Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Olee Nsogbu Ekwentị Nwere Ike Ịkpatara Gịnwa n’Onwe Gị?

Olee Nsogbu Ekwentị Nwere Ike Ịkpatara Gịnwa n’Onwe Gị?

Ndị mmadụ na-achọ ịmụta ihe ọhụrụ kwa ụbọchị. O nwere ike ịbụ ihe ga-abara ha uru n’ụlọ akwụkwọ, n’ọrụ ha, ma ọ bụ n’ihe ọ bụla ọzọ. Ekwentị na ihe ndị yiri ya nwere ike inyere ha aka. Kemgbe ụwa, o nwetụbeghị mgbe ọ dị mfe mmadụ ịnọ n’ụlọ ya ma ọ bụdị n’oche ya mụta ihe ọ bụla ọ chọrọ karịa ugbu a.

Ma, ọtụtụ ndị na-apịkarị ekwentị ha ma ọ bụ ihe ndị yiri ya achọpụtala na . . .

  • ọ na-esiri ha ike ime ka uche ha dịrị n’ihe ha na-agụ.

  • ọ na-esiri ha ike ịhapụ ịna-eme ọtụtụ ihe otu mgbe.

  • obi na-ajọkarị ha njọ ma ha nọrọ naanị ha.

IHE NDỊ I KWESỊRỊ ỊMA

ỊGỤ IHE

Ndị ịpị ekwentị riri ahụ́ na-agụkarị ihe elu elu kama iwetu obi ala gụọ ihe si n’isi ruo ná ngwụcha ka ha ghọta ihe a na-ekwu.

Mmadụ ịgụ ihe elu elu adịghị njọ ma ọ bụrụ na onye ahụ chọrọ ịmata azịza ihe ozugbo ozugbo. Ma, isi otú a agụ ihe adịghị mma ma ọ bụrụ na onye ahụ chọrọ ịghọta ihe niile ọ na-agụ nke ọma.

IHE Ị GA-ECHEBARA ECHICHE: Ọ̀ na-adịrị gị mfe ịgụ ihe toro ogologo? Olee otú ịgụ ihe toro ogologo ga-esi nyere gị aka ịmụta ihe?​—ILU 18:15.

UCHE GỊ ỊDỊ N’IHE Ị NA-EME

Ụfọdụ ndị chere na ekwentị na ihe ndị yiri ya na-enyere ha aka ime ihe abụọ otu mgbe, dị ka ịna-ezigara ndị enyi ha ozi mgbe ha na-amụ ihe. Mana, ebe ọ bụ na ha na-eme ihe abụọ otu mgbe, o nwere ike ime ka uche ha ghara ịdị na nke ọ bụla, ya emezie o nweghị nke ha ga-eme nke ọma na ya.

Ọ bụ eziokwu na mmadụ itinye uche ya n’ihe ọ na-eme anaghị adịcha mfe, ma ọ ga-enyere onye ahụ aka ịmụta ihe. Otu nwatakịrị nwaanyị aha ya bụ Grace kwuru, sị: “Ọ na-eme ka mmadụ ghara ịna-emejọkarị ihe, meekwa ka onye ahụ ghara iji ọtụtụ ihe kpojuo onwe ya isi. Amụtala m na ọ ka mma itinye uche m n’otu ihe karịa ịna-eme ọtụtụ ihe otu mgbe.”

IHE Ị GA-ECHEBARA ECHICHE: Ịpị ekwentị mgbe ị na-amụ ihe ọ̀ na-eme ka ị ghara ịghọtacha ihe ị na-amụ na icheta ihe ị mụrụ?​—ILU 17:24.

MGBE Ị NỌ NAANỊ GỊ

Ahụ́ anaghị eru ndị ụfọdụ ala ma ha nọrọ naanị ha n’ebe dị jụụ. Ha na-ewere ekwentị ha pịwa ka obi ghara ịna-ajọ ha njọ. Otu nwaanyị aha ya bụ Olivia kwuru, sị: “Obi na-ebido jọwa m njọ ma m nọọ nkeji iri na ise n’apịghị ekwentị m ma ọ bụ tablet m ma ọ bụkwanụ n’agbanyeghị tiivi.”

Ma, oge mmadụ nọ naanị ya bụ oge magburu onwe ya onye ahụ nwere ike iji chee echiche nke ọma. Ọ ga-enyere onye ahụ aka ịmụta ihe ọ na-amụ, ma onye ahụ ọ̀ bụ onye na-eto eto ma ọ̀ bụ dimkpa.

IHE Ị GA-ECHEBARA ECHICHE: Ị̀ na-eji oge ndị ị nọ naanị gị eche echiche nke ọma?​—1 TIMOTI 4:15.

IHE I NWERE IKE IME

LEBA ANYA N’OTÚ I SI APỊ EKWENTỊ NA IHE NDỊ YIRI YA

Olee otú ekwentị na ihe ndị yiri ya ga-esi nyere gị aka ịna-echebara ihe ị na-amụ echiche nke ọma? Ma, olee otú ha nwere ike isi mee ka uche gị ghara ịdị n’ihe ị na-amụ?

AMAOKWU BAỊBỤL GA-ENYERE GỊ AKA: “Jidesie ezigbo amamihe aka ike, na-echebakwara ihe echiche nke ọma.”​—ILU 3:21.