Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Amamihe nke Ga-eme Ka Obi Ụtọ Dị n’Ezinụlọ

Amamihe nke Ga-eme Ka Obi Ụtọ Dị n’Ezinụlọ

Alụmdi na nwunye na ụmụ bụ ọmarịcha onyinye ndị si n’aka Chineke anyị. Ọ chọrọ ka anyị na-enwe obi ụtọ n’ezinụlọ anyị. N’otu akwụkwọ dị nsọ e dere n’oge ochie, ọ gwara anyị ihe ga-eme ka ezinụlọ anyị na-enwekwu obi ụtọ ma ka mma. Legodị ụfọdụ n’ime ihe ndị ahụ ọ gwara anyị.

Ndị Bụ́ Di, Hụnụ Nwunye Unu n’Anya

‘Ndị bụ́ di kwesịrị ịhụ nwunye ha n’anya otú ha si hụ ahụ́ nke ha n’anya. Onye hụrụ nwunye ya n’anya hụrụ onwe ya n’anya. N’ihi na ọ dịghị mmadụ ọ bụla kpọtụrụla ahụ́ ya asị, kama ọ na-azụ ahụ́ ya, na-elekọtakwa ya.’​—NDỊ EFESỌS 5:​28, 29.

Di bụ isi nke ezinụlọ. (Ndị Efesọs 5:23) Ma, ezigbo di ekwesịghị ịna-eme ka onye ọchịchị aka ike. O kwesịrị ịhụ nwunye ya n’anya ma na-egboro ya mkpa ya niile. O kwesịkwara ịna-agbalị na-eme ihe na-amasị nwunye ya, ọ bụghị ịna-esi ọnwụ na a ga-emerịrị ihe ọ chọrọ mgbe niile. (Ndị Filipaị 2:4) Ọ ga na-akọrọ nwunye ya obi ya, na-egekwa ya ntị. Ọ gaghị ‘na-ewesa ya iwe,’ na-eti ya ihe, ma ọ bụ na-agwa ya okwu ga-agbawa ya obi.​—Ndị Kọlọsi 3:19.

Ndị Bụ́ Nwunye, Na-akwanyerenụ Di Unu Ùgwù

‘Nwunye kwesịrị ịna-akwanyere di ya ezigbo ùgwù.’​—NDỊ EFESỌS 5:33.

Ọ bụrụ na nwaanyị ana-akwanyere di ya ùgwù ma na-akwado mkpebi ya, ọ ga-eme ka udo dịrị n’ezinụlọ. Di ya mejọọ ihe, ọ naghị eleda ya anya. Ọ na-anọgide na-adị nwayọọ ma na-akwanyere ya ùgwù. (1 Pita 3:4) Ọ bụrụ na o nwere ihe ọ chọrọ ịgwa di ya, ọ na-ahọrọ oge dị mma ọ ga-eji ekwu ya, jirikwa nkwanye ùgwù kwuo ya.​—Ekliziastis 3:7.

Ahapụla Di Gị ma Ọ Bụ Nwunye Gị Gbawa n’Èzí

“Ọ bụ ya mere nwoke ga-eji . . . rapara n’ahụ́ nwunye ya, ha abụrụzie otu anụ ahụ́.”​—JENESIS 2:24.

Nwoke na nwaanyị lụọ, ha na-aghọ otu ezinụlọ. N’ihi ya, di na nwunye kwesịrị ịgba mbọ mee ka alụmdi na nwunye ha sie ike. Otú ha ga-esi eme ya bụ ịna-ekwurịta okwu nke ọma na ịna-emere ibe ha ihe ọma. Ha ekwesịghịkwa iso onye na-abụghị di ha ma ọ bụ nwunye ha nwee mmekọahụ. Ịgba n’èzí na-akpata obi mgbawa. Ọ na-eme ka a gharazie ịtụkwasị mmadụ obi. Ọ na-aghasasịkwa ezinụlọ.​—Ndị Hibru 13:4.

Ndị Nne na Nna, Na-azụnụ Ụmụ Unu

“Zụọ nwata ka o soro ụzọ o kwesịrị iso. Ọ bụrụgodị na o mee okenye, ọ gaghị ahapụ ụzọ ahụ.”​—ILU 22:6.

Chineke nyere ndị nne na nna ọrụ ịzụ ụmụ ha. Otu ụzọ ha ga-esi eme ya bụ ịna-azụ ha ka ha na-akpa àgwà ọma, nakwa hanwa ịna-akpa àgwà ọma ka ụmụ ha na-amụta ihe n’aka ha. (Diuterọnọmi 6:​6, 7) Ọ bụrụ na nwatakịrị akpaa àgwà ọjọọ, nne ma ọ bụ nna maara ihe anaghị eweso ya oké iwe. Kama, ọ na-agbalị bụrụ “onye na-anụ ihe ngwa ngwa, onye na-anaghị ekwu okwu ngwa ngwa, na onye na-anaghị ewe iwe ngwa ngwa.” (Jems 1:19) Ọ bụrụ na nne ma ọ bụ nna ahụ ekpebie na o kwesịrị ịdọ nwa ahụ aka ná ntị, o kwesịrị iji ịhụnanya mee ya, ọ bụghị n’iwe.

Ndị Bụ́ Ụmụ, Na-eruberenụ Ndị Mụrụ Unu Isi

“Ụmụ, na-eruberenụ ndị mụrụ unu isi . . . ‘Sọpụrụ nne gị na nna gị.’”​—NDỊ EFESỌS 6:​1, 2.

Ụmụ kwesịrị ịna-erubere ndị mụrụ ha isi ma na-akwanyere ha ezigbo ùgwù. Ọ bụrụ na ụmụ ana-erubere ndị mụrụ ha isi, ha na-eme ka ọṅụ na udo dị n’ezinụlọ. Otú ụmụ ndị torola eto ga-esi na-akwanyere ndị mụrụ ha ùgwù bụ ịna-elekọta ha anya nke ọma. Otu ụzọ ha ga-esi eme ya bụ ịna-enyere ha aka ilekọta ebe ha bi, ma ọ bụkwanụ ịna-achọtụrụ ha ego.​—1 Timoti 5:​3, 4.