Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

AKỤKỌ NKE 27

Eze Ọjọọ Amalite Ịchị Ijipt

Eze Ọjọọ Amalite Ịchị Ijipt

NDỊ ikom a na-amanye ndị a ịrụ ọrụ. Lee nwoke a nke na-apịa otu n’ime ndị ọrụ a ụtarị! Ndị ọrụ ahụ bụ ndị ezinụlọ Jekọb, bụ́ ndị a na-akpọ ụmụ Izrel. Ndị ikom ahụ, bụ́ ndị na-amanye ha ịrụ ọrụ, bụ ndị Ijipt. Ụmụ Izrel aghọwo ndị ohu ndị Ijipt. Olee otú nke a si mee?

Ruo ọtụtụ afọ, ezinụlọ buru ibu nke Jekọb biri n’udo n’Ijipt. Josef onye bụ́ nwoke kasị mkpa n’Ijipt ma a gụpụ eze Fero, lekọtara ha anya. Ka e mesịrị, Josef nwụrụ. Fero ọhụrụ nke na-ahụghị ụmụ Izrel n’anya wee bụrụ eze Ijipt.

Fero ọjọọ a mere ka ụmụ Izrel bụrụ ndị ohu. O nyere ndị ikom dị obi ọjọọ ma bụrụ ndị arụrụala ọrụ nke ilekọta ha. Ha manyere ụmụ Izrel ịrụsi ọrụ ike n’iwuru Fero ọtụtụ obodo. Ma ụmụ Izrel nọgidere na-amụba n’ọnụ ọgụgụ. Mgbe nwa oge gasịrị, ndị Ijipt tụrụ egwu na ụmụ Izrel ga-adị ọtụtụ dịkwa ike karịa ha.

Ị̀ ma ihe Fero mere? Ọ gwara ndị inyom na-enyere ụmụ nwaanyị Izrel dị ime aka ịmụ nwa, sị: ‘Unu ga na-egbu nwa nwoke ọ bụla a mụrụ.’ Ma ndị inyom ahụ bụ ndị ezigbo mmadụ, ha egbughị ụmụ ọhụrụ ndị ahụ.

N’ihi ya, Fero nyere ndị ya niile iwu a, sị: ‘Na-egbunụ ụmụ nwoke nke ndị Izrel. Hapụnụ naanị ụmụ nwaanyị.’ Nke ahụ, ọ́ bụghị ihe dị egwu inye iwu ka e mee? Ka anyị hụ ụzọ e si zọpụta otu nwa nwoke a mụrụ ọhụrụ.