Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

NKEBI NKE 2

Site n’Iju Mmiri ruo ná Mgbapụta n’Ijipt

Site n’Iju Mmiri ruo ná Mgbapụta n’Ijipt

Ọ bụ naanị mmadụ asatọ lanarịrị Iju Mmiri ahụ, ma ka oge na-aga, ha mụbara ruo ọtụtụ puku. Narị afọ atọ na iri afọ ise na abụọ mgbe Iju Mmiri ahụ gasịrị, a mụrụ Ebreham. Anyị ga-ahụ otú Chineke si mezuo nkwa ya site n’inye Ebreham nwa aha ya bụ́ Aịzik. Anyị ga-ahụkwa na n’ime ụmụ abụọ Aịzik mụrụ, Chineke họọrọ Jekọb.

Jekọb nwere ezinụlọ buru ibu nke ụmụ ndị ikom iri na abụọ na ụfọdụ ụmụ ndị inyom mejupụtara. Ụmụ ndị ikom iri nke Jekọb kpọrọ Josef nwanne ha nke nta asị ma resị ya ndị Ijipt ka ọ gaa bụrụ ohu. Ka e mesịrị, Josef ghọrọ onye ọchịchị dị mkpa n’Ijipt. Mgbe ajọ ụnwụ dara, Josef lere ụmụnne ya ule iji mara ma hà agbanwewo. N’ikpeazụ, ezinụlọ Jekọb dum, bụ́ ụmụ Izrel, kwagara Ijipt. Nke a mere na narị afọ abụọ na iri afọ itoolu ka a mụsịrị Ebreham.

Ụmụ Izrel biri n’ala Ijipt ruo narị afọ abụọ na iri na ise sochirinụ. Mgbe Josef nwụsịrị, ha ghọrọ ndị ohu n’ebe ahụ. Ka oge na-aga, a mụrụ Mozis, Chineke jikwa ya napụta ụmụ Izrel n’Ijipt. Ihe a niile, bụ́ akụkọ were narị afọ asatọ na iri afọ ise na asaa, dị ná NKEBI NKE 2.

 

NÁ NKEBI A

AKỤKỌ NKE 11

Eke na Egwurugwu Mbụ

Ị hụ eke na egwurugwu, gịnị ka o kwesịrị ichetara gị?

AKỤKỌ NKE 12

Ụmụ Mmadụ Ewuo Nnukwu Ụlọ Elu

Obi adịghị Chineke mma, ntaramahụhụ o nyere ha ka na-emetụtakwa ụmụ mmadụ taa.

AKỤKỌ NKE 13

Ebreham​—⁠Enyi Chineke

Gịnị mere Ebreham ji hapụ ọmarịcha ụlọ o bi, birizie n’ụlọ ntu ndụ ya niile?

AKỤKỌ NKE 14

Chineke Elee Okwukwe Ebreham Ule

Gịnị mere Chineke ji gwa Ebreham ka o jiri Aịzik nwa ya chụọrọ ya àjà?

AKỤKỌ NKE 15

Nwunye Lọt Lere Anya n’Azụ

Ihe mere nwunye Lọt na-akụziri anyị otu ihe dị mkpa.

AKỤKỌ NKE 16

Aịzik Alụta Ezigbo Nwunye

Gịnị mere Ribeka ji bụrụ ezigbo nwaanyị? Ọ̀ bụ mma ya, ka è nwere ihe ọzọ?

AKỤKỌ NKE 17

Ụmụ Ejima Ndị Na-eyighị

Papa ha bụ́ Aịzik, hụrụ Ịsọ n’anya karịa Jekọb ma mama ha, bụ́ Ribeka, ka hụ Jekọb n’anya.

AKỤKỌ NKE 18

Jekọb Ejee Heran

Jekọb bu ụzọ lụọ Lia n’agbanyeghị na ọ bụ Rechel ka ọ hụrụ n’anya.

AKỤKỌ NKE 19

Jekọb Enwee Ezinụlọ Buru Ibu

È si n’aha ụmụ Jekọb iri na abụọ ndị nwoke nweta ebo iri na abụọ nke Izrel?

AKỤKỌ NKE 20

Daịna Abanye ná Nsogbu

Ihe kpatara nsogbu a niile bụ imeta ndị enyi ọjọọ.

AKỤKỌ NKE 21

Ụmụnne Josef Akpọ Ya Asị

Gịnị nwere ike ime ka ụfọdụ n’ime ụmụnne Josef chewe echiche igbu nwanne ha?

AKỤKỌ NKE 22

A Tụọ Josef Mkpọrọ

A tụrụ ya mkpọrọ, ọ bụghị n’ihi na o mere ihe ọjọọ, kama n’ihi na o mere ihe dị mma.

AKỤKỌ NKE 23

Nrọ Fero

Ehi asaa ahụ na ogbe ọka asaa ahụ pụtara otu ihe.

AKỤKỌ NKE 24

Josef Elee Ụmụnne Ya Ule

Olee otú ọ ga-esi ama ma ụmụnne ya hà agbanweela kemgbe ahụ ha rere ya ka ọ bụrụ ohu?

AKỤKỌ NKE 25

Ezinụlọ Ahụ Akwaga Ijipt

Gịnị mere e ji akpọ ndị ezinụlọ Jekọb ndị Izrel kama ịkpọ ha ndị Jekọb?

AKỤKỌ NKE 26

Job Kwesịrị Ntụkwasị Obi Nye Chineke

Akụnụba Job niile lara n’iyi, ụmụ ya niile nwụkwara, ọ dakwara nnukwu ọrịa. Ọ̀ bụ Chineke na-ata ya ahụhụ?

AKỤKỌ NKE 27

Eze Ọjọọ Amalite Ịchị Ijipt

Gịnị mere o ji gwa ndị obodo ya ka ha gbuo nwa nwoke ọhụrụ ọ bụla ndị Izrel mụrụ?

AKỤKỌ NKE 27

Eze Ọjọọ Amalite Ịchị Ijipt

Gịnị mere o ji gwa ndị obodo ya ka ha gbuo nwa nwoke ọhụrụ ọ bụla ndị Izrel mụrụ?

AKỤKỌ NKE 29

Ihe Mere Mozis Ji Gbaa Ọsọ

Mgbe Mozis dị iri afọ anọ, o chere na ya etoruola ịzọpụta ndị Izrel ka ha kwụsị ịgbara ndị Ijipt ohu, ma ọ maghị na oge erubeghị.

AKỤKỌ NKE 30

Osisi nke Na-ere Ọkụ

Chineke ji ọrụ ebube dị iche iche mee ka Mozis mara na oge eruola ka ọ gaa dupụta ndị Izrel n’Ijipt.

AKỤKỌ NKE 31

Mozis na Erọn Ejee Ịhụ Fero

Gịnị mere na Fero egeghị Mozis ntị ma hapụ ndị Izrel ka ha laa?

AKỤKỌ NKE 32

Ihe Otiti Iri Ahụ

Chineke mere ka nnukwu nsogbu iri bịakwasị obodo Ijipt n’ihi na Fero bụ́ eze Ijipt siri ọnwụ na ọ gaghị ahapụ ndị Izrel ka ha laa.

AKỤKỌ NKE 33

Ịgafe Oké Osimiri Uhie

Mozis ji ike Chineke nyere ya kewaa Oké Osimiri Uhie, ndị Izrel enwee ike ịgafe n’ala akọrọ.