Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

AKỤKỌ NKE 13

Ebreham​—⁠Enyi Chineke

Ebreham​—⁠Enyi Chineke

OTU n’ime ebe ndị ụmụ mmadụ gara biri mgbe Iju Mmiri ahụ gasịrị bụ ebe a na-akpọ Ọọ. Ọ ghọrọ ebe a ma ama nke nwere ọmarịcha ụlọ obibi. Ma ndị ebe ahụ na-efe chi ụgha. Otú ahụ ka ndị biri na Bebel mere. Ndị obodo Ọọ na Bebel eyighị Noa na nwa ya Shem, bụ́ ndị nọgidere na-efe Jehova.

N’ikpeazụ, narị afọ atọ na iri afọ ise ka iju mmiri ahụ gasịrị, Noa, bụ́ nwoke kwesịrị ntụkwasị obi, nwụrụ. Ọ bụ naanị afọ abụọ mgbe nke a gasịrị ka a mụrụ nwoke nke ị na-ahụ na foto a. Ọ bụ onye pụrụ iche n’anya Chineke. Aha ya bụ Ebreham. Ya na ezinụlọ ya biri n’obodo Ọọ ahụ.

Otu ụbọchị, Jehova gwara Ebreham, sị: ‘Hapụ Ọọ na ndị ikwu gị, gaakwa n’otu ala nke M ga-egosi gị.’ Ebreham ò gere Chineke ntị wee hapụ ihe ọma niile dị na Ọọ? Ee, o gere ntị. Ọ bụkwa n’ihi na Ebreham rubeere Chineke isi mgbe niile ka e ji mara ya dị ka enyi Chineke.

Ụfọdụ ndị ezinụlọ ya sooro ya mgbe ọ hapụrụ Ọọ. Nna ya bụ́ Tira sooro ya. Lọt nwa nwanne ya sokwa ya. Otú ahụkwa ka Sera nwunye ya mere. Ka oge na-aga, ha ruru otu ebe a na-akpọ Heran, bụ́ ebe Tira nọ nwụọ. Ha nọ ebe dị anya site na Ọọ.

Mgbe nwa oge gasịrị, Ebreham na ezinụlọ ya hapụrụ Heran jee ala a na-akpọ Kenan. N’ebe ahụ, Jehova gwara ya, sị: ‘Nke a bụ ala m ga-enye ụmụ gị.’ Ebreham nọrọ na Kenan ma biri n’ụlọ ntu.

Chineke malitere inyere ya aka, o wee nwee oké ìgwè atụrụ na anụ ndị ọzọ nakwa ọtụtụ narị ndị ohu. Ma ya na Sera amụtaghị nwa ọ bụla.

Mgbe Ebreham dị afọ iri itoolu na itoolu, Jehova sịrị ya: ‘Ana m ekwe gị nkwa na ị ga-abụ nna nke ọtụtụ mba.’ Ma olee otú nke a ga-esi mee ebe ọ bụ na Ebreham na Sera emeela agadi ugbu a ma gafee oge ịmụ nwa?