Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

AKỤKỌ NKE 35

Jehova Enye Iwu Ya

Jehova Enye Iwu Ya

IHE dị ka ọnwa abụọ ha hapụsịrị Ijipt, ụmụ Izrel rutere n’Ugwu Saịnaị, nke a na-akpọkwa Horeb. Ọ bụ n’otu ebe a ka Jehova gwara Mozis okwu site n’osisi na-ere ọkụ. Ndị Izrel mara ụlọikwuu ha n’ebe a ma nọrọ n’ebe ahụ ruo nwa oge.

Mgbe ha nọ ná mgbada ugwu ahụ na-echere, Mozis rịgooro n’ugwu ahụ. N’elu ugwu ahụ, Jehova gwara Mozis na ya chọrọ ka ụmụ Izrel na-erubere Ya isi ma bụrụ ndị Ya pụrụ iche. Mgbe Mozis rịdatara, ọ gwara ha ihe Jehova kwuru. Ụmụ Izrel kwuru na ha ga-erubere Jehova isi, n’ihi na ha chọrọ ịbụ ndị ya.

Jehova mere ihe dị ịtụnanya mgbe ahụ. O mere ka elu ugwu ahụ malite ịkwụ anwụrụ ọkụ, meekwa ka a nụ ụda égbè eluigwe. Ọ gwakwara ndị Izrel okwu, sị: ‘Mụ onwe m bụ Jehova Chineke unu, onye si n’Ijipt kpọpụta unu.’ O wee nye ha iwu, sị: ‘Ọ dịghị chi ọzọ unu ga-efe ma ọ bụghị naanị m.’

Chineke nyere ụmụ Izrel iwu itoolu ndị ọzọ. Ha tụrụ egwu nke ukwuu. Ha wee sị Mozis: ‘Gwa anyị okwu n’onwe gị, n’ihi na anyị na-atụ egwu na anyị ga-anwụ, ma ọ bụrụ na Chineke agwa anyị okwu.’

N’ikpeazụ, Jehova gwara Mozis, sị: ‘Bịakwute m n’elu ugwu a. M ga-enye gị mbadamba nkume abụọ bụ́ ebe m dere iwu ahụ m na-achọ ka ndị m na-agbaso.’ Mozis rịgooro n’ugwu ahụ ọzọ. Ọ nọgidere ebe ahụ ụbọchị iri anọ, ehihie na abalị.

Chineke nwere ọtụtụ iwu inye ndị ya. Mozis dere iwu ndị a ede. Chineke nyekwara Mozis mbadamba nkume abụọ ahụ. N’elu ha, Chineke n’onwe ya dere ihe ahụ a na-akpọ Iwu Iri, bụ́ nke ọ gwara ndị Izrel okwu ya.

Iwu Iri ahụ bụ iwu dị mkpa. Otú ahụ ka ọtụtụ iwu ndị ọzọ nke Chineke nyere ụmụ Izrel dị. Otu n’ime iwu ndị a bụ: ‘Ị ga-eji obi gị dum, uche gị dum, na mkpụrụ obi gị dum na ike gị dum hụ Jehova bụ́ Chineke gị n’anya.’ Nke ọzọ bụ: ‘Ị ga-ahụ onye agbata obi gị n’anya dị ka onwe gị.’ Jizọs Kraịst bụ́ Ọkpara Chineke kwuru na ndị a bụ iwu abụọ kachasị ukwuu nke Jehova nyere ndị ya bụ́ Izrel. E mesịa, anyị ga-amụta ọtụtụ ihe banyere Ọkpara Chineke na ozizi ya.