Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

AKỤKỌ NKE 15

Nwunye Lọt Lere Anya n’Azụ

Nwunye Lọt Lere Anya n’Azụ

LỌT na ezinụlọ ya so Ebreham biri n’ala Kenan. Otu ụbọchị, Ebreham sịrị Lọt: ‘Ọ dịghị ala ga-ezuru anụ ụlọ anyị niile n’ebe a. Biko, ka anyị kewaa. I jee n’otu ụzọ, m ga-eje n’ụzọ nke ọzọ.’

Lọt lere ala niile ahụ anya. Ọ hụrụ otu akụkụ mara mma nke ala ahụ bụ́ nke nwere mmiri na ezigbo ahịhịa ndụ maka anụ ụlọ ya. Nke a dị n’Ógbè Jọdan. Lọt kpọọrọ ezinụlọ ya na anụ ụlọ ya laa ebe ahụ. Ha mesịrị biri n’obodo Sọdọm.

Ndị Sọdọm bụ nnọọ ndị ọjọọ. Nke a wutere Lọt n’ihi na ọ bụ ezigbo mmadụ. O wutekwara Chineke. E mesịa, Chineke zigara ndị mmụọ ozi abụọ ịgwa Lọt na ya ga-ebibi Sọdọm na obodo Gọmọra nke dị ya nso n’ihi ajọ omume ha.

Ndị mmụọ ozi ahụ sịrị Lọt: ‘Mee ngwa! Kpọrọ nwunye gị na ụmụ gị abụọ si n’ebe a pụọ!’ Lọt na ndị ezinụlọ ya emeghị ngwa ịpụ, n’ihi ya, ndị mmụọ ozi ahụ jidere ha n’aka dupụ ha n’obodo ahụ. Otu n’ime ndị mmụọ ozi ahụ wee sị ha: ‘Gbalaganụ n’ihi ndụ unu! Unu elela anya n’azụ. Gbalaganụ n’ugwu ka a ghara igbu unu.’

Lọt na ụmụ ya ndị inyom gere ntị wee gbapụ na Sọdọm. Ha akwụsịtụghị akwụsị, ha eleghịkwa anya n’azụ. Ma nwunye Lọt egeghị ntị. Mgbe ha jeruru ebe dịtụ anya, ọ kwụsịrị, wee lee anya n’azụ. Nwunye Lọt wee ghọọ ogidi nnu. Ị̀ na-ahụ ya na foto a?

Anyị pụrụ ịmụta ezi ihe na nke a. Ọ na-egosi na Chineke na-azọpụta ndị na-ege ya ntị, ma ndị na-adịghị ege ya ntị ga-anwụ.