Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

AKỤKỌ NKE 22

A Tụọ Josef Mkpọrọ

A Tụọ Josef Mkpọrọ

JOSEF gbara naanị afọ iri na asaa mgbe a kpọọrọ ya gaa Ijipt. N’ebe ahụ, e resịrị ya otu nwoke aha ya bụ Pọtịfa. Pọtịfa na-arụrụ eze Ijipt a na-akpọ Fero ọrụ.

Josef rụsiiri nna ya ukwu bụ́ Pọtịfa ọrụ ike. Mgbe Josef tolitekwuru, Pọtịfa mere ya onye na-elekọta ụlọ ya dum. Ma gịnị mere Josef ji nọrọ n’ụlọ mkpọrọ ebe a? Ọ bụ n’ihi nwunye Pọtịfa.

Josef tolitere bụrụ nwoke mara nnọọ mma, nwunye Pọtịfa chọkwara ka ya na ya dinaa. Ma Josef maara na ọ bụ ihe ọjọọ, o kweghịkwa eme ya. Nwunye Pọtịfa were iwe nke ukwuu. Oge di ya lọtara, ọ ghaara ya ụgha, sị: ‘Onye ọjọọ a bụ́ Josef nwara idina m!’ Pọtịfa kweere ihe nwunye ya kwuru wee wesa Josef iwe dị ọkụ. N’ihi ya, o mere ka e tinye ya n’ụlọ mkpọrọ.

N’oge na-adịghị anya, onye na-elekọta ụlọ mkpọrọ ahụ hụrụ na Josef bụ ezigbo mmadụ. O wee mee ya onye nlekọta nke ndị mkpọrọ niile. E mesịa, Fero were iwe megide onye na-eburu ya ihe ọṅụṅụ na onye na-emere ya bred, ọ tụbakwara ha n’ụlọ mkpọrọ. Otu abalị, ha abụọ rọrọ nrọ pụrụ iche, ma ha amaghị ihe nrọ ha pụtara. N’echi ya, Josef sịrị ha: ‘Kọọrọnụ m nrọ unu.’ Mgbe ha kọọrọ ya, site n’enyemaka Chineke, Josef kọwaara ha ihe nrọ ha pụtara.

Josef gwara onye ahụ na-ebu ihe ọṅụṅụ, sị: ‘N’ime ụbọchị atọ, a ga-eme ka i si n’ụlọ mkpọrọ pụta, ị ga-amalitekwa iburu Fero ihe ọṅụṅụ ọzọ.’ Josef gbakwụnyeziri, sị: ‘Ọ bụrụ na i si n’ebe a pụta, kọọrọ Fero banyere m, iji nyere m aka isi n’ebe a pụta.’ Ma Josef gwara onye ahụ na-emere Fero bred, sị: ‘N’ime ụbọchị atọ nanị, Fero ga-egbupụ gị isi.’

N’ime ụbọchị atọ ahụ, ihe Josef kwuru mezuru. Fero mere ka e gbupụ isi onye ahụ na-emere ya bred. Ma e mere ka onye ahụ na-eburu ya ihe ọṅụṅụ si n’ụlọ mkpọrọ pụta, ọ malitekwara ijere eze ozi ọzọ. Ma, onye ahụ na-eburu Fero ihe ọṅụṅụ chezọrọ ihe niile banyere Josef! Ọ gwaghị Fero banyere ya, Josef wee nọrọ n’ụlọ mkpọrọ.