Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

AKỤKỌ NKE 18

Jekọb Ejee Heran

Jekọb Ejee Heran

Ị̀ MA ndị a Jekọb na-agwa okwu? Mgbe o mesịrị njem ọtụtụ ụbọchị, Jekọb zutere ha n’akụkụ olulu mmiri. Ha na-elekọta atụrụ ha. Jekọb jụrụ ha, sị: ‘Olee ebe unu si bịa?’

‘Heran,’ ka ha zara.

‘Ùnu ma Leban?’ ka Jekọb jụrụ ha.

Ha zara ‘Ee. Lee, nwa ya nwaanyị bụ́ Rechel ka o du ìgwè atụrụ ya na-abịa.’ Ị̀ na-ahụ Rechel n’ebe ahụ ka ọ na-abịa?

Mgbe Jekọb hụrụ Rechel na atụrụ nwanne nne ya, bụ́ Leban, o jere bupụ nkume dị n’olulu mmiri ahụ ka ha wee ṅụọ mmiri. Jekọb wee sutu Rechel ọnụ ma gwa ya onye ọ bụ. Rechel nwere obi ụtọ nke ukwuu, ọ laa n’ụlọ wee gwa nna ya, bụ́ Leban.

Obi tọrọ Leban ụtọ nke ukwuu oge Jekọb nọnyeere ya. Mgbe Jekọb kwuru na ya chọrọ ịlụ Rechel, obi tọrọ Leban ụtọ. Ma, ọ gwara Jekọb ka ọ rụọ ọrụ n’ubi ya ruo afọ asaa n’ihi Rechel. Jekọb mere nke a n’ihi na ọ hụrụ Rechel n’anya nke ukwuu. Ma mgbe oge ruru ka ọ lụọ ya, ị̀ ma ihe mere?

Leban kpọnyere Jekọb nwa ya nwaanyị bụ́ Lia, bụ́ onye tọrọ Rechel, kama ịkpọnye ya Rechel. Mgbe Jekọb kwere ịrụrụ ya ọrụ afọ asaa ọzọ, ọ kpọnyere ya Rechel ka ọ bụrụ nwunye ya. Chineke kwere ka ndị ikom n’oge ahụ na-enwe karịa otu nwunye. Ma dị ka Bible na-egosi ugbu a, nwoke ga-enwe nanị otu nwunye.