Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

NKEBI NKE 3

Site ná Mgbapụta n’Ijipt Ruo n’Eze Mbụ nke Izrel

Site ná Mgbapụta n’Ijipt Ruo n’Eze Mbụ nke Izrel

Mozis si n’Ijipt, bụ́ ebe ụmụ Izrel gbara ohu, duru ụmụ Izrel ruo n’Ugwu Saịnaị, bụ́ ebe Chineke nyere ha iwu ya. E mesịa, Mozis zipụrụ ndị ikom iri na abụọ ịga ledoo ala Kenan. Ma mmadụ iri n’ime ha bu akụkọ ọjọọ lọta. Ha mere ka ụmụ Izrel chọwa ịlaghachi Ijipt. N’ihi enweghị okwukwe ha, Chineke nyere ụmụ Izrel ahụhụ site n’ime ka ha wagharịa n’ime ọzara ruo afọ iri anọ.

N’ikpeazụ, a họpụtara Jọshụa iduru ụmụ Izrel banye n’ala Kenan. Iji nyere ha aka inweta ala ahụ, Jehova rụrụ ọrụ ebube ụfọdụ. O mere ka Osimiri Jọdan kwụsị ịsọ asọ, mee ka mgbidi Jeriko daa, meekwa ka anyanwụ kwụrụ otu ebe ruo otu ụbọchị zuru ezu. Mgbe afọ isii gasịrị, a napụrụ ndị Kenan ala ahụ.

Malite na Jọshụa, ndị ikpe chịrị ụmụ Izrel narị afọ atọ na afọ iri ise na isii. Anyị ga-amụ banyere ọtụtụ n’ime ha, gụnyere Berak, Gidiọn, Jefta, Samsin, na Samuel. Anyị ga-agụkwa banyere ndị inyom dị ka Rehab, Debọra, Jel, Rut, Neomi, na Delaịla. NKEBI NKE 3 kọrọ ihe ndị mere n’ime narị afọ atọ na iri afọ itoolu na isii.

 

NÁ NKEBI A

AKỤKỌ NKE 34

Ụdị Ihe Oriri Ọhụrụ

Chineke mere ka ihe oriri a pụrụ iche si n’eluigwe zoo ka mmiri.

AKỤKỌ NKE 35

Jehova Enye Iwu Ya

Olee iwu abụọ karịrị Iwu Iri ahụ?

AKỤKỌ NKE 36

Nwa Ehi Ọlaedo

Gịnị mere ndị mmadụ ga-eji fewe ihe a kpụrụ akpụ e ji ọla ntị a gbazere agbaze mee?

AKỤKỌ NKE 37

Ụlọ Ntu A Na-anọ Efe Ofufe

Ọ bụ n’ọnụ ụlọ nke dị n’ime ime ka e dowere igbe ọgbụgba ndụ.

AKỤKỌ NKE 38

Ndị Nledo Iri na Abụọ

Mmadụ iri ná ndị nledo iri na abụọ ahụ kwuru otu ihe, mmadụ abụọ ndị nke ọzọ ekwuo ihe ọzọ. Ònye ka ndị Izrel kweere ihe ha kwuru?

AKỤKỌ NKE 39

Okooko Osisi Epuo na Mkpanaka Erọn

Olee otú okooko osisi ga-esi puo n’osisi kpọrọ nkụ naanị n’otu abalị?

AKỤKỌ NKE 40

Mozis Etie Nkume Ihe

Mozis kụrụ mkpanaka ya na nkume, mmiri wee gbapụta, gịnịzi mere Jehova ji wee iwe.

AKỤKỌ NKE 41

Agwọ Ọla Kọpa

Gịnị mere Chineke ji zite agwọ ọjọọ ka ọ bịa taa ndị Izrel?

AKỤKỌ NKE 42

Ịnyịnya Ibu Ekwuo Okwu

Ịnyịnya ibu Belam hụrụ ihe Belam n’onwe ya na-enweghị ike ịhụ.

AKỤKỌ NKE 43

Jọshụa Aghọọ Onye Ndú

Ahụ́ ka gbasiri Mozis ike, gịnịzi mere Jọshụa ji nọchie ya?

AKỤKỌ NKE 44

Rehab Ezobe Ndị Nledo

Olee otú Rehab si nyere ụmụ nwoke abụọ aka, oleekwa ihe ọ rịọrọ ka ha meere ya?

AKỤKỌ NKE 45

Ịgafe Osimiri Jọdan

E nwere ọrụ ebube Chineke rụrụ mgbe ndị nchụàjà zọnyere ụkwụ n’Osimiri Jọdan.

AKỤKỌ NKE 46

Mgbidi Jeriko

Olee otú eriri ga-esi gbochie mgbidi ịda?

AKỤKỌ NKE 47

Otu Onye Ohi Nọ n’Izrel

Otu onye ò nwere ike ịkpatara obodo niile nsogbu?

AKỤKỌ NKE 48

Ndị Gibiọn Bụ́ Ndị Maara Ihe

Ha ghọgburu Jọshụa na ndị Izrel ndị ọzọ, ha ekwe ha nkwa, ma ndị Izrel mezuru nkwa ha kwere.

AKỤKỌ NKE 49

Anyanwụ Akwụrụ Otu Ebe

Jehova meere Jọshụa ihe ọ na-emetụbeghị mbụ, o mebeghịkwa ya ọzọ kemgbe ahụ.

AKỤKỌ NKE 50

Ndị Inyom Abụọ Ndị Nwere Obi Ike

Berak du ndị agha Izrel gaa agha, gịnịzi mere o ji bụrụ Jel ka e nyere otuto ya?

AKỤKỌ NKE 51

Rut na Neomi

Rut hapụrụ obodo ya na ndị ezinụlọ ya ka ya na Neomi nọrọ nakwa ka o fee Jehova.

AKỤKỌ NKE 52

Gidiọn Na Narị Ndị Ikom Atọ Ya

Chineke kwuru ụzọ dị ịtụnanya e si họrọ ìgwè ndị agha a dị ntakịrị.

AKỤKỌ NKE 53

Nkwa Jefta Kwere

Nkwa o kwere Jehova metụtara ya, metụtakwa nwa ya nwaanyị.

AKỤKỌ NKE 54

Nwoke Nke Kachasị Ike

Olee otú Delaịla si mata ebe ike Samsịn dị?

AKỤKỌ NKE 55

Nwatakịrị Nke Na-ejere Chineke Ozi

Mgbe Samuel ka dị obere, Chineke si n’ọnụ ya zie Ilaị bụ́ Onyeisi Nchụàjà ozi na-agba agba ná ntị.