziokwu.

Ihe I Nwere Ike Ime

  • E nwere ike inwe otu agbụrụ ndị mmadụ na-ekwu na ha nwere àgwà na-adịghị mma. Ma, cheta na ọ bụghị mmdụ niile si n’agbụrụ ndị ahụ nwere àgwà ọjọọ ahụ.

  • Cheta na e nwere ike ị machaghị ihe niile gbasara ndị ọzọ.

  • Gbalịa si n’ebe a tụkwasịrị obi chọpụta nke bụ́ eziokwu.