Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

AKỤKỌ NKE 33

Ịgafe Oké Osimiri Uhie

Ịgafe Oké Osimiri Uhie

LEE ihe na-eme n’ebe a! Lee ka Mozis na-esetị mkpanaka ya n’elu Oké Osimiri Uhie. Ndị ha na ya nọ n’enweghị nsogbu n’ofe nke ọzọ bụ ụmụ Izrel. Ma Fero na usuu ndị agha ya niile ka mmiri na-erikpu n’ime osimiri. Ka anyị hụ ụzọ nke a si mee.

Dị ka anyị mụworo, mgbe Chineke wetasịịrị ndị Ijipt ihe otiti nke iri, Fero gwara ụmụ Izrel ka ha hapụ Ijipt. Ihe dị ka narị puku isii ndị ikom Izrel hapụrụ Ijipt, ha na ọtụtụ ndị inyom na ụmụntakịrị. E nwekwara ọnụ ọgụgụ dị ukwuu nke ndị ọzọ kweere na Jehova, bụ́ ndị sooro ụmụ Izrel pụọ. Ha niile chịịrị atụrụ ha na ewu ha na ehi ha pụọ.

Tupu ha apụọ, ụmụ Izrel rịọrọ ndị Ijipt maka uwe na ihe ndị e ji ọlaedo na ọlaọcha mee. Ndị Ijipt tụrụ egwu nke ukwuu n’ihi ihe otiti ikpeazụ ahụ e tiri ha. N’ihi ya, ha nyere ụmụ Izrel ihe niile ha rịọrọ.

Mgbe ụbọchị ụfọdụ gasịrị, ụmụ Izrel rutere n’Oké Osimiri Uhie. Ha zuru ike n’ebe ahụ. Ma ugbu a, Fero na ndị ya malitere inwe mwute maka ikwe ka ụmụ Izrel laa. Ha sịrị: ‘Anyị ahapụwo ndị ohu anyị ka ha laa!’

N’ihi nke a, Fero gbanwere obi ya ọzọ. O wee kwadebe ụgbọ ịnyịnya ya na ndị agha ya ọsọ ọsọ. O weere narị ụgbọ inyịnya isii pụrụ iche, werekwa ụgbọ ịnyịnya ndị ọzọ nke Ijipt, malite ịchụ ụmụ Izrel.

Mgbe ụmụ Izrel hụrụ ka Fero na ndị agha ya na-achụ ha, ha tụrụ egwu nke ukwuu. Ọ dịghị ụzọ ha ga-esi gbalaga. Oké Osimiri Uhie dị ha n’ihu, ndị Ijipt na-abịakwa ha n’azụ. Ma Jehova mere ka igwe ojii dị n’agbata ndị ya na ndị Ijipt. Nke ahụ mere ka ndị Ijipt ghara ịhụ ụmụ Izrel iji busoo ha agha.

Jehova wee gwa Mozis ka o setịpụ mkpanaka ya n’elu Oké Osimiri Uhie ahụ. Mgbe o mere nke a, Jehova mere ka oké ifufe si n’ebe ọwụwa anyanwụ fee. E kewara mmiri osimiri ahụ, mmiri niile ahụ wee kwụsị n’akụkụ abụọ.

Ụmụ Izrel amalitezie ịgafe oké osimiri ahụ n’ala akọrọ. O were ọtụtụ nde mmadụ ahụ na anụ ụlọ ha ọtụtụ awa isi n’ime oké osimiri ahụ gafee n’ofe nke ọzọ n’udo. N’ikpeazụ, ndị Ijipt hụrụ ụmụ Izrel ọzọ. Ndị ohu ha na-agbalaga! N’ihi ya, ha chụụrụ ha banye n’ime osimiri ahụ.

Mgbe ha banyere, Chineke mere ka ụkwụ ụgbọ ịnyịnya ha dapụsịa. Ndị Ijipt tụrụ egwu nke ukwuu wee malite iti mkpu, sị: ‘Jehova na-eburu ndị Izrel agha megide anyị. Ka anyị gbapụ n’ebe a!’ Ma oge aganahụwo ha.

Ọ bụ mgbe ahụ ka Jehova gwara Mozis ka o setịpụ mkpanaka ya n’elu Oké Osimiri Uhie, dị ka ị na-ahụ na foto a. Mgbe Mozis mere otú ahụ, akụkụ abụọ nke mmiri ahụ malitere ịlọghachi wee rikpuo ndị Ijipt na ụgbọ ịnyịnya ha. Ndị agha ha dum esorowo ndị Izrel baa n’ime osimiri. Ma ọ dịghị onye Ijipt ọ bụla pụtara ná ndụ!

Lee obi ụtọ nke ndị Chineke niile nwere na a zọpụtara ha! Ndị ikom bụkuru Jehova abụ ekele, na-asị: ‘Jehova enwewo mmeri dị ebube. Ọ tụbawo ịnyịnya na ndị ha bu n’ime oké osimiri.’ Miriam nwanne Mozis nke nwaanyị wee bulie ịgbà ya, ndị inyom niile sonyekwaara ya bulie ịgbà ha. Ma ka ha na-ete egwú ọṅụ, ha bụrụ otu abụ ahụ ndị ikom ha na-abụ, sị: ‘Jehova enwewo mmeri dị ebube. Ọ tụbawo ịnyịnya na ndị ha bu n’ime oké osimiri.’