Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

AKỤKỌ NKE 7

Nwoke nke Nwere Obi Ike

Nwoke nke Nwere Obi Ike

KA ỌNỤ ọgụgụ ndị mmadụ na-aba ụba n’ụwa, ihe ka ọtụtụ n’ime ha mere ihe ọjọọ dị ka Ken. Ma ọ dị otu nwoke pụrụ iche. Ọ bụ nwoke nke a a na-akpọ Inọk. Inọk bụ nwoke nke nwere obi ike. Ndị nọ ya gburugburu nọ na-eme ihe ndị jọrọ nnọọ njọ, ma Inọk nọgidere na-efe Chineke.

Ị̀ ma ihe mere ndị oge ahụ ji mee ọtụtụ ihe ọjọọ? Chee echiche banyere nke a: Ònye mere ka Adam na Iv nupụrụ Chineke isi wee rie mkpụrụ osisi Chineke sịrị ha erila? Ọ bụ otu ajọ mmụọ ozi. Bible na-akpọ ya Setan. Ọ chọkwara ime ka mmadụ niile bụrụ ndị ọjọọ.

Otu ụbọchị, Jehova Chineke mere ka Inọk gwa ụmụ mmadụ ihe ha na-achọghị ịnụ. Lee ihe ọ gwara ha: ‘Otu ụbọchị, Chineke ga-ebibi ndị ọjọọ niile.’ Eleghị anya, ha were oké iwe mgbe ha nụrụ nke a. Ọ pụrụ ọbụna ịbụ na ha nwara igbu Inọk. N’ihi ya, ọ dị Inọk mkpa inwe obi ike iji gwa ha ihe Chineke gaje ime.

Chineke ekweghị ka Inọk dị ogologo ndụ n’etiti ndị ọjọọ ahụ. Inọk dịrị ndụ nanị narị afọ atọ na iri afọ isii na ise. Gịnị mere anyị ji sị “nanị narị afọ atọ na iri afọ isii na ise”? Ọ bụ n’ihi na ndị oge ahụ dị ike karịa ndị oge a, ha dịkwara ogologo ndụ karịa ndị oge a. Leenụ, Metusela nwa Inọk dịrị ndụ ruo narị afọ itoolu, iri afọ isii na itoolu!

Mgbe Inọk nwụrụ, ụmụ mmadụ jọrọ njọ gabiga ókè. Bible na-ekwu na ‘ihe niile nke ha na-eche n’echiche bụ nanị ihe ọjọọ mgbe niile,’ nakwa na ‘ụwa jupụtara n’ime ihe ike.’

Ị̀ ma otu n’ime ihe ndị mere nnukwu nsogbu ji jupụta n’ụwa n’oge ahụ? Ọ bụ n’ihi na Setan nwere ụzọ ọhụrụ o si eme ka ndị mmadụ na-eme ihe ọjọọ. Anyị ga-amụ banyere nke a n’akụkọ na-esonụ.