Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

AKỤKỌ NKE 25

Ezinụlọ Ahụ Akwaga Ijipt

Ezinụlọ Ahụ Akwaga Ijipt

JOSEF apụghịzi ijide onwe ya ọzọ. Ọ gwara ndị ohu ya niile ka ha si n’ime ụlọ ya pụọ. Mgbe naanị Josef na ụmụnne ya nọ, ọ malitere ibe ákwá. Chegodị ụdị ihe ijuanya ụmụnne ya nwere, n’ihi na ha amaghị ihe mere o ji na-ebe ákwá. N’ikpeazụ, ọ sịrị ha: ‘Abụ m Josef. Nna m ọ̀ ka nọ ndụ?’

O juru ụmụnne ya anya nke na ha apụghị ikwu okwu. Egwu tụrụ ha. Ma Josef sịrị ha: ‘Biko bịanụ m nso.’ Mgbe ha bịara nso, ọ sị ha: ‘Abụ m Josef nwanne unu onye unu regara Ijipt.’

Josef wee gaa n’ihu na-agwa ha okwu n’obi ebere, sị: ‘Unu atala onwe unu ụta n’ihi na unu rere m bịa n’ebe a. Ọ bụ Chineke n’ezie zitere m n’Ijipt iji zọpụta ndụ ụmụ mmadụ. Fero emewo m onyeisi ala nke a niile. Ya mere, jekwurunụ nna m ọsọ ọsọ, kọọrọ ya banyere nke a. Gwanụ ya ka ọ bịa biri n’ebe a.’

Josef wee makụọ ụmụnne ya, sutukwa ha niile ọnụ. Mgbe Fero nụrụ na ụmụnne Josef bịara, ọ sịrị Josef: ‘Ka ha were ụgbọala jee duta nna ha na ezinụlọ ha ma bịaghachi ebe a. M ga-enye ha ala kasị mma n’Ijipt niile.’

Ha mere otú ahụ. Ị pụrụ ịhụ Josef n’ebe a ka ọ na-ezute nna ya mgbe ya na ezinụlọ ya dum bịara Ijipt.

Ezinụlọ Jekọb ebuola nnọọ ibu. Ha niile dị mmadụ iri asaa mgbe ha kwabatara n’Ijipt, ma a gụnyekọta Jekọb na ụmụ ya na ụmụ ụmụ ya. Ndị nwunye ha nakwa ma eleghị anya, ọtụtụ ndị ohu ha, sokwa ha. Ha niile wee gaa biri n’Ijipt. A kpọrọ ha ụmụ Izrel, n’ihi na Chineke gbanwere aha Jekọb ịbụ Izrel. Ụmụ Izrel ghọrọ ndị pụrụ iche nke Chineke, dị ka anyị ga-ahụ ma e mesịa.