Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

NKEBI NKE 1

Site n’Okike Ihe Ruo n’Iju Mmiri

Site n’Okike Ihe Ruo n’Iju Mmiri

Ebee ka eluigwe na ala si pụta? Olee otú anyanwụ, ọnwa, kpakpando na ọtụtụ ihe ndị dị n’ụwa si bịa dịrị? Bible na-enye azịza bụ́ eziokwu mgbe ọ sịrị na ọ bụ Chineke kere ha. N’ihi ya, akwụkwọ anyị a na-amalite site n’ịkọ akụkọ Bible banyere okike ihe.

Anyị mụtara na ihe mbụ Chineke kere bụ ndị mmụọ yitụrụ ya. Ha bụ ndị mmụọ ozi. Ma e kere ụwa maka ụmụ mmadụ dị ka anyị. Chineke kere nwoke na nwaanyị, ndị a kpọrọ Adam na Iv, wee debe ha n’ogige mara mma. Ma ha nupụụrụ Chineke isi, ha wee tụfuo ohere nke ịdịrị ndụ gaa n’ihu.

Afọ niile ahụ, site mgbe e kere Adam ruo n’oké Iju Mmiri ahụ, dị otu puku afọ, narị afọ isii na iri ise na isii. N’oge ahụ, ọtụtụ ndị ajọ mmadụ bi n’ụwa. N’eluigwe, e nwere ndị bụ́ mmụọ a na-adịghị ahụ anya, Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya. N’ụwa, e nwere Ken na ọtụtụ ndị ọjọọ ndị ọzọ, tinyere ndị dike pụrụ iche. Ma e nwekwara ndị ezi mmadụ n’ụwa—Ebel, Ịnọk, na Noa. Ná NKEBI NKE 1 nke a, anyị ga-agụ banyere ndị a niile na banyere ihe ndị merenụ.

 

NÁ NKEBI A

AKỤKỌ NKE 1

Chineke Amalite Ike Ihe

Akụkọ a kọrọ na Jenesis gbasara otú e si kee ihe dị ụtọ ọgụgụ ma dịrịkwa mfe nghọta, ụmụaka na-aghọtadị ya.

AKỤKỌ NKE 2

Ogige nke Mara Mma

Dị ka a kọrọ na Jenesis, Chineke kere ogige Iden ka ọ bụrụ ebe pụrụ nnọọ iche. Chineke chọrọ ka ụwa niile dịrị ka ogige a mara mma.

AKỤKỌ NKE 3

Nwoke Mbụ na Nwaanyị Mbụ

Chineke kere Adam na Iv ma debe ha n’ogige Iden ka ha biri ebe ahụ. Ha abụọ ghọrọ di na nwunye mbụ.

AKỤKỌ NKE 4

Ihe Mere E Ji Chụpụ Ha n’Ebe Obibi Ha

Akwụkwọ Baịbụl bụ́ Jenesis gwara anyị otú paradaịs mbụ ahụ si funahụ anyị.

AKỤKỌ NKE 5

Ndụ Ahụhụ Amalite

Mgbe a chụpụrụ Adam na Iv n’ogige Iden, ha nwere ọtụtụ nsogbu. Ọ bụrụ na ha rubeere Chineke isi, ma ha ma ụmụ ha gaara na-enwe obi ụtọ.

AKỤKỌ NKE 6

Ezi Nwa na Ajọ Nwa

Akụkọ Ken na Ebel, bụ́ nke a kọrọ na Jenesis, na-akụziri anyị ụdị mmadụ anyị kwesịrị ịbụ na ụdị àgwà ndị anyị kwesịrị ịkwụsị ịkpa tupu ihe emebie.

AKỤKỌ NKE 7

Nwoke nke Nwere Obi Ike

Ihe Inọk mere na-egosi anyị na mmadụ nwere ike ịna-eme ihe dị mma ọ sọgodị ya ya bụrụ na ndị niile nọ ya nso na-eme ihe na-adịghị mma.

AKỤKỌ NKE 8

Ndị Dike Nọ n’Ụwa

Jenesis isi isii kọrọ akụkọ gbasara ndị dike na-emerụ ndị mmadụ ahụ́. Ndị dike ahụ, ma ọ bụ ndị Nefilim, bụ ụmụ ndị mmụọ ozi nupụụrụ Chineke isi, ndị mmụọ ozi ahụ hapụrụ eluigwe bịa n’ụwa biri ka mmadụ.

AKỤKỌ NKE 9

Noa Ewuo Ụgbọ

Noa na ndị ezinụlọ ya anwụghị n’Iju Mmiri ahụ n’ihi na ha gere Chineke ntị n’agbanyeghị na ndị ọzọ egeghị ntị.

AKỤKỌ NKE 10

Oké Iju Mmiri Ahụ

Ndị mmadụ chịrị ọchị mgbe Noa na-agwa ha na nnukwu mmiri ga-ezo. Ma mgbe mmiri bidoro izo, ọchị gwụrụ ha n’ezé. Mụta otú ụgbọ Noa si zọpụta ma ya, ma ndị ezinụlọ ya nakwa ọtụtụ ụmụ anụmanụ.