Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

AKỤKỌ NKE 34

Ụdị Ihe Oriri Ọhụrụ

Ụdị Ihe Oriri Ọhụrụ

Ị̀ PỤRỤ ịkọ ihe ndị a na-atụtụrụ n’ala? O yiri mmiri kpụkọrọ akpụkọ. Ọ dị ọcha, dị gịrịgịrị, ma dị peke peke. Ma ọ bụghị mmiri kpụkọrọ akpụkọ; ọ bụ ihe a na-eri eri.

O ruwo naanị ihe dị ka otu ọnwa kemgbe ụmụ Izrel hapụrụ Ijipt. Ha nọ n’ọzara. E nwere ihe oriri dị nta n’ebe ahụ, n’ihi ya, ha malitere ime mkpesa, sị: ‘Ọ gaara adị anyị mma ma a sị na Jehova gburu anyị n’Ijipt. Ma ọ́ dịghị ihe ọzọ, anyị nwere ihe oriri niile anyị chọrọ n’ebe ahụ.’

N’ihi ya, Jehova sịrị: ‘M ga-eme ka nri si n’eluigwe zoo dị ka mmiri.’ Jehova mekwara otú ahụ. N’ụtụtụ echi ya, mgbe ụmụ Izrel hụrụ ihe ọcha nke a daranụ, ha malitere ịjụ onwe ha, sị: ‘Gịnị bụ ihe a?’

Mozis sịrị ha: ‘Nke a bụ nri Jehova nyere unu ka unu rie.’ Ụmụ Izrel kpọrọ ya MANA. Ọ na-atọ ka iberibe achịcha e ji mmanụ aṅụ mee.

‘Onye ọ bụla ga-atụtụrụ ókè ọ ga-erichali,’ ka Mozis gwara ha. Nke a bụ ihe ha na-eme kwa ụtụtụ. Ma mgbe anyanwụ dịwara ọkụ, mana nke fọdụrụ n’ala na-agbaze.

Mozis gwara ha ọzọ, sị: ‘Ọ dịghị onye ga-edebe mana ụfọdụ ruo echi.’ Ma ụfọdụ n’ime ụmụ Izrel egeghị ntị. Ị̀ ma ihe merenụ? N’echi ya, mana nke ha debere gbara ikpuru, ọ malitekwara isi ísì!

Ma, ọ dị otu ụbọchị n’izu mgbe Jehova gwara ha ka ha na-achịkọta mana okpukpu abụọ. Ọ bụ n’ụbọchị nke isii. Jehova gwara ha ka ha na-edebe ụfọdụ ya ruo echi ya, n’ihi na ọ gaghị eme ka mana ọ bụla daa n’ụbọchị nke asaa. Mgbe ha debere mana ruo ụbọchị nke asaa, ọ dịghị agba ikpuru, ọ dịghịkwa esi ísì! Nke a bụ ọrụ ebube ọzọ!

N’afọ niile ahụ ụmụ Izrel nọrọ n’ọzara, nri Jehova nọ na-enye ha bụ mana.