Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

AKỤKỌ NKE 42

Ịnyịnya Ibu Ekwuo Okwu

Ịnyịnya Ibu Ekwuo Okwu

Ọ̀ DỊTỤWO mgbe ị nụrụ na ịnyịnya ibu kwuru okwu? Ị pụrụ ịza ‘Ee e. Anụmanụ apụghị ikwu okwu.’ Ma Bible kwuru banyere otu ịnyịnya ibu nke kwuru okwu. Ka anyị hụ otú o si mee.

Ụmụ Izrel na-ejikere ịba n’ala Kenan. Belak, bụ́ eze Moab, tụrụ egwu ụmụ Izrel. O wee zie ozi ka otu nwoke dị ike nke aha ya bụ Belam bịa kọchaa ụmụ Izrel. Belak kwere nkwa inye Belam nnukwu ego, n’ihi ya, Belam nọkwasịrị n’ịnyịnya ibu ya, wee na-eje ịhụ Belak.

Jehova achọghị ka Belam kọchaa ndị Ya. N’ihi ya, o zigara otu mmụọ ozi nke ji ogologo mma agha ka ọ gaa guzoro n’ụzọ ma kwụsị Belam. Belam apụghị ịhụ mmụọ ozi ahụ, ma ịnyịnya ibu ya hụrụ ya. Ịnyịnya ibu ya nọgidere na-achọ izere mmụọ ozi ahụ, n’ikpeazụ, ọ makpuuru ala n’ụzọ. Belam were iwe nke ukwuu wee were osisi na-eti ịnyịnya ibu ya.

Mgbe ahụ, Jehova mere ka Belam nụ ka ịnyịnya ibu ya na-agwa ya okwu. Ịnyịnya ibu ahụ jụrụ ya, sị: ‘Gịnị ka m mere gị iji na-eti m ihe?’

Belam wee sị ya: ‘I mewo ka m yie onye nzuzu. A sị na m ji mma agha, m gaara egbu gị!’

Ịnyịnya ibu ahụ wee jụọ ya, sị: ‘Èmetụwo m gị otú a mbụ?’

Belam wee zaa ya ‘Ee e.’

Jehova wee mee ka Belam hụ mmụọ ozi ahụ nke ji ogologo mma agha ka o guzo n’ụzọ. Mmụọ ozi ahụ wee sị: ‘Gịnị mere i ji tie ịnyịnya ibu gị ihe? Abịara m ịnọchiri gị ụzọ, n’ihi na ị gaghị eje ịkọcha Izrel. A sị na ịnyịnya ibu gị ezereghị m, m gaara egbu gị, agaraghị m eme ịnyịnya ịbụ gị ihe ọ bụla.’

Belam wee sị ya: ‘Emehiewo m. Amaghị m na i guzo n’ụzọ.’ Mmụọ ozi ahụ wee hapụ Belam ka ọ laa, Belam wee gawa ịhụ Belak. Ọ nwakwara ịkọcha Izrel, ma kama nke ahụ, Jehova mere ka ọ gọzie Izrel ugboro atọ.