Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

AKỤKỌ NKE 26

Job Kwesịrị Ntụkwasị Obi Nye Chineke

Job Kwesịrị Ntụkwasị Obi Nye Chineke

Ị̀ NA-EMETERE nwoke a na-arịa ọrịa ebere? Aha ya bụ Job, nwaanyị ahụ bụkwa nwunye ya. Ị̀ ma ihe ọ na-agwa Job? ‘Kọchaa Chineke nwụọ.’ Ka anyị hụ ihe mere o jidị kwuwe ihe dị otú ahụ, na ihe mere Job ji na-ata nnukwu ahụhụ dị otú a.

Job bụ nwoke kwesịrị ntụkwasị obi, nke rubeere Jehova isi. O biri n’ala Ọz, nke dị nso na Kenan. Jehova hụrụ Job n’anya nke ukwuu, ma ọ dị onye kpọrọ ya asị. Ị̀ ma onye ọ bụ?

Ọ bụ Setan Ekwensu. Cheta na Setan bụ ajọ mmụọ ozi nke kpọrọ Jehova asị. O mere ka Adam na Iv nupụrụ Jehova isi, o chekwara na ya pụrụ ime ka mmadụ niile nupụrụ Jehova isi. Ma ò meliri nke ahụ? Ee e. Cheedị banyere ọtụtụ ndị ikom na ndị inyom kwesịrị ntụkwasị obi, bụ́ ndị anyị mụworo ihe banyere ha. Mmadụ ole ka ị pụrụ ịkpọ aha ha?

Mgbe Jekọb na Josef nwụrụ n’Ijipt, ọ bụ Job kasị kwesị ntụkwasị obi nye Jehova n’ụwa niile. Jehova chọrọ igosi Setan na ọ pụghị ime ka mmadụ niile bụrụ ndị ọjọọ, n’ihi nke a, ọ sịrị ya: ‘Lee Job. Lee ka o si na-ekwesị nnọọ ntụkwasị obi nye m.’

Setan wee sị: ‘Ọ na-ekwesị ntụkwasị obi n’ihi na ị gọziri ya, o nwekwara ọtụtụ ihe ọma. Ma, ọ bụrụ na ị napụ ya ihe ndị ahụ, ọ ga-akọcha gị.’

Jehova wee sị ya: ‘Jee. Wepụ ha. Mee Job ihe ọjọọ niile nke ị chọrọ ime ya. Anyị ga-ahụ ma ọ ga-akọcha m. Ma anwala anwa gbuo ya.’

Setan buru ụzọ mee ka ndị mmadụ zuru ìgwè ehi na kamel niile Job nwere, e gbukwara atụrụ ya niile. Ọzọ, o ji oké ifufe gbuo ụmụ ndị ikom na ụmụ ndị inyom iri Job. Ihe ọzọ Setan mere bụ iti Job ọrịa jọgburu onwe ya. Job tara ahụhụ dị egwu. Ọ bụ nke a mere nwunye Job ji sị ya: ‘Kọchaa Chineke nwụọ.’ Ma Job emeghị otú ahụ. Ndị enyi ụgha atọ Job bịara wee sị ya na o biri ndụ ọjọọ. Ma Job nọgidere na-ekwesị ntụkwasị obi.

Nke a nyere Jehova obi ụtọ, o wee gọzie Job n’ikpeazụ, dị ka ị pụrụ ịhụ n’ihe osise a. Ọ gwọrọ ya ọrịa ya. Job nwere ụmụ iri ọzọ ndị mara mma karị, nweekwa ìgwè ehi, atụrụ na kamel, okpukpu abụọ karịa na mbụ.

Ị̀ ga-anọgide na-ekwesị ntụkwasị obi nye Jehova dị ka Job? Ọ bụrụ na i mee otú ahụ, Chineke ga-agọzikwa gị. Ị ga-enwe ike ịdị ndụ ruo mgbe ebighị ebi, bụ́ mgbe a ga-eme ka ala niile maa mma dị ka ogige Iden.