Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Amamihe nke Ga-eme Ka Ị Na-enwe Obi Ụtọ

Amamihe nke Ga-eme Ka Ị Na-enwe Obi Ụtọ

“Ọ bụ eziokwu na ihe ọjọọ ndị dị n’ụwa a, dị ka agha, ịda ogbenye, ọrịa, na mmegbu a na-emegbu ụmụaka na-ewute m, ma ugbu a, enwere m olileanya.”​—RANI. *

Rani malitere inwe ezigbo obi ụtọ mgbe ọ mụtara banyere Onye na-eme ka mmadụ nwee amamihe, ya bụ, Chineke, Onye Pụrụ Ime Ihe Niile. Ka ị na-agụ isiokwu ndị dị n’akwụkwọ a, chọpụta otú ihe Chineke na-akụziri anyị ga-esi nyere gị aka . . .

  • ka obi ụtọ dịrị n’ezinụlọ gị

  • ka gị na ndị ọzọ na-adị n’udo

  • ka ihe i nwere na-eju gị afọ

  • ka ị mata ihe mere anyị ji ata ahụhụ ma na-anwụ anwụ

  • ka i nwee olileanya na ihe ga-adị mma n’ọdịnihu

  • ka ị mata Onye kere anyị ma bịaruo ya nso

Ị ga-amatakwa na Chineke anaghị enye ndị ụfọdụ amamihe ya ma hapụ ndị ọzọ, kama ọ na-enye ya ndị niile chọrọ inweta ya.

^ par. 2 Aha a kpọrọ ụfọdụ ndị n’akwụkwọ a abụghị ezigbo aha ha.