Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

AKỤKỌ NKE 19

Jekọb Enwee Ezinụlọ Buru Ibu

Jekọb Enwee Ezinụlọ Buru Ibu

LEGODỊ ezinụlọ a buru ibu. Ha bụ ụmụ ndị ikom iri na abụọ nke Jekọb. Jekọb nwekwara ụmụ ndị inyom. Ị̀ ma aha ụmụ ya ndị a? Ka anyị mata ụfọdụ n’ime ha.

Lia mụrụ Ruben, Simiọn, Livaị, na Juda. Mgbe Rechel hụrụ na ya amụtaghị nwa, o wutere ya nke ukwuu. Ọ kpọnyere Jekọb ohu ya nwaanyị bụ́ Bilha. Bilha wee mụta ụmụ abụọ, a na-akpọ ha Dan na Naftalaị. Lia kpọnyekwara Jekọb ohu ya nwaanyị bụ́ Zilpa. Zilpa wee mụta Gad na Asha. N’ikpeazụ, Lia mụrụ ụmụ abụọ ọzọ, bụ́ Ịsaka na Zebulọn.

Rechel mụrụ otu nwa n’ikpeazụ. Ọ kpọọ aha ya Josef. Anyị ga-amụkwu ọtụtụ ihe banyere Josef ma e mesịa, n’ihi na ọ ghọrọ onye dị mkpa. Ndị a bụ ụmụ iri na otu ndị a mụụrụ Jekọb mgbe ya na Leban nna Rechel bi.

Jekọb nwekwara ụmụ ndị inyom ụfọdụ, ma ọ bụ naanị otu ka Bible kpọrọ aha ya. Aha ya bụ Daịna.

Oge ruru mgbe Jekọb chọrọ ịhapụ Leban iji laghachi Kenan. Ọ kpọọrọ ezinụlọ ya buru ibu na nnukwu ìgwè anụ ụlọ ya malite njem ahụ dị anya.

Mgbe Jekọb na ezinụlọ ya laruru Kenan ma nọtụ nwa oge, Rechel mụrụ nwa nwoke ọzọ. Ọ mụrụ ya mgbe ha na-eme njem. Ime a bịara siere Rechel ike, o wee nwụọ mgbe ọ na-amụ nwa. Ma ọ dịghị ihe mere nwa ọhụrụ ahụ. Jekọb wee kpọọ aha ya Benjamin.

Anyị kwesịrị icheta aha ụmụ iri na abụọ Jekọb, n’ihi na mba Izrel dum sitere na ha. N’ezie, a kpọkwasịrị ebo iri na abụọ nke Izrel aha ụmụ iri Jekọb na ụmụ abụọ Josef. Aịzik nọrọ ndụ ọtụtụ afọ mgbe a mụsịrị ụmụ ndị a niile, ọ ghaghịkwa inyewo ya obi ụtọ inwe nnọọ ọtụtụ ụmụ ụmụ. Ma, ka anyị lee ihe mere nwa agbọghọ bụ́ Daịna, nwa nwa Aịzik.