Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

AKỤKỌ NKE 9

Noa Ewuo Ụgbọ

Noa Ewuo Ụgbọ

NOA nwere otu nwunye na ụmụ nwoke atọ. Aha ụmụ ya bụ Shem, Ham na Jefet. Nwa ya nke ọ bụla nwekwara nwunye. N’ihi ya, e nwere mmadụ asatọ n’ezinụlọ Noa.

Chineke mere ka Noa mee ihe dị ịtụnanya. Ọ gwara ya ka o wuo otu ụgbọ buru ibu. Ọ ha ka ụgbọ mmiri, ma o yiri ogologo nnukwu igbe. Chineke wee, sị: ‘Mee ka ọ dị okpukpu abụọ n’ịdị elu, ị ga-ekebisịkwa ime ya ekebisị.’ Nkebi ndị ahụ bụ maka Noa na ezinụlọ ya na anụmanụ na nri ndị ha ga-eri.

Chineke gwakwara Noa ka o dozie ụgbọ ahụ ka mmiri ghara ịba n’ime ya. Chineke sịrị ya: ‘M ga-eweta oké iju mmiri ibibi ụwa niile. Onye na-anọghị n’ime ụgbọ ahụ ga-anwụ.’

Noa na ụmụ ya gere Jehova ntị, wee malite iwu ụgbọ ahụ. Ma ndị ọzọ chịrị ha ọchị. Ha nọgidere na-eme ihe ọjọọ ha na-eme. Ha ekweghị ihe Noa kwuru mgbe ọ gwara ha ihe Chineke gaje ime.

Owuwu ụgbọ ahụ were ogologo oge, n’ihi na o buru ezigbo ibu. E wusịrị ya mgbe ọtụtụ afọ gasịrị. Chineke gwaziri Noa ka ọ kpọba anụ niile n’ime ụgbọ ahụ. Chineke sịrị ka a kpọba ụdị anụ ụfọdụ abụọ abụọ, ma oké ma nne. Ma, ọ sịrị ka a kpọba ụdị anụ ndị ọzọ asaa asaa. Chineke gwakwara Noa ka ọ nwụbata nnụnụ dị iche iche. Noa mere nnọọ ihe Chineke kwuru.

E mesịa, Noa na ezinụlọ ya banyere n’ụgbọ ahụ. Chineke wee mechie ụgbọ ahụ. Noa na ezinụlọ ya nọ n’ime ya na-echere. Were ya na i so ha nọrọ n’ime ụgbọ ahụ wee na-echere. Iju mmiri ahụ ọ̀ ga-abịa dị ka Chineke kwuru?