Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

AKỤKỌ NKE 40

Mozis Etie Nkume Ihe

Mozis Etie Nkume Ihe

ỌTỤTỤ afọ gafere—afọ iri, afọ iri abụọ, afọ iri atọ, afọ iri atọ na itoolu! Ụmụ Izrel ka nọ n’ọzara. N’ime afọ ahụ niile, Jehova lekọtara ha. Ọ na-enye ha mana. Ọ na-eji ogidi igwe ojii edu ha n’ehihie, na-ejikwa ogidi ọkụ edu ha n’abalị. N’ime afọ ahụ niile, uwe ha akaghị aka, ụkwụ ha azaghịkwa aza.

Nke a bụ ọnwa mbụ nke afọ iri anọ ha hapụsịrị Ijipt. Ụmụ Izrel mara ụlọikwuu ha ọzọ na Kedesh. Ọ bụ n’ebe a ka ha nọ mgbe e zipụrụ ndị nledo iri na abụọ iledo ala Kenan ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ afọ iri anọ gara aga. Miriam nwanne Mozis nwụrụ na Kedesh. Ma dị ka na mbụ, nsogbu pụtara n’ebe a.

Ụmụ Izrel ahụghị mmiri ọ bụla. Ha wee kpesara Mozis, sị: ‘Ọ gaara akara anyị mma ma a sị na anyị nwụrụ anwụ. Gịnị mere i ji si n’Ijipt kpọpụta anyị n’ebe a jọgburu onwe ya nke ihe ọ bụla na-adịghị epu na ya? Mkpụrụ ọghịgha adịghị, mkpụrụ fig adịghị, mkpụrụ vaịn adịghị, mkpụrụ pọmigranet adịghịkwa. Ọbụna mmiri ọṅụṅụ adịghị.’

Mgbe Mozis na Erọn jere n’ụlọikwuu ikpe ekpere, Jehova gwara Mozis, sị: ‘Kpọkọta ụmụ Izrel niile ọnụ. N’ihu ha niile, gwa nkume ahụ dị n’ebe ahụ okwu. Mmiri nke ga-ezuru ha ga-esi na ya gbapụtara ha niile na anụ ụlọ ha niile.’

Mozis wee kpọkọta ụmụ Izrel niile, wee sị: ‘Geenụ ntị, unu ndị na-atụkwasịghị Chineke obi! Mụ na Erọn, ànyị ga-eme ka mmiri si na nkume a gbapụtara unu?’ Mozis wee were mkpanaka tie nkume ahụ ugboro abụọ, nnukwu mmiri wee si na nkume ahụ nupụta. Ha niile na anụ ụlọ ha wee nwee mmiri zuru ezu ịṅụ.

Ma Jehova were iwe megide Mozis na Erọn. Ị̀ ma ihe kpatara ya? Ọ bụ n’ihi na Mozis na Erọn kwuru na ha ga-eme ka mmiri si na nkume ahụ gbapụta. Ma n’ezie, ọ bụ Jehova mere ya. Ebe ọ bụkwa na Mozis na Erọn ekwughị eziokwu banyere nke a, Jehova kwuru na ya ga-enye ha ahụhụ. Ọ gwara ha, sị: ‘Unu agaghị edu ndị a baa n’ala Kenan.’

Nwa obere oge, ụmụ Izrel hapụrụ Kedesh. N’oge na-adịghị anya, ha bịaruru n’Ugwu Hoa. N’ebe ahụ, n’elu ugwu ahụ, ka Erọn nọ nwụọ. Ọ gbara otu narị afọ na iri afọ abụọ na atọ mgbe ọ nwụrụ. O wutere ụmụ Izrel hie nne, ha niile wee kwaara Erọn ákwá ụbọchị iri atọ. Nwa ya bụ́ Elieza wee nọchie ya dị ka nnukwu onye nchụàjà nke mba Izrel.