Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

AKỤKỌ NKE 12

Ụmụ Mmadụ Ewuo Nnukwu Ụlọ Elu

Ụmụ Mmadụ Ewuo Nnukwu Ụlọ Elu

ỌTỤTỤ afọ agafewo. Ụmụ Noa mụrụ ọtụtụ ụmụ. Ụmụ ha wee tolite, mụtakwa ụmụ nke ha. Ọ dịghị anya, e nwee ọtụtụ mmadụ n’ụwa.

Otu n’ime ha bụ Nimrọd, bụ́ nwa nwa nke nwa Noa. Ọ bụ ajọ mmadụ nke chụgharịrị ma na-egbu ma mmadụ ma anụmanụ. Nimrọd mekwara onwe ya eze na-achị ndị ọzọ. Omume Nimrọd adịghị Chineke mma.

Ndị niile nọ n’oge ahụ na-asụ otu asụsụ. Nimrọd chọrọ ime ka ha niile nọkọta ọnụ ka o wee nwee ike ịchị ha. Ị̀ ma ihe o mere? Ọ gwara ha ka ha wuo otu obodo ma wunye otu nnukwu ụlọ elu n’ime ya. Lee ha na foto a ka ha na-akpụ brik.

Obi adịghị Jehova Chineke mma maka ụlọ a ha na-ewu. Chineke chọrọ ka ha pụọ ebe ahụ ma biri n’elu ụwa niile. Ma ha sịrị: ‘Ngwanụ! Ka anyị wuo obodo na ụlọ elu nke elu ya ga-eru n’eluigwe. Anyị ga-emere onwe anyị aha!’ Ha chọrọ imere onwe ha aha, ọ bụghị imere Chineke aha.

N’ihi ya, Chineke mere ka ha kwụsị iwu ụlọ elu ahụ. Ị̀ ma ụzọ o si mee ya? Ọ bụ site n’ime ka ha malite ịsụ asụsụ dị iche iche na mberede kama ịsụ otu asụsụ. Ndị ahụ na-ewu ụlọ ahụ anaghịzi aghọta okwu ibe ha ọzọ. Nke a mere e ji kpọọ obodo ha Bebel, ma ọ bụ Babilọn, nke pụtara “Aghara.”

Mgbe ahụ, ha malitere isi na Bebel pụọ. Ìgwè nke ọ bụla asụsụ ha dakọtara ha ejee biri n’akụkụ ọzọ nke ụwa.