Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

AKỤKỌ NKE 29

Ihe Mere Mozis Ji Gbaa Ọsọ

Ihe Mere Mozis Ji Gbaa Ọsọ

LEE Mozis ka o si n’Ijipt na-agbapụ. Ị̀ hụrụ ndị ikom na-achụ ya? Ị̀ ma ihe mere ha ji chọọ igbu Mozis? Ka anyị lee ma ànyị pụrụ ịchọpụta.

Mozis tolitere n’ụlọ Fero, bụ́ onye na-achị Ijipt. Ọ ghọrọ nwoke maara ihe na onye ukwu. Mozis maara na ya abụghị onye Ijipt, kama na ndị mụrụ ya n’ezie bụ ndị Izrel, ndị bụ́ ndị ohu.

Otu ụbọchị, mgbe ọ gbara afọ iri anọ, Mozis kpebiri ije hụ otú ndị ya na-eme. Ụzọ e si emeso ha jọgburu onwe ya. Ọ hụrụ onye Ijipt nke na-eti onye Izrel bụ́ ohu ihe. Mozis legharịrị anya, ma mgbe ọ na-adịghị onye ọ bụla ọ hụrụ na-ele ya, o tiri onye Ijipt ahụ ihe, onye Ijipt ahụ wee nwụọ. Mozis wee zoo ozu ya n’ime ájá.

N’echi ya, Mozis jere ịhụ ndị ya ọzọ. O chere na ya pụrụ inyere ha aka ka ha ghara ịbụ ohu ọzọ. Ma ọ hụrụ ka ndị ikom Izrel abụọ na-alụ ọgụ, Mozis wee sị onye nke mejọrọ ibe ya: ‘N’ihi gịnị ka ị na-eti nwanna gị ihe?’

Nwoke ahụ sịrị ya: ‘Ònye mere gị onyeisi na onyeikpe anyị? Ị̀ chọrọ igbu m dị ka i gburu onye Ijipt ahụ?’

Ụjọ bịara Mozis. Ọ matara na ndị mmadụ amarawo ihe ya mere onye Ijipt ahụ. Ọbụna Fero anụwo ya, o wee zipụ ndị ikom ka ha gbuo Mozis. Ọ bụ nke a mere Mozis ji si n’Ijipt na-agbapụ.

Mgbe Mozis hapụrụ Ijipt, o jere n’ala Midian nke dị ezigbo anya. Ọ hụrụ ezinụlọ Jetro n’ebe ahụ, o wee lụrụ otu n’ime ụmụ ya ndị nwaanyị nke aha ya bụ Zipora. Mozis ghọrọ onye na-azụ atụrụ ma na-elekọta atụrụ Jetro. O biri n’ala Midian ruo afọ iri anọ. Mozis agbaala afọ iri asatọ ugbu a. Otu ụbọchị, ka Mozis na-elekọta atụrụ Jetro, otu ihe dị ịtụnanya mere nke gbanwere ndụ Mozis kpamkpam. Sapeta peeji na-esonụ ka anyị hụ ihe bụ́ ihe ịtụnanya ahụ.