Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

AKỤKỌ NKE 37

Ụlọ Ntu A Na-anọ Efe Ofufe

Ụlọ Ntu A Na-anọ Efe Ofufe

Ị̀ MA ụlọ dị ihe a? Ọ bụ ụlọ ntu pụrụ iche a na-anọ efe Jehova ofufe. A na-akpọ ya ụlọikwuu. Ụmụ Izrel wuchara ya otu afọ mgbe ha hapụsịrị Ijipt. Ị̀ ma onye kwuru ka e wuo ya?

Ọ bụ Jehova kwuru ya. Mgbe Mozis nọ n’elu Ugwu Saịnaị, Jehova gwara ya otú a ga-esi wuo ya. O kwuru ka e wuo ya otú ọ ga-adị mfe iwepụtagasị akụkụ ya dị iche iche. N’ụzọ dị otú a, a pụrụ iburu akụkụ ya niile jee ebe ọzọ ma jikọtakwa ha ọzọ n’ebe ahụ. Mgbe ụmụ Izrel na-esi n’otu ebe aga ebe ọzọ n’ọzara, ha na-eburu ụlọ ntu ahụ.

Ọ bụrụ na i lee anya n’obere ọnụ ụlọ dị n’isi isi ụlọ ntu a, ị ga-ahụ otu igbe, ma ọ bụ akpati. A na-akpọ ya igbe ọgbụgba ndụ. O nwere ndị mmụọ ozi ma ọ bụ cherub abụọ e ji ọlaedo mee n’isi ya abụọ. Chineke dere Iwu Iri ahụ ọzọ n’elu mbadamba nkume abụọ, n’ihi na Mozis tiwara ndị mbụ O dere. E debere nkume ndị a n’ime igbe ọgbụgba ndụ ahụ. Ite e tinyere mana dịkwa n’ime igbe ahụ. Ì chetara ihe mana bụ?

Erọn nwanne Mozis bụ onye Jehova họpụtara ịbụ nnukwu onye nchụàjà. Ọ na-edu ndị Izrel n’ofufe Jehova. Ụmụ ya ndị ikom bụkwa ndị nchụàjà.

Ugbu a, lee anya n’ọnụ ụlọ nke ka ukwuu nke dị n’ụlọ ntu ahụ. Ọ ka obere ọnụ ụlọ ahụ dị n’isi isi ibu okpukpu abụọ. Ị̀ na-ahụ igbe, ma ọ bụ obere akpati ahụ, nke anwụrụ ọkụ si na ya na-akwụgo elu? Nke a bụ ebe ịchụàjà nke ndị nchụàjà na-esure ihe ụtọ a na-akpọ ihe nsure ọkụ na-esi ísì ụtọ. E nwekwara ihe ndọba oriọna nke nwere oriọna asaa. Ihe nke atọ nke dị n’ime ụlọ ahụ bụ tebụl. A na-edebe ogbe achịcha iri na abụọ n’elu ya.

N’ime ogige ụlọikwuu ahụ, e nwere nnukwu ọkwá ma ọ bụ efere nke a na-agbaju mmiri. Ndị nchụàjà na-eji ya asa ihe. E nwekwara nnukwu ebe ịchụàjà. Ọ bụ n’ebe ahụ ka a na-achụrụ Jehova àjà ụmụ anụmanụ e gburu egbu, bụ́ ndị a na-esure n’ọkụ. Ụlọ ntu ahụ dị n’etiti, ụlọ ntu ndị ụmụ Izrel bi na ha adịrị gburugburu ya.