Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

AKỤKỌ NKE 28

Eze Ọjọọ Amalite Ịchị Ijipt

Eze Ọjọọ Amalite Ịchị Ijipt

LEE nwa ọhụrụ nke a na-ebe ákwá, na-ejide mkpịsị aka nwaanyị ahụ. Ọ bụ Mozis. Ị̀ ma onye ọmarịcha nwaanyị a bụ? Ọ bụ adaeze Ijipt, ada Fero.

Nne Mozis zobere nwa ya ruo mgbe ọ dị ọnwa atọ, n’ihi na ọ chọghị ka ndị Ijipt gbuo ya. Ma, ọ matara na a pụrụ ịhụ Mozis, n’ihi ya, lee ihe o mere iji zọpụta ya.

O weere otu nkata ma dozie ya ka mmiri ghara ịba n’ime ya. O wee nyiwe Mozis n’ime ya, debe nkata ahụ n’ebe e nwere ahịhịa ndị tochara ogologo n’akụkụ Osimiri Naịl. Ọ gwara Miriam, bụ́ nwanne nwaanyị Mozis, ka o guzoro n’ebe dị nso iji hụ ihe ga-eme.

Ọ dịghị anya ada Fero abịa n’Osimiri Naịl ịsa ahụ́. Na mberede, ọ hụrụ nkata ahụ dị n’ebe ahụ e nwere ahịhịa ndị toro ogologo. Ọ kpọọ otu n’ime ndị ohu ya nwaanyị, sị: ‘Jee butara m nkata ahụ.’ Mgbe adaeze meghere nkata ahụ, ọ hụrụ otu nwa ọhụrụ mara mma! Nwa ọhụrụ ahụ bụ́ Mozis nọ na-ebe ákwá, ma adaeze nwere ọmịiko n’ahụ́ ya. Ọ chọghị ka e gbuo ya.

Mgbe ahụ, Miriam bịara. Ị pụrụ ịhụ ya na foto a. Miriam jụrụ ada Fero, sị: ‘Ị̀ chọrọ ka m jee kpọọrọ gị nwaanyị Izrel ka ọ na-enyere gị nwa nke a ara?’

Adaeze sịrị ya: ‘Biko jee.’

Miriam gbapụrụ ọsọ jee kọọrọ nne ya. Mgbe nne Mozis bịakwutere adaeze ahụ, adaeze sịrị ya: ‘Kuru nwa a ma na-enyere m ya ara, m ga-akwụ gị ụgwọ ọrụ.’

Otú ahụ ka nne Mozis si lekọta nwa ya n’onwe ya. Ma mgbe Mozis tolitetụrụ, ọ kpọgaara ya ada Fero, bụ́ onye ji Mozis mere nwa ya nwoke. Nke a bụ ụzọ Mozis si tolite n’ezinụlọ Fero.