Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

N’ỤWA A NSOGBU JURU

2 | Ghara Ịna-emefusị Ego Gị

2 | Ghara Ịna-emefusị Ego Gị

IHE MERE O JI DỊ MKPA

Ọtụtụ ndị na-arụsi ọrụ ike kwa ụbọchị iji nweta naanị ihe ndị dị ha oké mkpa. Ma, ọ dị mwute na ụwa a nsogbu juru na-eme ka ịkpata ihe afọ ga-eri na-esikwu ike. Gịnị mere o ji dị otú ahụ?

  • E nwee ọgba aghara n’obodo, ihe niile na-arị elu ọjị, ma ihe oriri ma ụgwọ ụlọ.

  • Nsogbu nwere ike ime ka o sikwuo ike inweta ọrụ ma ọ bụ ka ụgwọ a na-akwụ ndị ọrụ belata.

  • Ọdachi nwere ike imebi ma ọ bụ laa ahịa, ụlọ ọrụ, ụlọ, ma ọ bụ ihe ndị ọzọ ndị mmadụ nwere n’iyi, mezie ka ọtụtụ ndị daa ogbenye.

Ihe I Kwesịrị Ịma

  • Ọ bụrụ na ị naghị emefusị ego gị, ọ ga-adịrị gị mfe ịma ihe i kwesịrị iji ego nke i nwere enwe na-eme n’oge nsogbu.

  • Na mmadụ nwere ego taa apụtaghị na ọ ga-enwe echi. E nwere ike ego mmadụ na-akpata na nke o nwere n’ụlọ akụ̀ agaghịzi azụtali ezigbo ihe. E nwekwara ike akụ̀ ndị o nwere agaghịzi adata ezigbo ego.

  • E nwekwara ihe ndị mmadụ na-agaghị ejili ego zụta, dị ka obi ụtọ na ịdị n’otu n’ezinụlọ.

Ihe Ndị I Nwere Ike Ime Ugbu A

Baịbụl sịrị: “Ihe oriri na uwe anyị nwere kwesịrị iju anyị afọ.”​—1 Timoti 6:8.

Ihe anyị nwere iju anyị afọ pụtara na ọ bụghị ihe ọ bụla gụrụ anyị ka anyị ga-achọwa. Obi ga-adịkwa anyị ụtọ ma anyị nwetahaala ihe ndị dị anyị mkpa n’ụbọchị, karịchaa, n’oge anyị na-enwechaghị ego na-ezuru anyị.

Onye ihe o nwere juru afọ kwesịrị ịmụta iselata aka n’otú o si azụ ihe. Ọ bụrụ na ị na-emefu ego karịrị ego ole ị na-akpata, nsogbu gị ga-aka njọ.