Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

AKỤKỌ NKE 30

Osisi nke Na-ere Ọkụ

Osisi nke Na-ere Ọkụ

MOZIS chọọrọ ebe atụrụ ya ga-ata nri rute n’ugwu Horeb. N’ebe ahụ, ọ hụrụ osisi nke na-ere ọkụ, ma ọkụ ahụ adịghị erepịa osisi ahụ!

Mozis nọ na-eche, sị: ‘Nke a bụ ihe ịtụnanya. Ka m ruo nso ma lerukwuo ya anya.’ Mgbe o mere otú ahụ, ọ nụrụ olu nke si n’osisi ahụ, na-asị: ‘Abịarula nso. Yipụ akpụkpọ ụkwụ gị, n’ihi na ebe i guzo bụ ala dị nsọ.’ Ọ bụ Chineke na-ekwu okwu ahụ site n’ọnụ otu mmụọ ozi, n’ihi ya, Mozis kpuchiri ihu ya.

Mgbe ahụ, Chineke sịrị ya: ‘Ahụwo m ahụhụ ndị m na-ata n’Ijipt. M ga-anapụta ha, ọ bụkwa gị ka M ga-eziga idupụta ndị m n’Ijipt.’ Jehova gaje iduba ndị ya n’ala Kenan ahụ mara mma.

Ma Mozis sịrị ya: ‘Ọ dịghị onye m bụ. Olee otú m pụrụ isi mee nke a? M jeekwanụ, ụmụ Izrel jụọ m, sị, “Ònye zitere gị?” Mgbe ahụ, gịnị ka m ga-ekwu?’

Chineke sịrị ya: ‘Nke a bụ ihe ị ga-asị ha: “JEHOVA Chineke nke Ebreham, Chineke nke Aịzik, na Chineke nke Jekọb ezitewo m n’ebe unu nọ.”’ Jehova gbakwụnyekwara, sị: ‘Nke a bụ aha m ruo mgbe ebighị ebi.’

Mozis wee sị: ‘Gịnịkwanụ ma ọ bụrụ na ha ekwetaghị ma m gwa ha na ọ bụ gị zitere m?’

Chineke ajụọ ya: ‘Gịnị ka i ji n’aka?’

Mozis wee sị: ‘Mkpanaka.’

Chineke sịrị ya: ‘Tụpụ ya n’ala.’ Mgbe Mozis tụpụrụ ya, osisi ahụ ghọrọ agwọ. Mgbe ahụ, Jehova gosiri Mozis ọrụ ebube ọzọ. Ọ sịrị ya: ‘Tinye aka gị n’ime uwe gị.’ Mozis tinyere aka ya, ma mgbe o wepụtara aka ya, aka ya na-enwu ọcha dị ka snow! Aka ya yiri ihe nwere ọrịa ọjọọ a na-akpọ ekpenta. Ọzọ, Jehova nyere Mozis ike ịrụ ọrụ ebube nke atọ. N’ikpeazụ, ọ sịrị: ‘Ọ bụrụ na ị rụọ ọrụ ebube ndị a, ụmụ Izrel ga-ekwere na ọ bụ M zitere gị.’

Mgbe nke a gasịrị, Mozis lakwuuru Jetro wee sị ya: ‘Biko ka m laghachikwuru ndị m n’Ijipt iji hụ otú ha na-eme.’ Ya mere, Jetro sịrị Mozis gaa nke ọma, Mozis wee malite ịlaghachi Ijipt.