Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Olee Nsogbu Ekwentị Nwere Ike Ịkpatara Gị na Ndị Enyi Gị?

Olee Nsogbu Ekwentị Nwere Ike Ịkpatara Gị na Ndị Enyi Gị?

Isi n’ekwentị na iimel ezirita ozi ma ọ bụ isi n’Ịntanet akparịta ụka emeela ka ọ dị mfe mmadụ na ibe ya ịkparịta ụka ọ bụrụgodị na ha nọ n’ebe dị iche iche n’ụwa. Ihe ndị a e ji akparịta ụka na-abara ndị ji ha eme ihe otú dị mma uru.

Ma, ọ bụrụ na ọ bụ naanị ihe ndị a ka mmadụ na ndị enyi ya na-eji akparịta ụka, o nwere ike ime ka onye ahụ . . .

  • ghara ịna-enwere ndị enyi ya ọmịiko.

  • na-eche na o nweghị uru ọ bara.

  • na-echekarị gbasara onwe ya kama iche gbasara ndị ọzọ.

IHE NDỊ I KWESỊRỊ ỊMA

INWE ỌMỊIKO

Ihe ga-enyere mmadụ aka inwere onye ọzọ ọmịiko bụ iwepụta oge, wetuo obi ala chee banyere onye ahụ. Ma, ime ihe a ga-esi ike ma ọ bụrụ na ihe anyị ji oge anyị niile na-eme bụ izipụ ozi na ịgụ ozi ndị ọzọ zitere nakwa ile ihe ndị ha tinyere n’Ịntanet.

Ọ bụrụ na i nwere ọtụtụ ozi ị ga-azaghachi, o nwere ike isiri gị ike ịzaghachi ozi ezigbo enyi gị ziteere gị. Ihe ga-abụzi mkpa gị bụ ịzaghachi ozi niile e ziteere gị. O nwere ike ị gaghịzi ama na o nwere enyi gị chọrọ ka i nyere ya aka.

IHE Ị GA-ECHEBARA ECHICHE: Olee otú ị ga-esi gosi na ihe banyere ndị enyi gị ‘na-emetụ gị n’obi’ mgbe gị na ha na-akparịta ụka n’Ịntanet?​—1 PITA 3:8.

MMADỤ ICHE NA O NWEGHỊ URU Ọ BARA

Otu nchọpụta e mere gosiri na ọtụtụ ndị anaghị enwe obi ụtọ ma ha lechaa ihe ndị ọzọ tinyere n’ebe a na-akparịta ụka n’Ịntanet. Ndị mere nchọpụta ahụ kwuru na mmadụ jiri oge ya niile lechaa foto na ihe ndị ọzọ ndị mmadụ tinyere, na o nwere ike “ịdị onye ahụ ka o nweghị ihe bara uru o ji oge ahụ mee.”

Ihe ọzọ bụkwa na mmadụ lechaa foto ndị ọzọ tinyere, o nwere ike ime ka o jiri onwe ya tụnyewara ndị ahụ. O nwere ike ịdị onye ahụ ka ihe ọ̀ na-agaziri ndị ọzọ, mana ọ naghị agaziri yanwa.

IHE Ị GA-ECHEBARA ECHICHE: Ị nọrọ n’ebe a na-akparịta ụka n’Ịntanet, olee otú ị ga-esi zere iji onwe gị na-atụnyere ndị ọzọ?​—NDỊ GALESHIA 6:4.

MMADỤ ỊNA-ECHEKARỊ BANYERE ONWE YA

Otu onye nkụzi kwuru na ihe ụfọdụ ụmụ akwụkwọ ya na-echekarị banyere ndị enyi ha bụ ihe ndị enyi ha ga-emere ha. * Ihe ụmụ akwụkwọ ndị a na-eche bụ naanị ihe ha ga-erite n’aka ndị enyi ha. Ihe a nwere ike ime ka mmadụ na-ele ndị enyi ya anya ka ngwá ọrụ nkịtị. O jiri ha rụchaa ọrụ, ya atọgbọ ha.

IHE Ị GA-ECHEBARA ECHICHE: Ihe ndị ị na-etinye n’Ịntanet hà na-egosi na ị chọrọ ịka ndị ọzọ ma ọ bụ na ị na-echekarị gbasara onwe gị?​—NDỊ GALESHIA 5:26.

IHE I NWERE IKE IME

LEBA ANYA N’OTÚ I SI APỊ EKWENTỊ NA IHE NDỊ YIRI YA

Ọ bụrụ na ekwentị gị bụ odibo gị kama ịbụ ọga gị, ọ ga-enyere gị aka iso ndị enyi gị na-akparịta ụka, gị na ha adịkwuokwa ná mma.

AMAOKWU BAỊBỤL GA-ENYERE GỊ AKA: ‘Ịhụnanya anaghị achọ ihe ga-abara naanị ya uru.’​—1 NDỊ KỌRỊNT 13:​4, 5.

Họrọ ihe ndị dị n’okpuru ebe a ị ga-achọ ime, ma ọ bụkwanụ gị edee ihe ndị gịnwa ga-achọ ime.

  • Gbalịa ka gị na ndị mmadụ na-ekwurịta okwu ihu na ihu (kama ịna-ezigara ha ozi naanị n’ekwentị ma ọ bụ n’iimel)

  • Dowe ekwentị gị ebe ọzọ (ma ọ bụ gị agbanye ya otú ọ na-agaghị eme mkpọtụ) ma gị na ndị ọzọ na-akparịta ụka

  • Belata oge i ji ele ihe ndị mmadụ tinyere n’ebe a na-akparịta ụka n’Ịntanet

  • Mụtakwuo ịna-ege ndị ọzọ ntị nke ọma

  • Kpọtụrụ enyi gị ihe na-esiri ike

^ par. 17 E kwuru ihe a n’akwụkwọ aha ya bụ Reclaiming Conversation.