Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

AKỤKỌ NKE 36

Nwa Ehi Ọlaedo

Nwa Ehi Ọlaedo

EWOO! Gịnị ka ndị a na-eme ugbu a? Ha na-ekpegara nwa ehi ekpere! N’ihi gịnị ka ha ji eme otú a?

Mgbe Mozis nọrọ ọdụ n’elu ugwu ahụ, ụmụ Izrel sịrị: ‘Anyị amaghị ihe mere Mozis. Ngwanụ ka anyị meere onwe anyị chi nke ga-edupụta anyị n’ala nke a.’

Erọn nwanne Mozis wee sị: ‘Ọ dị mma. Gbapụtanụ ọla ntị ọlaedo unu, wetaranụ m ha.’ Mgbe ha mere otú ahụ, Erọn gbazere ọla ndị ahụ ma jiri ha mee nwa ehi ọlaedo. Ụmụ Izrel wee sị: ‘Nke a bụ Chi anyị, onye dupụtara anyị n’Ijipt!’ Mgbe ahụ, ụmụ Izrel mere nnukwu ememe, feekwa nwa ehi ọlaedo ahụ ofufe.

Mgbe Jehova hụrụ nke a, iwe were ya nke ukwuu. O wee sị Mozis: ‘Rịda ngwa ngwa. Ụmụ Izrel emewala ihe jọgburu onwe ya. Ha echezọwo iwu m, ha na-akpọkwa isiala enye nwa ehi ọlaedo.’

Mozis rịdatara n’ugwu ahụ ngwa ngwa. Mgbe ọ bịaruru nso, nke a bụ ihe ọ hụrụ. Ụmụ Izrel nọ na-abụ abụ ma na-ete egwú gburugburu nwa ehi ọlaedo ahụ! Mozis were nnọọ iwe nke na ọ tụrụ mbadamba nkume abụọ ahụ e dere iwu ahụ n’ala, ha wee gbaa iberibe iberibe. Mgbe ahụ, o weere nwa ehi ọlaedo ahụ ma gbazee ya. O wee gwerie ya, ya aghọọ ntụ.

Ụmụ Izrel emewo ihe jọrọ nnọọ njọ. N’ihi ya, Mozis gwara ụfọdụ n’ime ndị ikom ka ha were mma agha ha. Ọ sịrị ha: ‘Gbuonụ ndị ajọ mmadụ ndị fere nwa ehi ọlaedo ahụ ofufe.’ Ndị ikom ahụ wee gbuo puku mmadụ atọ! Nke a ọ́ dịghị egosi na anyị aghaghị ilezi anya ife naanị Jehova ofufe, ọ bụghị chi ụgha ọ bụla?