Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

AKỤKỌ NKE 8

Ndị Dike Nọ n’Ụwa

Ndị Dike Nọ n’Ụwa

Ọ BỤRỤ na onye toro ogologo, nke isi ya na-emetụ na silin na-abịakwute gị, gịnị ka ị ga-eche? Onye ahụ ga-abụ dike! Ọ dị mgbe e nwere ndị dike n’ụwa. Bible na-egosi na ọ bụ ndị mmụọ ozi si n’eluigwe bụ nna ha. Ma olee otú nke a si mee?

Cheta na ajọ mmụọ ozi ahụ bụ́ Setan nọ nnọọ na-akpata nsogbu. Ọ nwara ọbụna ime ka ndị mmụọ ozi Chineke mewa ihe ọjọọ. Ka oge na-aga, ụfọdụ n’ime ha gere Setan ntị. Ha kwụsịrị ọrụ Chineke nyere ha ịrụ n’eluigwe. Ha bịara n’ụwa ma nwoghara ahụ́ mmadụ. Ị̀ ma ihe kpatara ya?

Bible na-asị na ụmụ Chineke ndị a hụrụ ndị inyom mara mma n’ụwa, wee chọọ ka ha na ha biri. N’ihi ya, ha bịara n’ụwa lụrụ ha. Bible na-ekwu na nke a bụ ihe ọjọọ, n’ihi na Chineke kere ndị mmụọ ozi ibi n’eluigwe.

Mgbe ndị mmụọ ozi ahụ na ndị nwunye ha mụrụ ụmụ, ụmụ ha ahụ gbapụrụ iche. Eleghị anya, ná mmalite ha agbapụghị iche. Ma ha nọgidere na-eto ma na-agba dimkpa n’ike n’ike, na-esikwa ike karị, ruo mgbe ha ghọrọ ndị dike.

Ndị dike ahụ dị njọ. Ma ebe ọ bụ na ha gbara nnọọ dimkpa ma dị ike, ha merụrụ ndị mmadụ ahụ́. Ha nwara ịmanye mmadụ niile ịdị njọ dị ka ha.

Ịnọk anwụwo, ma e nwere otu onye bụ́ ezi mmadụ n’ụwa mgbe ahụ. Aha nwoke ahụ bụ Noa. Ọ na-eme ihe Chineke chọrọ ka o mee mgbe niile.

Chineke gwara Noa otu ụbọchị na oge eruwo mgbe ya ga-ala ndị ọjọọ niile n’iyi. Ma Chineke ga-azọpụta Noa na ezinụlọ ya na ọtụtụ anụmanụ. Ka anyị lee ụzọ Chineke si mee nke a.